Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp19 nke 2 p. 10-11
  • Mgbe Ezigbo Ọrịa Ji Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Ezigbo Ọrịa Ji Gị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NYEERE ỤFỌDỤ NDỊ AKA
  • Ọrịa Na-adịghị Ala Ala—Nsogbu Ezinụlọ
    Teta!—2000
  • Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Ịnagide Ọrịa Gị—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
    Teta!—2001
  • Otú Ezinụlọ Ga-esi Nagide Ọrịa Na-adịghị Ala Ala
    Teta!—2000
  • N’ihi Gịnị Ka M Ji Arịasi Ọrịa Ike?
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
wp19 nke 2 p. 10-11

Mgbe Ezigbo Ọrịa Ji Gị

Otu nwaanyị aha ya bụ Linda, dị iri afọ asaa na otu, kwuru, sị: “Mgbe dọkịta gwara m na m nwere ọrịa kansa n’akpa ume na n’eriri afọ, m sịrị onwe m na nke a bụzinụ ọnwụ. Ma, mgbe m laruru, m gwara onwe m, sị, ‘Ihe a abụghị ihe m tụrụ anya ya, ma m ga-achọ otú m ga-esi na-edi ya.’”

Otu nwaanyị dị afọ iri anọ na itoolu aha ya bụ Elise kwuru, sị: “M na-arịa ọrịa akwara. Ọ na-eme ka akụkụ ihu m ebe aka ekpe na-egbu m ezigbo mgbu. Mgbe ụfọdụ, mgbu ọ na-egbu m na-eme ka ike ụwa gwụ m. Ọtụtụ mgbe, ọ na-adị m ka ụwa nke m ọ̀ ka njọ, mụ echewedị echiche igbu onwe m.”

Ebe otu nwoke na-arịa ọrịa nọ n’ígwè ndị ngwọro, ndị ezinụlọ ya agbaa ya gburugburu

Ọ BỤRỤ na o nweela mgbe a gwara gị na ị na-arịa ọrịa nwere ike igbu gị ma ọ bụkwanụ na onye nke gị na-arịa ọrịa nwere ike igbu ya, ị ga-ama na ọ na-agbawa obi. E wezụga ọrịa ahụ, obere ihe nwere ike ịkpasu onye ahụ ahụ́ na-adịghị ma ọ bụ ndị ezinụlọ ya iwe ma ọ bụkwanụ mee ka ha chegbuwe onwe ha. Ihe ndị nwere ike ime ka ụjọ na nchegbu ha kakwuo njọ bụ ịgaghachi n’ụlọ ọgwụ ọtụtụ mgbe, ego ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ nwere ike ime ka ịgwọ onye ahụ sie ike, ma ọ bụkwanụ nsogbu ndị ọgwụ nwere ike ịkpatara onye ahụ. Nchegbu ya na ọrịa so aga abụghị obere ihe.

Olee ihe nwere ike inyere anyị aka? Ọtụtụ ndị achọpụtala na ikpe ekpere na ịgụ Baịbụl enyerela ha ezigbo aka. Ndị ezinụlọ mmadụ na ndị enyi ya nwekwara ike inyere ya aka.

IHE NYEERE ỤFỌDỤ NDỊ AKA

Otu nwoke dị iri afọ ise na asatọ aha ya bụ Robert kwuru, sị: “Tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enyere gị aka idi ọrịa ị na-arịa. Na-ekpe ekpere, na-akọrọ Jehova otú obi dị gị. Rịọ ya ka o nye gị mmụọ nsọ ya. Rịọkwa ya ka o nyere gị aka ka i nwee ike idi ọrịa ị na-arịa, ka obi ghara ikoro ndị ezinụlọ unu.”

Robert kwukwara, sị: “Ọ na-aba ezigbo uru ma ndị ezinụlọ gị nyere gị aka. Kwa ụbọchị, otu onye ma ọ bụ abụọ n’ime ndị ezinụlọ anyị na-akpọ m n’ekwentị jụọ m otú m mere. Ndị enyi m nọ ebe dị iche iche na-agbakwa m ume. N’eziokwu, ihe a ha mere nyeere m aka inweta onwe m, ike ụwa agharakwa ịgwụ m.”

Ọ bụrụ na ị gaa ileta onye na-arịa ọrịa, ihe Linda kwuru ga-enyere gị aka. Ọ sịrị: “Nke bụ́ eziokwu bụ na onye na-arịa ọrịa na-achọ ibi ndụ ka ndị ọzọ, o nwekwara ike ọ gaghị amasị ya ịna-ekwu gbasara ọrịa ya mgbe niile. N’ihi ya, hapụ ikwu gbasara ọrịa ya ahụ, kwuwe gbasara ihe ndị ọzọ.”

Ọ bụrụgodị na ezigbo ọrịa na-akpa anyị aka ọjọọ, aka Chineke na-enyere anyị, ihe ndị na-akasi obi anyị na-agụta na Baịbụl, nakwa aka ndị ezinụlọ na ndị enyi anyị na-enyere anyị ga-eme ka obi sie anyị ike na anyị ka ga-enweli obi ụtọ ná ndụ.

Amaokwu Baịbụl Nwere Ike Inye Aka

Tụkwasị Chineke obi.

“Ajụrụ m Jehova ase, o wee za m, ọ napụtakwara m n’ihe niile na-emenye m ụjọ. Onye a nke nọ n’ahụhụ kpọkuru Jehova, o wee nụ ya. Ọ zọpụtakwara ya n’ahụhụ ya niile.”​—Abụ Ọma 34:​4, 6.

Linda e kwuru gbasara ya na mbụ kwuru, sị: “O nwebeghị mgbe m kpere ekpere sị Chineke, ‘mee ka m gbakee.’ Ihe m na-arịọkarị ya bụ ka o nyere m aka ka m dị ike, nakwa ka m die ọrịa m na-arịa.’”

Na-agụ Baịbụl ka o nyere gị aka ịdị ike.

“Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’ ”​—Aịzaya 33:24.

Na-atụgharị uche ná nkwa ndị Chineke kwere. Ọ ga-eme ka i nwee olileanya. Olileanya a ga-emekwa ka i die nsogbu gị.

Gwa ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị ka ha nyere gị aka.

“Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”​—Ilu 17:17.

Elise e kwuru gbasara ya na mbụ kwuru, sị: “Kọọrọ ndị ọzọ nsogbu gị. Kwe ka ha nyere gị aka. E nwere mgbe o nwere ike ịdị gị ka o nweghị onye chọrọ ịma gbasara nsogbu gị ma ọ bụ gị echee na Chineke anaghịdị aza ekpere gị, ma ahapụla ikwe ka ndị ọzọ nyere gị aka ma ọ bụ kwụsị ịkọrọ Chineke obi gị.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya