Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp18 nke 3 p. 3
  • “Olee Ebe Chineke Nọ Mgbe Ihe A Na-eme?”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Olee Ebe Chineke Nọ Mgbe Ihe A Na-eme?”
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ozi M Jeere Jehova Tọgburu M Atọgbu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Obi Jehova Na-aṅụrị Ọṅụ Ma I Guzosie Ike n’Ezi Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • È Nwere Onye Na-eche Banyere M?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Okwu Mmalite
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
wp18 nke 3 p. 3
Ebe ndị na-eru uju ji kandụl n’aka

“Olee Ebe Chineke Nọ Mgbe Ihe A Na-eme?”

“ỌTỤTỤ MGBE M NA-AJỤ, SỊ: OLEE EBE CHINEKE NỌ MGBE IHE A NA-EME?”—Poopu Benedict nke Iri na Isii jụrụ ihe a mgbe ọ gara nleta n’ogige ịta ahụhụ dịbu n’Aụswich dị na Poland.

Ọ BỤRỤ NA ỌDACHI EMEE, Ị̀ NA-AJỤ, SỊ: ‘OLEE EBE CHINEKE NỌ MGBE IHE A NA-EME?’ MA Ọ BỤKWANỤ È NWEELA MGBE EZIGBO NSOGBU BỊAARA GỊ, GỊ AJỤỌ MA IHE BANYERE GỊ Ọ̀ NA-EMETỤKWA CHINEKE N’OBI?

Ọ ga-abụ na ọ dị gị otú ọ dị otu nwaanyị bi n’Amerịka aha ya bụ Sheila. A zụrụ ya n’ezinụlọ na-ejighị ihe gbasara okpukpe egwu egwu. Ọ sịrị: “Kemgbe m bụ nwata, ihe gbasara Chineke na-amasị m n’ihi na ọ bụ ya kere anyị. Ma, o nwebeghị mgbe ọ dị m ka mụ na Chineke ọ̀ dị ná mma. Ama m na ọ na-ahụ m, ma, ọ nọ ebe dị anya. O nweghị mgbe m chere na ọ kpọrọ m asị, o nweghịkwanụ mgbe m kweere na ọ hụrụ m n’anya.” Gịnị mere na Sheila ekweghị na Chineke hụrụ ya n’anya? O kwuru, sị: “Nsogbu zooro ndị ezinụlọ anyị ka mmiri, ya adịzie ka o nwetụdịghị otú Chineke si enyere anyị aka.”

Obi nwere ike isi gị ike otú ahụ o siri Sheila na Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile dị adị. Ma, i nwere ike ịna-eche ma ihe banyere gị ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi n’eziokwu. Job bụ onye ezi omume, obi sikwara ya ike na Onye kere anyị bụ onye dị ike, nweekwa amamihe. Ma, o nwekwara mgbe o chere ụdị ihe ahụ. (Job 2:3; 9:4) Mgbe nsogbu zuru Job ahụ́, ọ na-enweghịkwa olileanya na ihe ga-adị mma, ọ jụrụ Chineke, sị: “Gịnị mere i ji ewepụ ihu gị ma na-ewere m dị ka onye iro gị?”—Job 13:24.

Gịnị ka Baịbụl na-akụzi? È kwesịrị ịta Chineke ụta ma e nwee ọdachi? Ò nwere ihe gosiri na ihe banyere ndị mmadụ na onye ọ bụla n’ime anyị na-emetụ Chineke n’obi? Ò nwere otú onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike isi mara ma Chineke ọ̀ ma na anyị nọ, ọ̀ na-aghọta anyị, ọ̀ na-emetere anyị ebere ma ọ bụ na-enyere anyị aka ná nsogbu anyị?

N’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’otú ihe ndị Chineke kere eke si egosi na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi. (Ndị Rom 1:20) Anyị ga-elebakwa anya n’ihe Baịbụl kwuru gbasara otú Chineke si hụ anyị n’anya. Ka i si n’ihe ndị o kere na n’Okwu ya ‘na-amarakwu ya,’ obi ga-esikwu gị ike na ‘ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’—1 Jọn 2:3; 1 Pita 5:7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya