AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EKLIZIASTIS 1-6
Ka Ọrụ Ị Na-arụsi Ike Na-eme Gị Obi Ụtọ
Jehova chọrọ ka ọrụ anyị na-atọ anyị ụtọ. Ọ na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi na-eme ka ọ na-atọ anyị ụtọ. Ọrụ anyị ga na-atọ anyị ụtọ ma anyị na-ele ya anya otú kwesịrị ekwesị.
Lee ihe ndị ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka ọrụ gị na-atọ gị ụtọ:
Na-etinyere ya obiọma
Na-eche banyere uru ọrụ gị na-abara ndị ọzọ
Ị gaa ọrụ, mee ike gị niile. Mana, ị lọta, tinyezie uche gị n’ihe gbasara ezinụlọ gị na ofufe ị na-efe Chineke