Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 2/1 p. 3
  • Ọ̀ Ka Bara Uru Ịna-arụsi Ọrụ Ike?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Ka Bara Uru Ịna-arụsi Ọrụ Ike?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Ịrụsi Ọrụ Ike Na-atọ Gị Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Na-ahụ Ihe Ọma n’Ihi Ịrụsi Ọrụ Ike Gị
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ka Ọrụ Ị Na-arụsi Ike Na-eme Gị Obi Ụtọ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • Ndị Na-eto Eto—Olee Ihe Unu Ga-eji Ndụ Unu Eme? (Nkebi nke Mbụ)
    Ozi Alaeze Anyi—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 2/1 p. 3
Ebe nwa okorobịa iwe ji nọ ọdụ, ndị ọrụ ibe ya ana-arụ ọrụ

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ KA Ị GA-EME KA ỌRỤ GỊ NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?

Ọ̀ Ka Bara Uru Ịna-arụsi Ọrụ Ike?

E nwere otu nwoke aha ya bụ Alex. Ọ na-arụ n’ụlọ ọrụ na-akwafere ndị mmadụ ngwongwo ha ebe ọzọ. Otu ụbọchị, ka o bubachara otu nnukwu katọn n’ụgbọala ụlọ ọrụ ha, ọ gara nọrọ na-asụ ude. Ọ malitere ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee mgbe m ga-akwụsị ọrụ a na-enweghị ezigbo ego dị na ya? Olee mgbe m ga-enweta ezigbo ọrụ? Ọ gaakwaranụ akara m mma ma á sị na m na-arụ obere ọrụ na-enye m ezigbo ego.’

Otú a ọ dị Alex ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị taa. Ha anaghị achọ ịrụsi ọrụ ike. E nwere ihe Aaron, bụ́ otu nwoke na-arụzi ụgbọala, kwuru. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị chere na ha akarịala ọrụ ha na-arụ n’ihi na ọ bụ ọrụ a na-eleda anya. Ebumnobi ha bụ ka ha na-arụgodị ya ruo mgbe ha ga-enweta ọrụ ka ya mma.”

Gịnị mere ọtụtụ ndị ji eche na ha ekwesịghị ịna-arụ ọrụ siri ike? Ọ ga-abụ na ihe mere ha ji eche otú ahụ bụ n’ihi na ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-emekarị ka ndị mmadụ na-eche na ha ekwesịghị ịna-enye ndụ ha nsogbu. Otu nwoke na-arụzi ụlọ aha ya bụ Matthew sịrị na “ndị mmadụ na-ekwu na ọ na-abụ mmadụ na-arụsikwu ọrụ ike, obi ana-ajọkwu ya njọ.” Otu nwoke na-arụzikwa ụlọ aha ya bụ Shane kwukwara ihe yiri ihe a Matthew kwuru. Ọ sịrị: “Ihe ndị mmadụ chọziri ugbu a bụ ha na-arụ obere ọrụ, a na-akwụ ha nnukwu ụgwọ.”

Ma, ọtụtụ ndị na-enwe obi ụtọ bụ ndị na-arụsi ọrụ ike. O nwere ihe otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na ise aha ya bụ Daniel kwuru. Nwa okorobịa a na-arụ ụlọ. O kwuru, sị: “Mmadụ ịrụsi ọrụ ike na-atọ ụtọ, karịchaa ma ọ bụrụ na ihe onye ahụ na-arụ bụ ihe ga-aba ezigbo uru.” Nwa okorobịa ọzọ dị afọ iri abụọ na atọ aha ya bụ Andre, kwukwara ihe yiri ihe a Daniel kwuru. Ọ sịrị: “Ekwetara m na ịrụsi ọrụ ike na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ma, naanị ihe ịrụ obere ọrụ ga-akpatara mmadụ bụ ike ọgwụgwụ na obi ọjọọ.”

Gịnị nyeere Daniel, Andre na ndị ọzọ aka ile ịrụsi ọrụ ike anya otú kwesịrị ekwesị? Ọ bụ ime ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị na-adị uchu n’ọrụ anyị. Baịbụl gwakwara anyị ihe anyị ga na-eme ka ọrụ anyị nwee ike na-atọ anyị ụtọ.

Olee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ịna-enwe obi ụtọ n’ọrụ gị? Biko, gụọ isiokwu na-eso nke a ka ị hụ ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya