Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp18 nke 1 p. 12-13
  • 3 Baịbụl Ga-enyere Gị Aka Idi Nsogbu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 3 Baịbụl Ga-enyere Gị Aka Idi Nsogbu
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ỌRỊA NA-ANAGHỊ ALA ALA
  • MMADỤ NWỤNAHỤ GỊ
  • Site n’Ịda Mbà n’Obi Gaa n’Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Uru Ekpere Nwere Ike Ịbara Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • Uru Ekpere Ga-abara Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Otú Ụfọdụ Si Nweta Azịza
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
wp18 nke 1 p. 12-13
Ebe otu nwaanyị nọ na-ebe ákwá n’ebe a na-eli ozu. Ebe a na-ezi otu nwaanyị nọ n’ígwè ndị ngwọrọ ozi ọma

3 Baịbụl Ga-enyere Gị Aka Idi Nsogbu

E nwere nsogbu ụfọdụ anyị na-agaghị ezereli ugbu a ma ọ bụ kwụsị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ nwụnahụrụ gị ma ọ bụkwanụ na o nwere ọrịa na-anaghị ala ala gị na ya na-alụ, o nwere ike ịbụ na e nweghị ihe ọzọ ị ga-emeli ma ọ bụghị idi ya. Ma, Baịbụl ò nwere ike inyere mmadụ aka n’ụdị ọnọdụ a?

ỌRỊA NA-ANAGHỊ ALA ALA

E nwere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Rose. O kwuru, sị: “E nwere otu ọrịa m na-arịa si n’agbụrụ anyị. Ọrịa a na-eme ka ahụ́ na-egbu m ezigbo mgbu mgbe ọ bụla. Ihe a emeela ka ndụ na-agwụ m ike.” Otu n’ime ihe kacha ewute ya bụ na ọ na-eme ka ọ na-esiri ya ike ịmụ Baịbụl na ime ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Chineke. Ma, ihe Jizọs kwuru na Matiu 19:26 nyeere ya ezigbo aka. Ebe ahụ sịrị: “N’ebe Chineke nọ, ihe niile kwere omume.” Rose chọpụtara na e nwere ụzọ ndị ọzọ o nwere ike isi na-amụ ihe. Ebe ọ bụ na ahụ́ na-egbu ya mgbu mere ka ịgụ ihe na-esiri ya ike mgbe ụfọdụ, ọ malitere na-egere Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl e tinyere na teepụ.a Ọ sịrị: “Amaghị m otú m gaara esi na-amụ ihe ndị ga-eme ka mụ na Jehova na-adị ná mma, ma ọ bụrụ na e nweghị ihe ndị a.”

Obi jọwa Rose njọ n’ihi ihe ndị ọ na-anaghị emelizi, ihe e dere ná 2 Ndị Kọrịnt 8:12 na-akasi ya obi. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na unu bu ụzọ dịrị njikere, ọ bụ ihe a na-anabata karịsịa dị ka ihe mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe mmadụ na-enweghị si dị.” Ihe amaokwu Baịbụl a kwuru na-echetara Rose na ihe ọ na-eme na-atọ Chineke ụtọ n’ihi na ọ na-eme ike ya niile.

MMADỤ NWỤNAHỤ GỊ

Delphine e kwuru gbasara ya ná mbụ kwuru, sị: “Mgbe nwa m nwaanyị dị afọ iri na asatọ nwụrụ, o wutere m nke ukwuu nke na echere m na agaghị m edili ya. Ihe niile gbanwere.” Ihe e kwuru n’Abụ Ọma 94:19 kasiri ya obi. N’ebe ahụ, otu onye so dee Abụ Ọma gwara Chineke, sị: “Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m, nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.” Delphine kwuru, sị: “M rịọrọ Jehova ka o nyere m aka ịmata ihe ndị m ga na-eme ga-enye aka mee ka ahụ́ ruo m ala.”

Delphine wepụtara onwe ya na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. O mechara jiri onwe ya tụnyere kreyọn ụmụaka ji ese ihe. Ọ bụrụgodị na e nwee ndị nke gbajiri agbaji, ha ka na-eji ya eteji ihe ha sere. N’agbanyeghị na o chere na ndụ ọ dị enweghịzi isi, ọ chọpụtara na ya ka nwere ike ịna-enyere ndị ọzọ aka. O kwuru, sị: “M chọpụtara na iji ihe Baịbụl kwuru na-enyere ndị m na-amụrụ Baịbụl aka bụ otú Jehova si enyere m aka idi nsogbu m ma na-akasi m obi.” Ọ bịara depụta ụfọdụ ndị a kọrọ gbasara ha na Baịbụl mmadụ nwụnahụrụ. Ọ chọpụtara “na ha niile ejighị ekpere egwu egwu.” Ọ chọpụtakwara na “ịgụ Baịbụl ga-enyeliri mmadụ aka idi nsogbu.”

Ịmụ Baịbụl enyekwarala Delphine aka ịna-eche gbasara ihe ọma ndị ga-eme n’ọdịnihu, ọ bụghị ihe ndị merela eme. Ihe e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 24:15 na-akasi ya obi. Ebe ahụ sịrị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” Obi ò siri Delphine ike na Jehova ga-akpọlite nwa ya nwaanyị n’ọnwụ? Delphine zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “M na-ahụ nwa m nwaanyị mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ. Ahazichaala m ihe m ga-eme ụbọchị mụ na ya ga-anọrị. M na-ahụ nnọọ ka mụ na ya nọ otú ahụ m si hụ ya ụbọchị ahụ m mụrụ ya.”

a E nwere ọtụtụ n’ime ihe a na-egere egere e tinyere na teepụ n’adres Ịntanet bụ́ jw.org.

Baịbụl ga-akasili gị obi ma mgbe nsogbu karịrị gị bịaara gị

ỤFỌDỤ ỤZỌ CHINEKE NWERE IKE ISI NYERE ANYỊ AKA

Ihe Baịbụl kwuru gbasara otú Chineke nwere ike isi nyere anyị aka doro anya. Ọ sịrị: “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso, bụ́ ndị niile na-akpọku ya n’eziokwu. Ọ ga-emere ndị na-atụ egwu ya ihe na-agụ ha, ọ ga-anụkwa mkpu enyemaka ha na-eti, ọ ga-azọpụtakwa ha.” (Abụ Ọma 145:18, 19) Ihe amaokwu a kwuru ọ́ naghị eme gị obi ụtọ? Ma, oleekwanụ otú Chineke si aza ekpere ndị ji obi ha na-arịọ ya ka o nyere ha aka?

Ọ NA-EME KA ANYỊ NWEE UME:

Nsogbu nwere ike ime ka ike gwụ anyị, ka anyị ghara ịna-enwe obi ụtọ, nakwa ka anyị ghara ịna-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke. (Ilu 24:10) Ma, Jehova “na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike; ọ na-emekwa ka onye na-enweghị ike nwee ume nke ukwuu.” (Aịzaya 40:29) Pọl onyeozi diri ọtụtụ nsogbu bịaara ya. O kwuru, sị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Mmụọ nsọ nyeere Pọl aka idi nsogbu ndị ahụ bịaara ya. I nwekwara ike ịrịọ Chineke ka o nye gị mmụọ nsọ ya.—Luk 11:13.

Ọ NA-EME KA ANYỊ NWEE AMAMIHE:

Ọ bụrụkwanụ na ị chọrọ ịghọta Baịbụl na ịmara otú i ga-esi mee ihe o kwuru? Jems onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke, n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe, n’akọchaghịkwa ha; ọ ga-enye onye ahụ amamihe.” (Jems 1:5) Ị rịọchaa Chineke ka o nye gị amamihe, i kwesịrị ịna-eme ihe ndị gosiri na ị chọrọ inweta amamihe. I kwesịrị ịna-amụ Baịbụl ma na-eme ihe ị mụtara. (Jems 1:23-25) Ị na-eme otú ahụ, ị ga-ahụ na ihe Baịbụl kwuru bara ezigbo uru.

Ọ NA-EME KA ANYỊ NWEE UDO:

Ọ bụrụgodị na e nwere ihe na-echu gị ụra, Jehova ga-emeli ka obi ruo gị ala. Okwu ya bụ́ Baịbụl sịrị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Rịọ Jehova ka o mee ka obi ruo gị ala.

Ọ bụrụkwanụ na nsogbu gị akwụsịghị ozugbo? Echela na Jehova ahapụla gị. Ọ bụrụgodị na nsogbu gị ekweghị ala ala, Chineke ga-enye gị ike ị ga-eji die ya. (1 Ndị Kọrịnt 10:13) Chineke kwere nkwa na oge na-abịa mgbe ọ ga-eme ka nsogbu anyị niile kwụsị kpamkpam.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya