Igbe Ajụjụ
◼ Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe anyị na-edegara ndị nwe ụlọ anyị na-enweghị ike inweta n’ụlọ akwụkwọ ozi?
N’ihi ihe dịgasị iche iche, n’ebe ụfọdụ ọ na-esiwanyere anyị ike inweta ndị mmadụ mgbe anyị gara n’ụlọ ha. Ụfọdụ ndị nkwusa ahụwo ide akwụkwọ ozi dị ka ụzọ dị irè iji rute ha. Ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịrụpụta ezi ihe ụfọdụ, ọ dị mkpa ịtụle ụfọdụ ihe ncheta ndị pụrụ inyere anyị aka izere ihe isi ike ụfọdụ:
Ejila adres Society ezipụ ozi. Nke a pụrụ igosi n’ụzọ na-ezighị ezi na e si n’ọfịs anyị zipụ akwụkwọ ozi ahụ, na-akpata nsogbu na-adịghị mkpa, mgbe ụfọdụkwa, mmefu ndị ọzọ.
Jiri n’aka na i nwere adres ziri ezi na stamp zuru ezu.
Ezigala akwụkwọ ozi nye “Onye Obibi”; jiri otu aha kpọmkwem mee ihe.
Ahapụla akwụkwọ ozi n’ọnụ ụzọ mgbe mmadụ na-anọghị n’ụlọ.
Akwụkwọ ozi ndị dị nkenke kasị mma. Tinye otu traktị karịa ịnwa ide ozi dị ogologo.
Akwụkwọ ozi ndị e ji ígwè typewriter dee ka nnọọ mfe ịgụ ma na-emekwa ka e nwee mmetụta ka mma.
A dịghị agụ akwụkwọ ozi dị ka nletaghachi ọ gwụla ma i buruwo ụzọ gbaara onye ahụ àmà.
Ọ bụrụ na ị na-edegara onye gosibuworo mmasị akwụkwọ ozi, i kwesịrị idenye adres ma ọ bụ nọmba fon ka e wee nwee ike inweta gị. Kọwaa usoro ọmụmụ Bible anyị
Kpọọ ya òkù ịbịa nzukọ nke ọgbakọ dị n’ebe ahụ. Denye adres na oge nzukọ.
Anọgidela na-eziga akwụkwọ ozi n’ebe obibi a na-enwetaghị mmadụ mgbe i nyeghachisịrị ókèala ahụ; onye nkwusa nwe ókèala ahụ n’oge ahụ ka ọ dị n’aka ịrụ ya.