Igbe Ajụjụ
◼ Gịnị mere o ji dị mkpa ịkpachara anya mgbe e ji akwụkwọ ozi na-agba àmà?
Iji akwụkwọ ozi na-agba àmà bụ ụzọ a nwapụtaworo nke dị irè isi na-ezisa ozi ọma. Otú ọ dị, ihe ndị mere na nso nso a n’ụwa emewo ka ndị mmadụ na-akpachara anya banyere imepe akwụkwọ ozi sitere n’aka ndị ha na-amabughị. A na-enyokarị envelopu a na-amaghị ndị zitere ha ma ọ bụ ndị na-enweghị adres nzighachi ozi enyo, karịsịa ma ọ bụrụ na e ji aka dee ihe n’elu ha ma ọ bụ na ihe fulitere afụlite dị n’ime ha. Ndị nwe ụlọ pụrụ ịtụfu akwụkwọ ozi dị otú ahụ n’emepeghị ya emepe. Olee otú anyị pụrụ isi gbochie nke a ime?
Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, e kwesịrị iji ígwè typewriter dee ihe ma n’akwụkwọ ozi ahụ ma n’elu envelopu. E kwesịrị ide aha onye nwe ụlọ kpọmkwem n’elu envelopu. Edegarala ya “Onye bi ebe a.” Ọzọkwa, n’oge ọ bụla, denye adres nzighachi ozi. Ọ bụrụ na ọ bụghị ihe amamihe dị na ya idenye adres gị, dee aha gị na adres Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ezipụla akwụkwọ n’edenyeghị aha gị. Ya adịla mgbe ị ga-eji adres alaka ụlọ ọrụ mee ihe.—Lee Igbe Ajụjụ nke Ozi Alaeze Anyị nke November 1996.
A pụrụ ịhụ aro ndị ọzọ nakwa akwụkwọ ozi ihe atụ n’akwụkwọ bụ́ Rite Uru ná Mmuta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, Peeji nke 71-73. Ụkpụrụ nduzi ndị a nakwa ndị dị n’akwụkwọ bụ́ Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ Ije-ozi Ọchichi-Chineke, peeji nke 102-103, ga-enyere anyị aka iji akwụkwọ ozi na-eme ihe n’ụzọ dị irè iji mee ka ozi ọma ahụ rute ndị ọzọ.