ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | IHE Ị GA-EME MA MMADỤ NWỤNAHỤ GỊ
Mmadụ Iru Uju Ọ̀ Dị Njọ?
Ò nwetụla mgbe ị rịara obere ọrịa? Ọ bụrụ na o nwetụla, ikekwe, ị gbakere ngwa ngwa nke na i chefuodịla nsogbu o nyere gị. Ma, ọ bụghị otú ọ na-adị ma mmadụ ruwe uju. Otu dọkịta aha ya bụ Alan Wolfelt kwuru ihe ga-enyere mmadụ aka idi ọnwụ di ma ọ bụ nwunye ya. Ọ sịrị: “Mmadụ anaghị akwụsị iru uju akwụsị.” Ma, o kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na ndị ọzọ ana-agbalị akasi onye ahụ obi, ọ ga-eji nwayọọ nwayọọ nwetawa onwe ya.”
Ka anyị legodị ihe Ebreham mere mgbe nwunye ya nwụrụ. Baịbụl kwuru na o “bidoro ịkwara Sera ákwá arịrị na ibere ya ákwá.” (Jenesis 23:2; Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, nke afọ 2013, Bekee) Mgbe Baịbụl kwuru na Ebreham “bidoro” ịkwara nwunye ya ákwá arịrị, ọ na-egosi na o were ya oge tupu ya enwee ike idi ọnwụ nwunye ya.a Jekọb rutekwara uju aka mgbe ụmụ ya ghọgburu ya, mee ka o were ya na anụ ọhịa adọgbuola Josef nwa ya. O ruuru ya uju ruo “ọtụtụ ụbọchị.” Ndị ezinụlọ ya enwelighịkwa ike ịkasi ya obi. Mgbe ọtụtụ afọ gachakwara, ọnwụ Josef ka nọ na-ewute ya.—Jenesis 37:34, 35; 42:36; 45:28.
Ebreham ruru uju mgbe Sera nwunye ọma ya nwụrụ
Ọ bụkwa otú ọ na-adị ọtụtụ ndị taa ma onye ha na ha dị n’ezigbo mma nwụọ. Ka anyị leba anya n’akụkọ mmadụ abụọ.
Otu nwaanyị aha ya bụ Gail, onye dị́ afọ iri isii, kwuru, sị: “Robert di m nwụrụ n’otu ihe mberede mere n’abalị itoolu n’ọnwa Julaị afọ 2008. Mgbe anyị richara nri ụtụtụ n’ụbọchị ahụ, anyị mere ihe anyị na-emekarị tupu ya agawa ọrụ. Anyị susuru ibe anyị ọnụ, makụọ ibe anyị, sịkwa ibe anyị, ‘ahụrụ m gị n’anya.’ Afọ isii ọ nwụchara, ọnwụ ya ka na-agbawa m obi. Echeghị m na ọ ga-apụli m apụ n’obi.”
Otu nwoke aha ya bụ Etienne, onye dị́ afọ iri asatọ na anọ, kwuru, sị: “N’agbanyeghị na ọ karịala afọ iri na asatọ nwunye ọma m nwụrụ, agụụ ịhụ ya na-agụ m, m ka na-erukwara ya uju. M hụ ihe mara mma, mụ echeta ya, na-echekwa otú obi gaara adị ya ma á sị na ọ hụrụ ihe ahụ m hụrụ.”
N’eziokwu, o nweghị onye ọ na-adịrị mfe idi ọnwụ mmadụ. Otú ndị mmadụ si eru uju dị iche iche, ọ dịghịkwa mma ịta mmadụ ụta maka otú o si eru uju. Anyị ekwesịghịkwa ịtawa onwe anyị ụta ma o siwere anyị ike idi ọnwụ onye nwụnahụrụ anyị. Ma, olee ihe ga-enyere anyị aka idi ya?
a Aịzik nwa Ebreham bụkwa onye ọzọ ruru uju ruo ogologo oge. N’isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha,” nke dị́ n’Ụlọ Nche a, e kwuru na mgbe ihe dị ka afọ atọ Sera nne ya nwụchara, ọ ka na-eru uju ọnwụ ya.—Jenesis 24:67.