Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 10/1 p. 3
  • Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Ekpe Ekpere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Ekpe Ekpere?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ekpere Ga-enyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Olee Otú Ị Ga-esi Ekpe Ekpere Chineke Anụ Ya?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 10/1 p. 3

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ọ̀ BADỊRỊ URU IKPE EKPERE?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Ekpe Ekpere?

Otu nwoke onye Kenya aha ya bụ Samuel,a kwuru, sị: “E ji ịgba chaa chaa mara m. Ekpeela m ekpere ọtụtụ ugboro ka m rite ezigbo ego, ma, o nwebeghị mgbe a zara ekpere mụ a.”

Otu nwata nwaanyị onye Filipinz aha ya bụ Teresa, kwuru, sị: “Ihe anyị na-eme n’ụlọ akwụkwọ bụ ịgụgharị ekpere anyị bu n’isi.”

Otu nwaanyị onye Gana aha ya bụ Magdalene, kwuru, sị: “M na-ekpe ekpere ma m nwee nsogbu. M na-arịọ Chineke ka ọ gbaghara m mmehie m nakwa ka o nyere m aka ka m bụrụ ezigbo Onye Kraịst.”

1. Ebe otu nwoke na-ekpe ekpere ka o rite ego na chaa chaa ọ na-agba; 2. Ebe nwatakịrị nwaanyị na-ekpe ekpere n’ụlọ akwụkwọ; 3. Ebe otu nwaanyị na-ekpe ekpere

Ihe a ndị a kwuru gosiri na e nwere ọtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji ekpe ekpere nakwa na ụfọdụ na-arịọ ihe dị mma, ndị ọzọ ana-arịọ ihe na-enweghị isi. Ụfọdụ na-esi n’ala ala obi ha ekpe ekpere, ma ndị ọzọ anaghị eji obi ha niile ekpe ekpere. Ọtụtụ nde mmadụ taa na-ekpe ekpere. E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ha na-arịọ maka ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ ka ha mee nke ọma n’ule, ka òtù egwuregwu ha nwere mmasị na ya merie, nakwa ka Chineke nyere ha aka ilekọta ezinụlọ ha nke ọma. Nchọpụta e mere gosiri na ndị na-anaghị aga chọọchị na-ekpedị ekpere mgbe niile.

Ị̀ na-ekpe ekpere? Ọ bụrụ na ị na-ekpe ekpere, gịnị ka ị na-arịọ maka ya? Ma ị̀ na-ekpe ma ị́ naghị ekpe, i nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ikpe ekpere ọ̀ badịrị uru? È nwere onye na-ege ntị n’ekpere anyị?’ Otu nwoke na-ede akwụkwọ chere na naanị ihe ekpere na-emere onye nwere nsogbu bụ ime ka nsogbu ya pụtụ ya n’obi. Ụfọdụ ndị na-ahụ maka ọgwụ na ahụ́ ike ekwuokwala ụdị ihe ahụ. Ha sịrị na ekpere bụ “ọgwụ n’ụdị nke ya.” Ọ̀ pụtara na ndị mmadụ na-ekpe ekpere naanị iji mezuo iwu ma ọ bụ iji nwetatụ onwe ha?

Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ekpere abụghị naanị ihe mmadụ na-eme iji nwetatụ onwe ya. O kwuru na e nwere onye na-ege ntị n’ekpere anyị ma ọ bụrụ na anyị na-arịọ ihe kwesịrị ekwesị nakwa otú kwesịrị ekwesị. Ọ̀ bụ eziokwu? Ka anyị lee ihe ụfọdụ mere mmadụ kwesịrị iji kwere na e nwere onye na-ege ntị n’ekpere anyị.

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya