Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp19 nke 2 p. 12-13
  • Mgbe Nsogbu Mere Ka Ọ Dị Gị Ka Gị Nwụọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Nsogbu Mere Ka Ọ Dị Gị Ka Gị Nwụọ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • EBE ANYỊ GA-ENWETA ENYEMAKA
  • È NWERE IHE GA-EME KA NSOGBU A KWỤSỊ KPAMKPAM?
  • Gịnị Mere Anyị Nile Kwesịrị Iji Too Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Imeri n’agha a na-ebuso obi ịda mbà
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Gịnị Mere Ndị Na-eto Eto Ji Ada Mbà? Gịnị Ga-enyere Ha Aka?
    Teta!—2017
  • Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Obi Dara M Mbà?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
wp19 nke 2 p. 12-13
Ebe otu nwaanyị mepere Baịbụl, jide ya aka, nọrọ na tebụl na-ele anya

Mgbe Nsogbu Mere Ka Ọ Dị Gị Ka Gị Nwụọ

E nwere otu nwaanyị bi na Brazil aha ya bụ Adriana. Nchegbu mere ka ọ malite ịrịa ọrịa na-eme ka isi ghara ịkpakọcha mmadụ ọnụ. O kwuru, sị: “Obi na-ajọkarị m njọ, ike ụwa ana-agwụ m, mụ ekpebie na ọ kaara m mma igbu onwe m.”

Ò NWETỤLA mgbe obi nọ na-ajọ gị ezigbo njọ nke na ọ dị gị ka ọnwụ bịa gbuo gị? Ọ bụrụ na o nweela, ị ga-aghọta otú obi dị Adriana.

E nwekwara otu nwoke onye Japan aha ya bụ Kaoru. Ọ na-elekọta nne na nna ya merela agadi ma na-arịa ọrịa. Ọ sịrị: “N’oge ahụ m na-elekọta ha, nsogbu zuru m ahụ́ n’ụlọ ọrụ anyị. Ka oge na-aga, agụụ anaghịzi agụ m, ihi ụra ana-esikwara m ike. M maliteziri iche na nsogbu a niile ga-ebikwanụ ma ọ bụrụ nnọọ na mụ anwụọ.”

Otu nwoke onye Naịjirịa aha ya bụ Ojebode kwuru, sị: “Obi na-ajọkarị m njọ nke na m na-anọkata bewe ákwá. N’ihi ya, m chọwara otú m m ga-esi gbuo onwe m.” Obi dị anyị ụtọ na Ojebode, Kaoru, na Adriana emechaghị gbuo onwe ha. Ma, n’afọ ọ bụla, ọtụtụ narị puku mmadụ na-egbu onwe ha.

EBE ANYỊ GA-ENWETA ENYEMAKA

Ọtụtụ n’ime ndị na-eji aka ha egbu onwe ha na-abụkarị ụmụ nwoke. Ihe mere ọtụtụ n’ime ha ji gbuo onwe ha bụ na ihere ekweghị ha rịọ ka e nyere ha aka. Ma, Jizọs sịrị na mkpa ọgwọ ọrịa dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu. (Luk 5:31) Ọ bụrụ na obi na-ajọkarị gị njọ nke na ị na-eche banyere igbu onwe gị, biko ihere emela gị ikwu ka e nyere gị aka. Ọtụtụ ndị ụdị ihe a na-eme achọpụtala na ịga ụlọ ọgwụ enyerela ha aka inwetatụ onwe ha ma na-edi ya. Ma Ojebode ma Kaoru ma Adriana gachara ụlọ ọgwụ, e nyere ha aka. Ugbu a, ha enwetatụla onwe ha.

Ndị dọkịta nwere ike inye onye ahụ ọgwụ ma ọ bụ ha na ya ana-ekwurịta okwu ma ọ bụkwanụ ha emee ha abụọ iji nyere ya aka. Ọ na-adịkwa mma ka ndị ezinụlọ na ndị enyi onye ụdị ihe a na-eme na-aghọta ha, na-enwere ha ndidi, na-elekọta ha ma na-enyere ha aka. Enyi kacha enyi onye ọ bụla nwere ike inwe bụ Jehova Chineke. Ọ na-eji Okwu ya bụ́ Baịbụl enyere ndị mmadụ ezigbo aka.

È NWERE IHE GA-EME KA NSOGBU A KWỤSỊ KPAMKPAM?

O nwere ike ịdị mkpa ka a na-agwọ ndị obi na-ajọkarị njọ ma ọ bụ ndị isi na-akpakọchaghị ọnụ ruo ogologo oge. O nwekwara ike ịdị mkpa ka ha gbanwee otú ha si eme ihe ụfọdụ. Ma, ọ bụrụ na i nwere ụdị nsogbu a, nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu, otú ahụ Ojebode nwere. O kwuru, sị: “M na-atụ anya mgbe ihe e kwuru n’Aịzaya 33:24 ga-emezu. Ebe ahụ kwuru na oge na-abịa mgbe a na-enweghị onye bi n’ụwa ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’ ” Chineke kwekwara nkwa na a ga-enwe “ụwa ọhụrụ” nke “ihe mgbu” na-agaghịzi adị na ya. Ka nkwa a mee ka obi sie gị ike ka Ojebode. (Mkpughe 21:​1, 4) Ihe ọ pụtara bụ na ihe niile na-enye mmadụ nsogbu n’obi ga-ala ka naị. O nweghịzi mgbe obi ga na-ajọ gị njọ. Ị gaghịzi “echeta [ihe niile na-echegbu gị], ha agaghị abatakwa [gị] n’obi.”​—Aịzaya 65:17.

Amaokwu Baịbụl Nwere Ike Inye Aka

Chineke na-aghọta otú obi dị gị.

“Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị, . . . na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’”​—Aịzaya 41:13.

Jehova na-aghọta otú obi dị anyị karịa onye ọ bụla ọzọ, ọ chọkwara inyere anyị aka.

Na-atụgharị uche n’Okwu Chineke.

“[Ịlaịja kpọkuru] Jehova rịọọ ya ka o wepu ndụ ya. ‘. . .Jehova m, biko wepụ ndụ m.’”​—1 Ndị Eze 19:4. Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Ojebode kwuru, sị: “Ịtụgharị uche n’Okwu Chineke nyeere m aka. M chọpụtara na o nwere mgbe ọ dị Ịlaịja onye amụma otú ọ dị m.”

Mụta ihe n’aka ndị a kọrọ gbasara ha na Baịbụl.

Jizọs kwuru, sị: “Arịọsiwo m arịrịọ ike maka gị [ya bụ, Pita] ka okwukwe gị wee ghara ịda mbà.”​—Luk 22:32.

Mgbe Pita onyeozi gọnahụchara Jizọs, o wutere ya nke ukwuu, ya ebee ezigbo ákwá. Kaoru kwuru, sị: “Ịtụgharị uche n’ihe Pita mere na otú Jizọs si meso ya mere ka m ghọta na mwute Pita nwere metụrụ Jehova na Jizọs n’obi. Ihe a mere ka obi sie m ike.”

Ị gaghịzi “echeta [ihe niile na-echegbu gị], ha agaghị abatakwa [gị] n’obi.” ​—Aịzaya 65:17

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya