A ga-ebibi ihe niile e ji alụ agha
Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
Ò nwere mgbe udo ga-adị ebe niile n’ụwa?
Gịnị ka ị ga-aza?
Ee
Mba
O nwere ike
Ihe Baịbụl kwuru
Mgbe Jizọs Kraịst ga-achịwa ụwa, ‘udo ga-adị ebe niile ruo mgbe ọnwa na-agakwaghị adị,’ ya bụ, ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 72:7.
Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?
A ga-ebibi ndị ajọ omume n’ụwa, ndị ezi omume ana-enwezi “obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:10, 11.
Chineke ga-eme ka a kwụsị ịlụ agha n’ụwa.—Abụ Ọma 46:8, 9.
Obi ò nwere ike iru mmadụ ala taa?
Ụfọdụ ndị na-ekwu . . . na obi enweghị ike iru mmadụ ala ebe ọ bụ na ahụhụ na mmegbu ka juru n’ụwa. Gịnị ka i chere?
Ihe Baịbụl kwuru
Ndị ha na Chineke dị ná mma ga-enweli “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile” ugbu a.—Ndị Filipaị 4:6, 7.
Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?
Chineke kwuru na ya ga-akwụsị ahụhụ na mmegbu juru n’ụwa ma ‘mee ka ihe niile dị ọhụrụ.’—Mkpughe 21:4, 5.
Obi nwere ike iru anyị ala ma anyị mara “mkpa ime mmụọ” anyị, ya bụ, ma anyị jiri ife Chineke kpọrọ ihe.—Matiu 5:3.