Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/96 p. 1
  • Jiri Obi Gị Dum!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Obi Gị Dum!
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Na-eji Ozi Gị Sitere ná Mkpụrụ Obi Dum Akpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • M Ji Obi M Niile Na-efe Jehova
    Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ
  • Jiri Mkpụrụ Obi Gị Dum Fee Jehova
    Bụkuo Jehova Abụ
  • Ị Ga-agbali Àmà n’Oge Ị Na-anọghị n’Ozi!
    Ozi Alaeze Anyi—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 5/96 p. 1

Jiri Obi Gị Dum!

1 Anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji nwee ekele n’ebe Jehova nọ. Ndị a na-agụnye ihe ndị o meworo n’oge gara aga, ndị ọ na-eme ugbu a, na ndị ọ gaje imere anyị n’ọdịnihu. Gịnị ka obi ekele anyị kwesịrị ịkwali anyị ime? Otu abụ Devid na-aza, sị: “M ga-agọzi Jehova na mgbe nile: mgbe nile ka otuto Ya ga-adị n’ọnụ m.”—Abụ Ọma 34:1.

2 Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na e nyere anyị iwu ime nkwusa. Nke a bụ ọrụ anyị na-arụ ‘site ná mkpụrụ obi anyị dum dị ka a na-arụrụ Onyenwe anyị ọrụ.’ (Kọl. 3:23) Olee ókè anyị ga-eme n’ozi ahụ ma ọ bụrụ na anyị ji obi anyị dum? Mgbe anyị tụlere ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ, n’ezie obi anyị na-akwali anyị ikere òkè sitere n’obi n’ịgwa ndị ọzọ banyere ya na nzube ya ndị dị oké ọnụ ahịa! A na-akwali anyị ime ihe anyị pụrụ ime.

3 Ọ ga-abụ ihe ezi uche dị n’ime ya ịtụ anya na onye ji obi ya dum eje ozi chọrọ ịtụkwasị uche ya n’ozi dị nsọ. Ọbụ abụ ahụ, onye o doro anya na o nwere mmetụta dị otú ahụ, kwupụtara, sị: “Ugbo asaa n’ụbọchị ka m toworo Gị.” (Abụ Ọma 119:164) Ndị nwere mmetụta yiri nke ọbụ abụ ahụ na-achọ iji ohere ndị dịnụ mee ihe iji too Jehova. Dị ka ọnọdụ ha nyere ohere ya, ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ruo n’ókè o kwere mee.

4 Ohere Iji Too Jehova Gbara Anyị Gburugburu: Ọ bụghị iwu na anyị ga-echere ruo mgbe anyị na-ekere òkè n’ozi ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ tupu anyị ekwusaa ozi ọma. Ndị ọrụ ibe anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị ikwu, na ndị a maara nke ọma, ọ dị ha nile mkpa ịnụ ozi Alaeze. Mgbe anyị na-eme njem, anyị pụrụ ịmalite mkparịta ụka nke pụrụ iduga n’ịgbara ndị gị na ha bakọrọ ụgbọ ala, ndị na-arụ ọrụ na họtel, ụlọ nri, ndị na-arụ ọrụ n’ebe a na-ere mmanụ ụgbọ ala, ma ọ bụ ndị na-anya tagzi àmà. Mgbe anyị nọ n’ụlọ, anyị pụrụ ịgbara ndị agbata obi ma ọ bụ ndị ọbịa àmà. Ọ bụrụ na e nyere anyị àkwà n’ụlọ ọgwụ, e nwere ndị nọọsụ, ndị dọkịta, na ndị ọrịa ndị ọzọ anyị pụrụ ikwusara ozi ọma n’ụzọ mberede.

5 Ịgba Àmà Mberede Na-arụpụta Ihe: Otu ụbọchị Ndịàmà abụọ na-aga ije n’otu ogige wee malite isoro otu nwa okorobịa ya na nwa ya na-akpagharị akparịta ụka. N’ikpeazụ, ya na nwunye ya natara eziokwu ahụ. Nwa okorobịa ahụ mesịrị mee ka a mata na nanị ná mkpirikpi oge tupu o zute Ndịàmà abụọ ahụ, o kpegaworo Chineke ekpere, na-arịọ sị, ‘Ọ bụrụ na ị dị adị, biko kwere ka m mata gị.’ O na-ele nzute ahụ e zutere ya n’ogige ahụ dị ka azịza Jehova nye ekpere ya.

6 Ndị ji obi ha nile na-achọ inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ na-enwe ọṅụ dị ukwuu. Ha matara na ozi dị otú ahụ, site ‘n’obi zuru okè,’ na-atọ Jehova ụtọ.—1 Ihe Eme. 28:9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya