Ngọzi Ndị Na-esite n’Igosi Ekele Maka Ịhụnanya Jehova—Akụkụ nke 2
1 N’ihe omume tụlere isiokwu a n’ọnwa gara aga, anyị mere ka ụzọ anọ anyị pụrụ isi gosi ekele maka ịhụnanya Jehova n’ozi pụta ìhè. (1 Jọn 4:9-11) N’isiokwu a, anyị ga-agbakwụnye ụzọ ise ọzọ isi mee nke a. Mgbe anyị na-ekere òkè n’ụzọ zuru ezu n’inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ, ọ na-ewetara anyị obi ụtọ.
2 Ịgba Àmà Mberede: Nke a bụ ụzọ dị irè isi chọta ndị agụụ eziokwu ahụ na-agụ na ndị akpịrị na-akpọ nkụ maka ya nakwa isi nyefee ha akwụkwọ ndị bara uru. Ọ bara uru ‘ịzụchapụta oge’ ma na-agbakwa àmà mgbe nile nye onye ọ bụla anyị zutere. (Efe. 5:16) Ọ pụrụ ịbụ na anyị aghaghị iji obi ike mee ihe iji gbaa àmà n’ụzọ dị otú a, ma ọ bụrụ na anyị nwere ekele maka ịhụnanya Chineke ma mata mkpa ndị mmadụ, anyị ga na-agba àmà n’ohere ọ bụla dapụtaranụ.—2 Tim. 1:7, 8.
3 A gọziri otu onye ozi ala ọzọ n’ụba maka ịmalite mkparịta ụka n’etiti ya na onye ya na ya nọ na tagzi. Nwoke ahụ gosiri mmasị. Ọ gaara ya nletaghachi, malitekwara ya ọmụmụ Bible. Nwoke ahụ batara n’eziokwu ma nwee ọganihu ruo n’ókè nke ịghọ okenye ọgbakọ!
4 Ide Akwụkwọ Ozi: Ikekwe anyị enweghị ike ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ihi ahụ adịghị ike ma ọ bụ ihu igwe na-adịghị mma. Anyị pụrụ ide akwụkwọ ozi, na-eji akwụkwọ ozi agba àmà n’ụzọ dị nkenke nye ndị anyị maara, ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ, ma ọ bụ ndị na-anọghị n’ụlọ n’ókèala anyị. Anyị pụrụ itinyekọta otu n’ime traktị anyị ndị bịara n’oge ha bụ́ ndị nwere ozi ndị na-adọrọ mmasị ndị dabeere na Bible ma gbaa onye anyị zigaara ya ume ịzaghachi ma ọ bụrụ na o nwee ajụjụ ọ bụla. Denye adres gị ma ọ bụ nke Ụlọ Nzukọ Alaeze na ya; biko edenyela adres alaka ụlọ ọrụ.
5 Iji Telifon Agba Àmà: Nke a bụ ụzọ magburu onwe ya isi jekwuru ndị anyị na-enweghị ike izute n’ọrụ ụlọ n’ụlọ. Ọ bụrụ na anyị ejiri ezi uche, obiọma, akọ, na nkà mee ya, anyị pụrụ inweta nzaghachi dị nnọọ mma. Ozi Alaeze Anyị nke February 2001, peeji nke 5-6, na-atụ aro ndị bara uru banyere ụzọ a ga-esi rụpụta ihe kasị mma.
6 Mgbe otu nwanna nwanyị ji telifon na-agba àmà, ọ jụrụ otu nwanyị ma ò chewo nnọọ echiche banyere ihe ọdịnihu ga-abụrụ ya na ezinụlọ ya. Nwanyị ahụ kwuru na ya echewo. O kwuru na n’ihi obi nkoropụ ya nwere, na ya ekewapụwo onwe ya iche n’ụlọ. N’ịbụ onye ezi nchebara echiche nke nwanna nwanyị ahụ kwaliri, nwanyị ahụ kwetara izute ya n’otu ahịa dị nso. N’ihi ya, nwanyị ahụ nakweere ọmụmụ Bible ngwa ngwa!
7 Ịnabata Ndị Ọbịa: Ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya, anyị ga-amụrụ anya n’ịmata onye ọ bụla anyị na-amabughị nke bịara n’ebe anyị na-anọ enwe nzukọ, anyị ga-emekwa ka ahụ ruo ya ala. (Rom 15:7) Mee ka ọ hụ na ọ nọ n’etiti ndị nwere ezi mmasị n’ọdịmma ime mmụọ ya. Ezi nchebara echiche anyị na njikere anyị dị iduziri ya ọmụmụ Bible pụrụ ịkwali ya ịnabata enyemaka anyị.
8 Àgwà Ọma Anyị: Site n’àgwà ọma anyị, anyị na-achọ eziokwu ahụ mma. (Taị. 2:10) Mgbe ndị nọ n’ụwa kwuru okwu ọma banyere anyị dị ka Ndịàmà Jehova, ha na-ewetara Chineke anyị nsọpụrụ. (1 Pita 2:12) Nke a kwa pụrụ inyere ndị ọzọ aka ịmalite ịgbaso ụzọ nke ndụ.
9 Gịnị ma ị tụlee ụzọ ise ndị a anyị ga-esi na-egosi ekele maka oké ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ ma na-etinye ha n’ọrụ? (1 Jọn 4:16) Ka ị na-eme otú ahụ, ị ga-enweta ọtụtụ ngọzi.