Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w17 Jun p. 3
  • Ì Chetara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Chetara?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì Chetara?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ì Chetara?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ì Chetara?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ì Chetara?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
w17 Jun p. 3

Ì Chetara?

Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Olee ihe ndị nlekọta sekit na ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ime ma nzukọ Chineke kwuo ihe a ga-eme?

Ha kwesịrị ime ihe a gwara ha ozugbo. Ha kwesịrị ịjụ onwe ha, sị: ‘M̀ na-agba ụmụnna m ume ka ha na-erubere Jehova isi? Ndị na-elekọta ọgbakọ kwuo ihe a ga-eme, m̀ na-eme ya ozugbo?’—w16.11, peeji nke 11.

Olee mgbe Babịlọn ukwu ahụ dọọrọ ezigbo Ndị Kraịst n’agha?

Ọ bụ obere oge ndịozi Jizọs nwụchara. N’oge ahụ, a malitere inwe òtù ndị ụkọchukwu. Chọọchị Katọlik na ọchịchị Rom kwadoro Ndị Kraịst si n’ezi ofufe pụọ, mezie ka a ghara ịna-ege ihe ezigbo Ndị Kraịst na-ekwu. Ma, tupu afọ 1914, ndị e tere mmanụ malitere ịhapụ Babịlọn ukwu ahụ.—w16.11, peeji nke 23 ruo 25.

Gịnị mere Baịbụl Lefèvre d’Étaples sụgharịrị ji dị mkpa?

N’ihe dị ka n’afọ 1522, Lefèvre sụgharịrị Baịbụl n’asụsụ French ka ndị nkịtị nwee ike ịna-agụ ya. Otú o si kọwaa ebe dị iche iche na Baịbụl baara Matin Luther, William Tyndale, na John Calvin uru.—wp16.6, peeji 10 ruo 12.

Olee ihe dị iche ‘n’ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́’ na “ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ”? (Rom 8:6)

Onye ‘tụkwasịrị uche n’anụ ahụ́’ bụ onye uche ya niile dị n’ihe na-agụ ya agụụ na ihe ọ chọrọ. Ọ bụ ihe ọ na-ekwukarị gbasara ya na ihe riri ya isi. Onye ‘tụkwasịrị uche na mmụọ nsọ’ bụ onye na-eche echiche otú Chineke si eche; ọ bụ mmụọ nsọ na-eduzi ihe niile ọ na-eme. “Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́” pụtara ọnwụ. Ma, “ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ” pụtara ndụ na udo.—w16.12, peeji nke 15 ruo 17.

Olee ihe ụfọdụ ị ga-eme ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị?

Buru ụzọ na-eme ihe ndị ka mkpa, na-atụ anya ihe ndị ị ga-emeli, na-ewepụta oge naanị gị ga-anọ kwa ụbọchị, na-echebara ihe Jehova kere echiche, na-achịtụ ọchị, na-emega ahụ́ ma na-ehi ụra nke ọma.—w16.12, peeji nke 22 ruo 23.

‘E wegara Inọk ebe ọzọ ka ọ ghara ịhụ ọnwụ.’ (Hib. 11:5) Olee otú e si mee ya?

Ọ dị ka Chineke ò mere ka o jiri nwayọọ nwụọ ka ọ ghara ịma na ọ na-anwụ.—wp17.1, peeji nke 12 ruo 13.

Gịnị mere anyị ji kwesị ịdị umeala n’obi?

Onye dị umeala n’obi ma na o nwere ihe ndị ọ na-agaghị emeli ma ọ bụ ihe ndị a na-enyeghị ya ikike ime. Anyị kwesịrị ịmata otú omume anyị nwere ike isi kpaa ndị ọzọ aka. Anyị ekwesịghịkwa iwere onwe anyị ka ànyị adịka mkpa.—w17.01, peeji nke 18.

Olee ihe gosiri na Chineke duziri òtù na-achị isi n’oge ndịozi Jizọs otú ahụ o si eduzi Òtù Na-achị Isi n’oge anyị a?

Mmụọ nsọ nyeere ha aka ịghọta eziokwu Baịbụl. Ndị mmụọ ozi nyeere ha aka ịhazi otú a ga-esi na-ekwusa ozi ọma. Okwu Chineke duziri ha mgbe ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. Òtù Na-achị Isi na-emekwa otú ahụ n’oge anyị a.—w17.02, peeji nke 26 ruo 28.

Olee ihe ndị mere anyị ji jiri ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ezigbo ihe?

Ihe anọ mere anyị ji jiri ya kpọrọ ihe bụ: Onye nyere ya, ihe mere o ji nye ya, ihe o furu ya, na uru ọ bara. Anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’otú ihe anọ a si gbasa ihe mgbapụta ahụ.—wp17.2, peeji nke 4 ruo 6.

Onye Kraịst kpebichaa ihe ọ chọrọ ime, ò nwere ike ịgbanwe ya?

Anyị kwesịrị ime ihe anyị kwuru. Ma, e nwere mgbe ụfọdụ anyị kwesịrị ịgbanwe ihe anyị kpebiri ime. Mgbe ndị Ninive chegharịrị, Chineke gbanwere ihe o kpebiri ime ha. Mgbe ụfọdụ, ihe nwere ike gbanwee, ma ọ bụkwanụ anyị achọpụta ihe ọhụrụ nwere ike ime ka anyị gbanwee ihe anyị kpebiri ime.—w17.03, peeji nke 16 ruo 17.

Gịnị mere ịgba asịrị ji jọgbuo onwe ya?

O nwere ike ime ka nsogbu kakwuo njọ. Ma ihe anyị mere ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ, iji ihe ahụ na-agba asịrị agaghị eme ka ihe ka mma.—w17.04, peeji nke 21.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya