AKỤKỌ NDỤ
Ozi M Jeere Jehova Tọgburu M Atọgbu
N’afọ 1951, oge m ka rutere n’obodo a na-akpọ Ruwin, bụ́ obere obodo dị na Kwebek dị na Kanada, m kụrụ aka n’ọnụ ụzọ e dere n’adres e nyere m. Nwanna Marcel Filteaua pụtara. Ọ bụ onye ozi ala ọzọ garala Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ọ dị afọ iri abụọ na atọ, tookwa ogologo. Mụnwa dị afọ iri na isii. Etorughị m ka ya. M gosiri ya akwụkwọ ozi e ji họpụta m ịbụ ọsụ ụzọ. Ọ gụrụ ya, lee m anya, jụọ m, sị: “Mama gị ọ̀ makwa na ị nọ ebe a?”
OTÚ IHE DỊ N’EZINỤLỌ ANYỊ
A mụrụ m n’afọ 1934 na Timins bụ́ obodo a na-egwupụta ọlaedo dị n’Ọnterio dị na Kanada. Nne na nna m bụ ndị Swizaland. N’ihe dị ka n’afọ 1939, mama m bidoro ịgụ Ụlọ Nche nakwa ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ọ na-akpọ mụ na ụmụnne m isii aga. Ọ dịghị anya, ya aghọọ Onyeàmà Jehova.
Obi adịghị papa m mma na mama m ghọrọ Onyeàmà Jehova. Ma, mama m ji eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe, kpebisiekwa ike na ọ gaghị ahapụ ya. O medịrị otú ahụ n’ihe dị ka n’afọ 1942, n’oge a machiri Ndịàmà Jehova iwu na Kanada. Ọ na-akwanyere papa m ezigbo ùgwù, na-ejikwa obiọma emeso ya ihe n’agbanyeghị na papa m na-agwa ya okwu ọjọọ. Àgwà ọma mama anyị nyeere mụ na ụmụnne m ndị ọzọ aka ikpebi ife Jehova. Obi dị anyị ụtọ na papa anyị mechara gbanwewe, na-ejikwu obiọma emeso anyị ihe.
ỊMALITE OZI OGE NIILE
N’ọnwa Ọgọst afọ 1950, m gara Mgbakọ Ịba Ụba Ọchịchị Chineke na Niu Yọk Siti. Mgbe mụ na ụmụnna ndị si ebe dị iche iche hụrụ nakwa mgbe m gechara ajụjụ ọnụ a gbara ndị gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied, o mere ka m chọọ ijekwuru Jehova ozi. M kpebisiri ike karịa otú m mere na mbụ ịbanye n’ozi oge niile. Ozugbo m si mgbakọ ahụ lọta, m tinyere akwụkwọ ịghọ ọsụ ụzọ oge niile. Mana, alaka ụlọ ọrụ dị na Kanada detaara m akwụkwọ ozi, gwa m ka m buru ụzọ mee baptizim. M mere baptizim n’abalị mbụ n’ọnwa Ọktoba afọ 1950. Mgbe otu ọnwa gachara, m ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile. Ebe mbụ e zigara m bụ na Kapuskasịn. Obodo a dị ezigbo anya n’ebe m bi n’oge ahụ.
Mgbe m na-eje ozi na Kwebek
N’afọ 1951, alaka ụlọ ọrụ gwara ụmụnna ndị nwere ike ịsụ French ka ha lee ma hà ga-akwafe n’ebe a na-asụ French na Kwebek. A chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma ebe ahụ. M na-asụ ma French ma Bekee. N’ihi ya, m kwetara ịkwaga ebe ahụ, e zigazie m na Ruwin. E nweghị onye ọ bụla m ma ebe ahụ. Naanị ihe m ji bụ adres dị ka m kọburu. Mana, ihe niile gara nke ọma ebe ahụ. Mụ na Nwanna Marcel ghọrọ ezigbo ndị enyi. Obi tọkwara m ụtọ ije ozi na Kwebek ruo afọ anọ, mechazie ghọọ ọsụ ụzọ pụrụ iche.
ỊGA ỤLỌ AKWỤKWỌ GILIED NA IHE NA-EMEGHỊ MGBE M TỤRỤ ANYA YA
Na Kwebek, obi tọrọ m ụtọ mgbe m natara akwụkwọ ozi ịga klas nke iri abụọ na isii nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied na Saụt Lansịn dị na Niu Yọk. Anyị gụchara akwụkwọ n’abalị iri na abụọ n’ọnwa Febụwarị afọ 1956. E zigara m n’ebe a na-akpọ Ganab ugbu a, n’Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Mana tupu mụ agaa, m laghachiri Kanada. M chere na m ga-anọ izu ole na ole tupu akwụkwọ m ji agafe ebe ahụ apụta.
O mechara bụrụ na m cheere ruo ọnwa asaa na Toronto tupu akwụkwọ ahụ apụta. N’oge ahụ, Nwanna Cripps na ndị ezinụlọ ya nyere m ụlọ n’ụlọ ha. M mataziri nwa ha nwaanyị aha ya bụ Sheila. Mụ na ya malitere ịhụ ibe anyị n’anya. Mgbe ọ fọrọ obere ka m gwa ya na m chọrọ ka mụ na ya lụọ, akwụkwọ m ji agafe Gana pụtara. Mụ na Sheila kpere ekpere gbasara ya ma kpebie na m ga-agawa ebe e zigara m, mana na anyị ga na-ezitere ibe anyị akwụkwọ ozi ka anyị mara ma ànyị ga-alụ n’ọdịnihu. Ihe a abụghị obere mkpebi, ma o mechara bụrụ mkpebi ziri ezi.
Mgbe m gbachara ụgbọ okporo ígwè, ụgbọ mmiri, na ụgbọelu otu ọnwa, m rutere Akra dị na Gana. N’ebe ahụ, e nyere m ọrụ ịbụ onye nlekọta distrikti. Ihe dị n’ọrụ ahụ bụ na m ga-agazu obodo ahụ niile, ma Kot Devụa ma Togo bụ́ obodo ndị dị ya nso. Ọtụtụ mgbe, naanị m na-eso buru ụgbọala alaka ụlọ ọrụ na-aga ebe ndị ahụ. Ịna-aga eleta ụmụnna m na-atọgbu m atọgbu.
Ná ngwụcha izu, m na-aga mgbakọ sekit. Anyị enweghị Ụlọ Mgbakọ n’oge ahụ. N’ihi ya, ụmụnna na-egwunye osisi achara, were igu nkwụ tụchie elu ya maka anwụ, nọrọ na ya mee mgbakọ. Ebe ọ bụ na friji adịghị na kafiteria n’oge ahụ, a na-akpụta anụmanụ ná ndụ ma liwe ha ebe ahụ, gbuo nke ọ bụla n’oge ọ dị mkpa ka e jiri ya nye ndị bịara mgbakọ nri.
E nwere oge ihe ndị na-atọ ọchị mere ná mgbakọ ndị ahụ. E nwere otu oge Nwanna Herb Jennings,c onye bụ́kwa onye ozi ala ọzọ, na-ekwu okwu ná mgbakọ, ehi esi n’ebe e liwere ya gbapụ, si n’etiti ebe onye na-ekwu okwu nọ na ebe ndị bịara mgbakọ nọ na-agbafe. Nwanna Herb kwụsịrị ikwu okwu, ehi ahụ akwụrụkwa n’amaghị ihe ọ ga-eme eme. Ma, ụmụnna anọ gbasiri ike jisiri ike jide ehi ahụ ma kpụga ya n’ebe ahụ ọ nọbụ, ụmụnna ana-akụrụ ha aka.
N’izu a ga-enwe mgbakọ, m na-egosi ndị bi n’obodo ndị dị nso n’ebe a na-enwe mgbakọ vidio aha ya bụ The New World Society in Action. Ka ha nwee ike ịhụ ya nke ọma, m na-eme ka ọ na-egosi n’ákwà ọcha e kenyere n’osisi abụọ. Ihe a na-atọgbu ndị obodo ndị ahụ atọgbu. Ọ na-abụ nke mbụ ya ọtụtụ n’ime ha na-ele fim. Ha na-akụsi aka ike mgbe ha na-ele ebe a na-eme ndị mmadụ baptizim. Fim ndị ahụ nyeere ha aka ịghọta na anyị bụ ụmụnna nọ n’ụwa niile dị n’otu.
Anyị lụrụ na Gana n’afọ 1959
Mgbe m nọchara afọ abụọ n’Afrịka, obi tọgburu m atọgbu ịga mgbakọ mba niile e nwere na Niu Yọk Siti n’afọ 1958. M nwere ezigbo obi ụtọ mgbe mụ na Sheila hụrụ. O si Kwebek, ebe ọ bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, bịa. Tupu mgbe ahụ, anyị na-edere ibe anyị akwụkwọ ozi. Ma ugbu a, anyị hụrụ ihu na ihu ọzọ. M gwara ya ka mụ na ya lụọ, ya ekweta. M degaara Nwanna Knorrd akwụkwọ ozi, jụọ ya ma Sheila ò nwere ike ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied ma soro m jewe ozi n’Afrịka. O kwetara. Sheila mechara rute Gana. Anyị lụrụ n’abalị atọ n’ọnwa Ọktoba afọ 1959 n’Akra. Anyị ghọtara na Jehova agọziela anyị n’ihi na anyị mere ofufe ya ihe kacha mkpa ná ndụ anyị.
MỤ NA NWUNYE M JEKỌRỌ OZI NA KAMERUUN
Ebe m na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Kameruun
N’afọ 1961, e zigara anyị Kameruun. A gwara m ka m nye aka hiwe alaka ụlọ ọrụ n’ebe ahụ. N’ihi ya, m na-ejikarị ọrụ n’aka. Ebe ọ bụ na a họpụtara m ọhụrụ ịbụ ohu alaka, e nwere ọtụtụ ihe m ga-amụta. N’afọ 1965, nwunye m dịrị ime. Ama m na ọ dịrịghị anyị mfe iche n’echiche na anyị ga-abụzi nne na nna. Ma, ka anyị nọ na-atụsi anya ike ibido ọrụ ọhụrụ a anyị ga-arụwa, na-ahazikwa ịlaghachi Kanada, ihe na-agbawa obi mere anyị.
Ime ahụ pụrụ nwunye m. Dọkịta gwara anyị na nwa anyị ahụ bụ nwoke. Ihe a akarịala afọ iri ise o mere, mana anyị anaghị echefu ya echefu. Ọ bụ eziokwu na ihe ahụ gbawara anyị obi, ma anyị jeere ozi anyị na-aga, bụ́ ozi na-atọ anyị ezigbo ụtọ.
Mgbe mụ na Sheila nọ na Kameruun n’afọ 1965
Na Kameruun, a na-akpagbukarị ụmụnna anyị n’oge ahụ n’ihi na ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ihe a kara njọ n’oge a na-eme ntụliaka ịhọpụta onyeisi ala n’obodo ahụ. Mana ihe kacha atụ anyị ụjọ mere n’abalị iri na atọ n’ọnwa Mee afọ 1970, mgbe ndị ọchịchị machiri Ndịàmà Jehova iwu n’obodo ahụ. Ndị ọchịchị weghaara ọmarịcha alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ anyị anyị ka kwabara ọnwa ise gara aga. N’ime otu izu, a chụpụrụ ndị ozi ala ọzọ niile n’obodo ahụ, ma mụ na nwunye m. O siiri anyị ike ịhapụ ụmụnna anyị ebe ahụ n’ihi na anyị hụrụ ha n’anya nakwa n’ihi na anyị amaghị ihe ga-emecha mee ha.
Anyị nọrọ ọnwa isii n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Frans. N’ebe ahụ, m mere ihe niile m nwere ike ime iji nyere ụmụnna anyị nọ na Kameruun aka. N’ọnwa Disemba afọ ahụ, e zigara anyị n’alaka ụlọ ọrụ dị na Naịjirịa. Ọ bụ ya bidoro ilekọta ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ na Kameruun. Ụmụnna nọ na Naịjirịa ji obi ụtọ nabata anyị. Obi dịkwa anyị ụtọ na anyị jere ozi ebe ahụ ruo afọ ụfọdụ.
MKPEBI SIRI EZIGBO IKE
N’afọ 1973, e nwere ihe tara akpụ dapụtaranụ anyị ga-ekpebi ihe anyị ga-eme gbasara ya. Nwunye m nọ na-arịa ọrịa ụfọdụ na-enye ya ezigbo nsogbu. Mgbe anyị gara mgbakọ na Niu Yọk, o bewere ákwá ma gwa m, sị: “Agaghị m emereli ihe a na-aga. Ike na-agwụkarị m, m na-arịakarịkwa ọrịa.” Mụ na ya ejeela ozi n’Ọdịda Anyanwụ Afrịka ruo afọ iri na anọ. Obi dị m ezigbo ụtọ maka otú o si jiri obi ya niile jeere Jehova ozi. Mana ugbu a, anyị kwesịrị ịgbanwe ihe ụfọdụ. Mgbe anyị kwurịtachara gbasara ya ma kpesie ekpere ike maka ya, anyị kpebiri na anyị ga-alaghachi Kanada, ebe anyị ga-enwe ike ilebara ọrịa ya ahụ anya nke ọma. Ịhapụ ozi ala ọzọ anyị na-eje nakwa ozi oge niile bụ mkpebi kacha taa akpụ nakwa nke kacha agbawa obi anyị metụrụla.
Mgbe anyị rutere Kanada, otu enyi m nyere m ọrụ. O teela mụ na ya bụ enyi. Ọ na-ere ụgbọala n’otu obodo dị n’ebe ugwu ma e si Toronto gawa ya. Anyị chọtara ụlọ, zụtakwa arịa ụlọ na-abụghị nke ọhụrụ. Ihe a mere ka anyị nwee ike ịkwafe ebe ahụ n’ejighị ụgwọ ọ bụla. Anyị achọghị ibi ndụ okomoko. Obi anyị niile bụ na otu ụbọchị, anyị nwere ike ịlaghachi n’ozi oge niile. O juru anyị anya na ihe a mere ngwa ngwa karịa otú anyị tụrụ anya ya.
M malitere iwepụta onwe m n’ụbọchị Satọdee na-aga arụ ọrụ n’ebe a na-arụ Ụlọ Mgbakọ ọhụrụ na Nọval dị n’Ọnterio. Ka oge na-aga, a gwara m ka m bụrụ onye na-elekọta Ụlọ Mgbakọ. Ahụ́ nwunye m akawala mma. Obi sikwara anyị ike na anyị ga-arụli ọrụ ọhụrụ ahụ. N’ihi ya, anyị kwagara n’Ụlọ Mgbakọ ahụ n’ọnwa Jun afọ 1974. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị amalitekwala ije ozi oge niile ọzọ.
Obi tọgburu anyị atọgbu na ahụ́ nwunye m nọ na-aka mma. Mgbe afọ abụọ gachara, a gwara anyị ka anyị letawa sekit. Sekit ahụ dị na Manitoba dị na Kanada. Ọ na-ajụ ezigbo oyi. Ma, otú ụmụnna nọ ebe ahụ si hụ anyị n’anya mere anyị ezigbo obi ụtọ. Anyị ghọtara na ihe dị mkpa abụghị ebe anyị nọ na-eje ozi. Ihe bụ́ isi bụ ka anyị na-efe Jehova n’agbanyeghị ebe anyị nọ.
ỊMỤTA IHE DỊ EZIGBO MKPA
Mgbe m rụrụ ọrụ sekit ruo afọ ụfọdụ, a kpọrọ anyị ka anyị jewe ozi na Betel dị na Kanada n’afọ 1978. N’oge na-adịghị anya, m mụtara ihe wutere m ma baara m ezigbo uru. E nyere m ihe omume ikwu okwu ga-ewe otu awa na nkeji iri atọ n’asụsụ French ná nnọkọ pụrụ iche e mere na Mọntriọl. Ma ọ dị mwute na okwu m kwuru nọ na-atụ ụra. Otu nwanna si ná Ngalaba Ije Ozi nyekwara m ndụmọdụ maka ya. Ma n’eziokwu, m kwesịrị ịghọta n’oge ahụ otú m ghọtara ugbu a na abụghị m onye okwu na-aga were were n’ọnụ. Ma, anabataghị m ndụmọdụ ahụ. Mkparịta ụka mụ na ya dawara ájá ájá, iwe abịa m n’ihi na m chere na ọ na-akatọ m maka na ọ jaghị m mma n’ebe m mere nke ọma. Ihe mere ka m jụ ndụmọdụ ahụ bụ otú e si nye m ya na ihe m chere gbasara onye nyere m ya. Mana ihe ahụ m mere adịghị mma.
M mụtara ihe bara ezigbo uru mgbe m kwuchara okwu n’asụsụ French
Mgbe ụbọchị ole na ole gara, otu nwanna so na Kọmitii Alaka gwara m okwu gbasara ya. M gwara ya na ihe m mere mgbe e nyere m ndụmọdụ ahụ adịghị mma nakwa na o wutere m na m mere otú ahụ. Ihe ọzọ m mere bụ na m gakwuuru nwanna ahụ nyere m ndụmọdụ, rịọ ya mgbaghara, ya anabata ya. Ihe a kụziiri m ihe dị ezigbo mkpa gbasara ịdị umeala n’obi m na-agaghị echefu echefu. (Ilu 16:18) M kpere ekpere gbasara ihe a ọtụtụ ugboro. Ekpebisiekwala m ike na m ga-anabata ndụmọdụ mgbe ọ bụla e nyere m ya.
Anọọla m na Betel dị na Kanada ihe karịrị afọ iri anọ. Kemgbe afọ 1985, esokwa m na Kọmitii Alaka. N’ọnwa Febụwarị afọ 2021, nwunye m m hụrụ n’anya bụ́ Sheila nwụrụ. Ka m na-edi ọnwụ ya, m na-arịakwa ọrịa. Mana, ihe ndị m na-eme n’ozi Jehova mere ka m na-eji ọrụ n’aka mgbe niile ma na-enwe obi ụtọ nke na ‘anaghịdị m ama na ụbọchị na-agwụ n’ike n’ike.’ (Ekli. 5:20) Ọ bụ eziokwu na enweela m ọtụtụ nsogbu, ma e nweekwala ihe ndị ọzọ mere m obi ụtọ karịa ha. Iwere ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ m nakwa afọ iri asaa m jirila jee ozi oge niile abaarala m ezigbo uru. Ekpere m bụ ka ụmụnna anyị ndị na-eto eto werekwa ofufe Jehova ka ihe kacha ha mkpa ná ndụ, n’ihi na obi siri m ike na ime otú ahụ ga-eme ka ndụ na-atọ ha ụtọ.
a Gụọ akụkọ ndụ Nwanna Marcel Filteau n’isiokwu bụ́ “Jehova Bụ Ebe Mgbaba M na Ike M” n’Ụlọ Nche February 1, 2000.
b Ruo n’afọ 1957, ọ bụ ndị Briten na-achị obodo a dị n’Afrịka. Ihe a na-akpọ ya n’oge ahụ bụ Gold Kost.
c Gụọ akụkọ ndụ Nwanna Herbert Jennings isiokwu ya bụ “Unu Bụ Ndị Na-amataghị Ihe Ga-eme Echi.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche December 1, 2000.
d Ọ bụ Nwanna Nathan H. Knorr na-eduzi ọrụ anyị n’oge ahụ.