Ihe Bara Uru Na-enye Aka ná Nsụgharị
JEHOVA CHINEKE, bụ́ Onye chepụtara Bible, chọrọ ka a kpọsaa ozi ọma Alaeze ya ‘nye mba na ebo na asụsụ na ndị ọ bụla.’ (Mkpughe 14:6) Ọ chọrọ ka ọ dịrị ihe nile a kpọrọ mmadụ mfe inweta Okwu ya e dere ede. Iji mezuo nke ahụ, a sụgharịala Bible gaa n’ọtụtụ asụsụ karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ dị n’ụwa. Ọtụtụ puku ndị nsụgharị etinyela oge na mgbalị dị ukwuu n’ịsụgharị echiche Chineke gaa n’asụsụ ọzọ.
Ma Bible abụghị nanị ihe a na-asụgharị asụgharị. Mgbe mgbe, e jirila ya mee ihe dị ka ihe enyemaka n’ịsụgharị akwụkwọ ndị ọzọ. Ọtụtụ ndị nsụgharị atụleela otú e si sụgharịa okwu ndị dị na Bible n’asụsụ dị iche iche iji nyere ha aka ịsụgharị okwu ụfọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’ihi otú Bible si enye aka n’ime nsụgharị, e jirila ya mee ihe ugbu a ná nsụgharị kọmputa na-eme.
O siri nnọọ ike kọmputa ime nsụgharị. Ụfọdụ ndị ọkachamara echeedịla na kọmputa agaghị arụli ọrụ nsụgharị. N’ihi gịnị? Asụsụ abụghị ìgwè okwu nkịtị. Asụsụ ọ bụla nwere usoro okwu nke ya, iwu ndị na-achịkwa ya, ihe ndị iwu ahụ pụrụ ịnabata, akpaala okwu na okwu nrụtụaka ndị nke ya. Mgbalị ndị e mere ịkụziri kọmputa ihe a nile arụpụtabeghị nnukwu ihe. Ihe ka ọtụtụ ná nsụgharị ndị kọmputa mere na-esi nnọọ ike nghọta.
Otú ọ dị, ugbu a, ndị ọkà mmụta sayensị nke kọmputa na-anwale ụzọ ọhụrụ ndị ọzọ. Onye kasị bụrụ ọkachamara n’iji kọmputa eme nsụgharị bụ́ Franz Josef Och na-ekwu, sị: “N’usoro a, anyị na-eji ihe ndị a sụgharịrịla asụgharị eme ihe iji chọpụta nsụgharị ga-akasị kwesị ekwesị.” Ka anyị were ya na ị chọrọ ịsụgharị asụsụ Hindi gaa n’asụsụ Bekee. Ihe mbụ ị ga-eme bụ inweta ihe odide e nwere n’asụsụ abụọ ahụ. Ị ga-etinyezi ha na kọmputa. Kọmputa ga-eji ihe odide abụọ ahụ tụnyere ibe ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mgbe ọ bụla kọmputa ahụ hụrụ otu okwu Hindi n’ebe dị iche iche, ya ahụ okwu Bekee bụ́ “house (ụlọ),” kọmputa ahụ na-ekpebi na okwu Hindi ahụ aghaghị ịbụ ihe okwu Bekee ahụ bụ́ “house” pụtara. O nwekwara ike ịbụ na okwu ndị dịdebere okwu ahụ bụ nkọwaaha, dị ka “nnukwu,” “obere,” “ochie,” ma ọ bụ “ọhụrụ.” N’ihi ya, kọmputa ahụ na-enweta ọtụtụ okwu ndị ha na ibe ha bụ otu ihe. Mgbe “ọzụzụ” dị otú ahụ, nke pụrụ iwe ụbọchị ole na ole ma ọ bụ ihe karịrị otu izu gasịrị, kọmputa ahụ pụziri iji ihe ọ “mụtara” sụgharịa ihe ọhụrụ e nyere ya. Ọ bụ ezie na nsụgharị ahụ nwere ike ọ gaghị ekwekọcha n’ụtọ asụsụ na otú e si ede asụsụ ahụ, a na-enwekarị ike ịgụ ya ma ghọta ihe a na-ekwu na isi ihe ndị dị mkpa.
Ihe bụ́ isi na-ekpebi otú nsụgharị ahụ ga-adịru mma bụ otú ihe odide ndị e buru ụzọ tinye na kọmputa ahụ hà, na otú e si sụgharịa ihe odide ndị ahụ e tinyere. Nke a bụkwa ebe Bible na-enweghị atụ. E jirila nlezianya sụgharịa ya gaa n’ọtụtụ asụsụ, onye ọ bụla pụrụ inweta ya n’ụzọ dị mfe, ihe odide ya bukwara ibu. N’ihi ya, ọ bụ Bible bụ ihe odide mbụ ndị nchọpụta na-eji eme ihe mgbe ha na-akụziri kọmputa asụsụ ọhụrụ.