Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/03 p. 3-4
  • Inwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Kọmputa Eme Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Kọmputa Eme Ihe
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ihe Bara Uru Na-enye Aka ná Nsụgharị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 12/03 p. 3-4

Inwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Kọmputa Eme Ihe

1 Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst narị afọ mbụ ume ka a ghara ịdọpụ uche ha n’ihi na “oge fọdụrụnụ dị ntakịrị.” (1 Kọr. 7:29) Ka ọgwụgwụ nke usoro ihe ochie a na-eru nso, lee otú ọ dịruru ngwa anyị ‘iburu ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya’! nakwa ‘ịzụpụtara onwe anyị oge kwesịrị ekwesị’! Oge dị oké ọnụ ahịa.—Mat. 6:33; Efe. 5:15, 16.

2 E toola nkà na ụzụ dị ka ihe na-echebe oge nke ukwuu. Dị ka ihe atụ, mmadụ pụrụ inweta ọtụtụ ihe ọmụma n’otu ntabi anya site n’iji Intanet mee ihe. Ọtụtụ mgbe, kọmputa pụrụ iji nanị sekọnd ole na ole mee ihe ga-ewe ọtụtụ awa ma ọ bụ izu ma e jiri ihe ọzọ mee ya. Mgbe e ji ya mee ihe nke ọma, ọ na-abụ ngwá ọrụ na-enye aka.

3 Ọ̀ Ga-echebe Oge n’Ezie?: N’aka nke ọzọ, mmadụ inweta na iji kọmputa eme ihe ga-efu onye ahụ ihe dị ukwuu—ma oge ma ego. Ọ pụrụ iwe ọtụtụ awa iji mụta otú e si eme ka kọmputa rụọ ọrụ ụfọdụ. Ọzọkwa, onye nwere mmasị dị ukwuu na ya pụrụ ịla oge a pụrụ iji mee ihe ndị ka mkpa n’iyi. Anyị aghaghị inwe echiche ziri ezi, na-eburu ụkpụrụ dị na ndụmọdụ Pọl onyeozi n’obi, nke bụ́ ịdị na-eje ije “dị ka ndị maara ihe, na-azụpụtara onwe [anyị] oge kwesịrị ekwesị.”—Lee 1 Ndị Kọrint 7:31.

4 Ọtụtụ ndị bu ezi ihe n’obi emepụtawo ihe omume kọmputa iji na-edebe ihe ndekọ ọgbakọ. N’eziokwu, ọ bụ mmadụ ga-ekpebi n’onwe ya otú ọ ga-esi na-eji kọmputa ya na-eme ihe. Otú ọ dị, e kwesịghị itinye ihe ndekọ ọgbakọ, bụ́ ndị e nwere fọm maka ha, n’ime kọmputa ebe ọ bụ na ụmụaka ma ọ bụ ndị ọzọ na-ekwesịghị ịhụ ihe ndekọ ndị ahụ pụrụ imepe ha. E kwesịrị idenye ihe ndekọ ọgbakọ nile—ihe ndekọ ego, kaadị Congregation’s Publisher Record, na ihe ndị ọzọ—na fọm ndị nzukọ a wepụtara maka ha, e kwesịghịkwa itinye ihe ọmụma ndị dị na fọm ndị ahụ na kọmputa. Site n’ụzọ dị otú a, a ga-echebe ihe ndekọ nzuzo nke ọgbakọ.

5 Ndị nwere ibu ọrụ nlekọta kwesịrị iji nghọta na-eme ihe mgbe ha na-ekenye ndị mmadụ ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nakwa ná Nzukọ Ije Ozi. Ọ dị ha mkpa ịmara ihe ihe omume nke ọ bụla na-ekwu. Dị ka ihe atụ, n’ụlọ akwụkwọ, ọ gaghị ekwesị ekwesị ikenye onye ọ bụla a hụrụ ihe omume ụfọdụ. E kwesịrị iburu n’uche nzube nke ihe omume ahụ na iru eru nke onye ahụ nakwa otú ihe omume ahụ dị. E kwesịghị ịhapụrụ ya kọmputa ka o kpebie.

6 Nwanna e nyere ihe omume ná nzukọ ọgbakọ ekwesịghị ịdabere n’ihe onye ọzọ kwadebere, karịsịa onye ọ na-amaghị ama, nanị n’ihi na ọ dị na kọmputa, nakwa na iji ya mee ihe ga-ebelatara ya ọrụ. Ndị Kraịst maara nke a na-akọ adịghị anwa anwa akwadebe okwu Bible ma ọ bụ ihe omume nzukọ ma tinye ha na kọmputa maka ndị ọzọ iji ya eme ihe. Otú ọ dị, kọmputa na Watchtower Library nke dị na CD-ROM pụrụ ịbụ ngwá ọrụ ndị bara uru nye ụmụnna n’otu n’otu ma na-enyere ha aka ime nnyocha n’obere oge e nwere.

7 A bịa n’ihe banyere imepụta na ikesara ụmụnna ihe omume kọmputa, ndepụta, na ihe ndị yiri ya, na ịkwadebe na iji kọmputa ma ọ bụ ihe ndị ọzọ kesaa ihe omume Nzukọ Ije Ozi na Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ọ na-aka mma ka ụmụnna kwadebe ihe omume nke ha, na-eburu uru ndị ọgbakọ ga-erite na ya n’uche. (1 Tim. 4:13, 15) A gaghị anwa anwa jiri ihe ndị metụtara ọgbakọ mee ihe iji nweta uru ego onwe onye.

8 Gịnị banyere ikesa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ma ọ bụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ bụ́ ndị e ji kọmputa bipụta? Ọ pụrụ ịkasị mma ka ndị nkwusa n’otu n’otu na-ede ihe ma na-akanye akara n’ime Bible nakwa n’akwụkwọ ndị a na-amụ. Ná nzukọ, ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e ji kọmputa bipụta, bụ́ ndị e zoro aka na ha n’akwụkwọ a na-amụ, pụrụ ime ka a ghara iji Bible n’onwe ya na-eme ihe. Ọzọkwa, ịsaghe Akwụkwọ Nsọ n’oge a na-amụ Bible ma ọ bụ ná nzukọ ọgbakọ bụ akụkụ nke ọzụzụ anyị na-enweta, nke na-eme ka anyị na-eji Bible eme ihe nke ọma n’ozi ubi. N’ọnọdụ ndị ka ukwuu, nakwa mgbe a na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị toro nnọọ ogologo, ịgụpụta ya kpọmkwem site na Bible na-aka adị irè, karịsịa mgbe a gbara ndị na-ege ntị ume isonye n’ọgụgụ Bible ahụ.

9 Ọnyà Ndị Ọzọ Siri Ike: Dị ka e gosiri na peeji nke 17 nke Ụlọ Nche August 1, 1993, ịga n’ebe a na-edebe ihe ọmụma maka ọha na eze n’Intanet pụrụ itinye mmadụ n’ihe ize ndụ ime mmụọ ndị siri ike. Dị nnọọ ka mmadụ pụrụ itinye ihe na-emebi ihe omume kọmputa n’ebe a na-edebe ihe ọmụma maka ọha na eze n’Intanet, ọ pụrụ ịdịrị ndị dapụrụ n’ezi ofufe, ndị ụkọchukwu, na ndị na-achọ imebi ndị ọzọ n’ụzọ omume ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ mfe itinye echiche ha na-emerụ emerụ n’ebe ndị a na-edebe ihe ọmụma maka ọha na eze n’Intanet. Ebe a na-edebe ihe ọmụma maka ọha na eze n’Intanet, ọbụna nke e dere “JW Only” (Nanị Maka Ndịàmà Jehova), pụrụ iduba Ndị Kraịst na-eji ya eme ihe ná “mkpakọrịta ọjọọ,” ọ gwụkwala ma a na-elezi ya anya nke ọma, ma mee ka ọ bụrụ nanị ndị ohu Jehova tozuru okè na-eji ya eme ihe. (1 Kọr. 15:33) Alaka ụlọ ọrụ enwetawo ọtụtụ mkpesa na e jiriwo ihe dị otú ahụ a sịrị na ọ bụ usoro nzirịta ozi mmadụ nwe mee ihe, ọ bụghị nanị iji kọọ nkọ banyere ihe ime mmụọ, kamakwa iji nye ndụmọdụ ọjọọ, gbasaa asịrị na ihe ọmụma na-abụghị eziokwu, iji kụnye echiche na-ezighị ezi n’obi, iji welite ajụjụ ma mee ka e nwee obi abụọ ndị na-ekpu okwukwe ụfọdụ ndị ihu, na iji gbasaa nkọwa onwe onye nke Akwụkwọ Nsọ. N’ile ha anya n’elu elu, ihe ọmụma ụfọdụ pụrụ iyi ka ha na-adọrọ mmasị ma na-enye ihe ọmụma, ma ha pụkwara inwe ihe ndị na-egbu egbu. Ndị Kraịst na-elegara “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” anya maka nri ime mmụọ nke na-abịa n’oge ha nakwa maka nkọwa. (Lee Ụlọ Nche nke July 1, 1994, peeji nke 9-11.) Onye Kraịst nwere ibu ọrụ siri ike nke ichekwa okwukwe ya megide mmetụta ndị na-emerụ emerụ, ma karịsịa, o kwesịrị ịmata mgbe nile onye ya na ya na-akpakọrịta.—Mat. 24:45-47; 2 Jọn 10, 11.

10 Otu isiokwu Ụlọ Nche ahụ mesikwara ike mkpa ọ dị irubere iwu mmepụtaghachi isi. Ihe ka ọtụtụ n’ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ma na-ere ihe omume kọmputa na-ekwu ka a nata ha ikike tupu e mepụtaghachi ha, ha na-enyekwa akwụkwọ ikike nke na-ekwu otú a pụrụ isi jiri ihe omume ndị ahụ mee ihe n’ụzọ iwu kwadoro. Akwụkwọ ikike ahụ na-ekwukarị na onye nwe ya agaghị emepụtara onye ọzọ ihe omume ahụ; n’ikwu eziokwu, iwu mmepụtaghachi nke mba nile megidere ime otú ahụ. Ọtụtụ ndị anyaukwu adịghị eche na ọ dị ihe o mere ma ha mebie iwu ahụ. Otú ọ dị, Ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya n’okwu ndị metụtara iwu, na-akwụghachi Siza ihe nke Siza.—Mat. 22:21; Rom 13:1.

11 Nnukwu ụlọ ọrụ ụfọdụ na-ere kọmputa ndị e tinyere ihe omume ndị nwere akwụkwọ ikike n’ime ha. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-ere kọmputa adịghị enye akwụkwọ ikike n’ihi na iwu akwadoghị ihe omume ndị ha tinyere n’ime kọmputa ndị ahụ, nke pụtara na onye ọ bụla zụrụ ya na-emebikwa iwu site n’iji ihe omume ndị ahụ na-eme ihe. N’ihe banyere nke a, Ndị Kraịst kwesịrị izere itinye ma ọ bụ iwepụta ihe ọ bụla a na-enyeghị ikike ka e mepụtaghachi ya n’ebe ndị a na-edebe ihe ọmụma maka ọha na eze n’Intanet bụ́ nke a chọrọ ka a na-anata ikike tupu a na-emepụtaghachi ya (dị ka e si eme mbipụta dị iche iche nke Society), bụ́kwa nke a na-emepụtaghachi n’anataghị ikike iwu kwadoro site n’aka ndị nwe ya.—Hib. 13:18.

12 E kwesịrị ịtụ uru na ọghọm ndị na-adịkarị n’iji nkà na ụzụ ọ bụla eme ihe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Dị nnọọ ka a pụrụ iji telivishọn mee ihe n’ụzọ bara uru, mmetụta na-adịghị mma ọ na-enwe n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ taa emewo ka ọbụna ndị edemede nke ụwa gosipụta nchegbu ndị siri ike. Usoro kọmputa gbasaruru n’ụwa nile, ọ pụkwara iwebata imerime ihe ọmụma ndị bara uru n’ebe obibi ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ. Kọmputa na-enyere ndị ọchụ nta ego na ụlọ ọrụ dị iche iche, gụnyere ndị mmadụ n’otu n’otu aka n’ụzọ dị ukwuu, bụ́ ndị chọrọ ka ihe nke onwe ha na ihe ndị metụtara azụmahịa ha nọgide soro ọgbọ a ihe na-aga ngwa ngwa nke anyị bi na ya na-aga ụkwụ na ụkwụ. N’otu mgbe ahụ, usoro kọmputa nwere nsogbu ndị dị ka ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, okwu nduhie ndị na-akpata ịkpọasị na nkewa, na ihe ọmụma dị ukwuu banyere ime omume ọjọọ ndị rụrụ arụ.

13 N’ihi ya, ọ dị ọtụtụ ihe ndị dị mkpa mere Onye Kraịst na-aghaghị iji nwee echiche ziri ezi banyere iji kọmputa eme ihe. Ọtụtụ ndị na-eji Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, mpịakọta Insight, na ihe omume kọmputa bụ́ GetVerse eme ihe, bụ́ ndị nzukọ a tinyere na diskette kọmputa. Ndị ọzọ eritewokwa uru site n’iji Watchtower Library nke dị na CD-ROM, bụ́ nke e tinyekwuru ihe ndị e ji eme nnyocha n’ime ya, na-eme ihe. Ka ọ na-eburu uru nke otu ihe e ji nkà na ụzụ mepụta n’obi, onye na-eji nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ dị otú ahụ eme ihe ndị bara uru kwesịkwara ịnọ na nche iji chebe onwe ya na ndị ọzọ pụọ n’akụkụ ndị na-adịghị mma. Ọ dị anyị mkpa ịdị na-enwe echiche ziri ezi, ka ọbụna iji nkà na ụzụ eme ihe n’ụzọ na-adịghị emerụ ahụ́, ghara iwere oge gabigara ókè site n’oge anyị raara nye ma ọ bụ dọpụ uche anyị n’ọrụ anyị bụ́ isi na ihe mgbaru ọsọ anyị.—Mat. 6:22; 28:19, 20.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya