Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp19 nke 2 p. 8-9
  • Mgbe Di ma ọ bụ Nwunye Gị Gbara n’Èzí

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Di ma ọ bụ Nwunye Gị Gbara n’Èzí
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ NWERE IKE INYERE GỊ AKA
  • Ịnagide Ihe Ndọghachi Azụ Site n’Isetịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ
    Teta!—2001
  • Otú Chineke Si Akasi Anyị Obi n’Oge Nsogbu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • À Pụrụ Ikpezi?
    Teta!—1999
  • Emere M Nhọrọ Dị Mma n’Ihe Banyere Ọrụ
    Teta!—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
wp19 nke 2 p. 8-9
Ebe otu nwaanyị na-ekpe ekpere

Mgbe Di ma ọ bụ Nwunye Gị Gbara n’Èzí

Otu nwaanyị bi na Spen aha ya bụ Maria kwuru, sị: “Mgbe di m gwara m na ya ga-ahapụ m gaa lụrụ nwa agbọghọbịa, ọ dị m ka m gbuo onwe m. M weere ihe ahụ ka mmegbu, karịchaa ma m cheta ihe niile m hapụrụ n’ihi ya.”

Otu nwoke bi na Spen aha ya bụ Bill kwuru, sị: “Mgbe nwunye m nọkatara nnọọ hapụ m, ọ dị m ka ò nwere ihe pụrụ m n’ahụ́. Otú a ka ihe niile anyị bu n’obi ime ná ndụ na ihe niile anyị na-atụ anya ha si ghasaa. O nwere ụbọchị ụfọdụ ọ na-adị m ka ọ naghịzi emetụ m n’ahụ́, ma tupu m mara ihe na-eme, obi ajọwakwa m njọ.”

Ọ BỤRỤ na di ma ọ bụ nwunye mmadụ agbaa n’èzí, ọ na-agbawa obi. Ma, ụfọdụ di ma ọ bụ nwunye na-ekpebi ịgbaghara ibe ha ma gbalịa ka ha dịghachikwa ná mma.a Mana, ma di na nwunye hà tisara ma ọ bụ na ha lụụrụ na-aga, ụdị mwute ndị chọpụtara na di ma ọ bụ nwunye ha gbara n’èzí na-enwe anaghị apụ n’obi ngwa ngwa. Gịnị nwere ike inyere ndị ụdị ihe a mere aka?

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ NWERE IKE INYERE GỊ AKA

Ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ akasiela ọtụtụ ndị di ma ọ bụ nwunye ha gbara n’èzí obi n’agbanyeghị na obi gbawara ha na mbụ. Ha achọpụtala na Chineke na-ahụ anya mmiri ha nakwa na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi.​—Malakaị 2:​13-16.

“Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m, nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.”​—Abụ Ọma 94:19.

Bill kwuru, sị: “Ka m nọ na-agụ amaokwu Baịbụl ahụ, eji m uche m na-ahụ otú Jehova si jiri nwayọọ na-eme ka ahụ́ ruo m ala, otú ahụ nna ihe gbasara nwa ya na-emetụ n’obi si eme.”

“Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe”​—Abụ Ọma 18:25.

E nwere otu nwaanyị di ya gbara n’èzí ruo ọtụtụ ọnwa. Aha ya bụ Carmen. O kwuru, sị: “Di m na-agba n’èzí. Ma, obi siri m ike na Jehova agaghị ahapụ m. O nweghị mgbe ọ ga-agharịpụ m.”

“Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike . . . mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu . . . nche.”​—Ndị Filipaị 4:​6, 7.

Otu nwaanyị aha ya bụ Sasha kwuru, sị: “M gụrụ amaokwu Baịbụl ndị a ọtụtụ ugboro. Ka m na-ekpekwu ekpere, Chineke mere ka obi ruo m ala.”

O nwere mgbe ike ụwa gwụrụ ndị e kwuru gbasara ha n’isiokwu a. Ma, ha tụkwasịrị Jehova Chineke obi, mụọkwa Baịbụl, ya emee ka ha nwee ume. Bill kwuru, sị: “Okwukwe m mere ka ndụ m nwee isi mgbe o yiri ka ihe niile aghasaala. Ọ bụ eziokwu na e nwere mgbe ‘m jere ije na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị,’ Chineke nọnyeere m.”​—Abụ Ọma 23:4.

a Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara ihe ga-enyere gị aka ikpebi ma ị̀ ga-agbaghara ka ọ bụ na ị gaghị agbaghara, gụọ isiokwu bụ́, “Mgbe Onye Òtù Ọlụlụ Na-ekwesịghị Ntụkwasị Obi.” Ọ gbara na Teta! Mee 8, 1999.

Ihe Nyeere Ụfọdụ Ndị Aka

Na-atụgharị uche na Baịbụl.

Bill kwuru, sị: “M gụrụ akwụkwọ Job na Abụ Ọma. Ka m na-agụ ha, m nọ na-akanye ihe n’ebe ndị yiri ka ọ̀ na-ekwu gbasara m. M chọpụtara na o nwekwara mgbe ndị m gụrụ banyere ha nwere ihe ndị gbawara ha obi ma ọ bụ ihe ndị mere ka ha chegbuwe onwe ha ka m.”

Jiri egwú na-emeda onwe gị obi.

Carmen kwuru, sị: “M na-adị akpọnye egwú ma ụra ekweghịzi atụ m n’abalị. Ihe a nyeere m ezigbo aka.” Daniel kwuru, sị: “Amụrụ m otú e si akpọ ụbọ. M na-akpọ ya, ọ na-eme ka obi ruo m ala.”

Na-ekwu otú obi dị gị.

Daniel kwuru, sị: “Ọ mabughị m ahụ́ ịkọrọ mmadụ obi m. Ma, m maliteziri na-akọrọ ezigbo ndị enyi m otú obi dị m kwa ụbọchị. M na-akọrọ ha obi m ma mụ na ha nọrọ, ma n’akwụkwọ ozi. Ihe a nyeere m ezigbo aka.” Sasha kwuru, sị: “Aka ndị ezinụlọ anyị nyeere m baara m ezigbo uru. Mama m nyeere m aka oge ahụ niile. Ọ na-ewetu nnọọ obi gee m ntị ma m na-akọrọ ya obi m. Papa m gosikwara m na ọ hụrụ m n’anya, meekwa ka obi ruo m ala. O nyeere m aka, mụ ejiri nwayọọ nwayọọ nweta onwe m.”

Na-ekpe ekpere mgbe niile.

Carmen kwuru, sị: “M na-ekpe ekpere mgbe niile. Aghọtara m na Chineke ahapụbeghị m, na ọ na-ege m ntị, na-enyekwara m aka. M bịarukwuru ya nso n’oge ahụ di m hapụrụ m.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya