Ngọzi Ndị Na-esite n’Igosi Ekele Maka Ịhụnanya Jehova—Akụkụ nke 1
1 Jọn onyeozi dere, sị: “Anyị onwe anyị na-ahụ n’anya, n’ihi na Ya onwe ya [Jehova] buru ụzọ hụ anyị n’anya.” (1 Jọn 4:19) Mgbe anyị chere banyere ihe nile Jehova nyeworo anyị, a na-akwali anyị igosi ya ekele miri emi. Jisọs gosiri ihe nlereanya n’ime nke a site n’iji nrubeisi na-agba àmà banyere Alaeze na aha Chineke. (Jọn 14:31) Anyị ga-eme nke ọma ịtụle ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi gosi ekele maka ịhụnanya Jehova na ngọzi ndị ọ na-eweta.
2 Ịga Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ: Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ụzọ ha ga-esi na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. Ntụziaka ya na-egosi n’ụzọ doro anya na ha gara site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-agbasa ozi ọma ahụ. (Luk 9:1-6; 10:1-7) Ọ chọrọ inwe ịhụnanya n’ebe Chineke nọ nakwa n’ebe ndị agbata obi anyị nọ iji nọgide na-aga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ mgbe anyị zutere enweghị mmasị na mmegide. Otú ọ dị, site n’ime otú ahụ, anyị ga-erite uru n’onwe anyị n’ihi na okwukwe anyị ga-esi ike karị, nkwenye anyị ga-esi ike karị, olileanya anyị ga na-egbukekwa egbuke karị.
3 N’ịrụ ọrụ n’okpuru nduzi nke ndị mmụọ ozi, anyị achọtawo ọtụtụ ndị agụụ eziokwu ahụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ya. (Mkpu. 14:6) Ndị nwe ụlọ ekwuwo na ha anọwo na-ekpe ekpere maka enyemaka mgbe Onyeàmà bịara n’ụlọ ha. Ndịàmà abụọ na otu nwatakịrị nọ na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’otu àgwàetiti Caribbean. Mgbe ndị ahụ toworo eto kpebiri na ha ga-emechi maka ụbọchị ahụ, nwatakịrị ahụ gara n’ihu nanị ya jee n’ụlọ na-esonụ ma kụọ aka. Otu nwa agbọghọ mepere ụzọ. Mgbe ndị ahụ toworo eto hụrụ nke a, ha gakwuuru ya wee gwa ya okwu. Ọ kpọbatara ha n’ụlọ ma kọwaa na ya nọrịị na-ekpe ekpere ka Chineke zite Ndịàmà ka ha kụziere ya Bible!
4 Ịgba Àmà Okporo Ámá: Ebe ọ bụ na o siri nnọọ ike n’ebe ụfọdụ ịchọta ndị mmadụ n’ụlọ, ịgba àmà okporo ámá bụ ụzọ dị irè isi gbaara ndị mmadụ àmà. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị bi n’ụlọ ndị nwere oké ihe nchebe bụ́ ebe anyị na-apụghị ịga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ. Otú ọ dị, ekele anyị nwere maka ịhụnanya Jehova na-akwali anyị ime ihe n’ụzọ ọ bụla kwere omume, gụnyere ịgba àmà mberede, iji jiri ozi Alaeze ahụ kpọtụrụ ndị mmadụ.—Ilu 1:20, 21.
5 Ime Nletaghachi: Ebe ọ bụ na anyị na-achọ ndị “maara mkpa nke ime mmụọ ha,” anyị kwesịrị ime ihe anyị nwere ike ime iji gboo mkpa ahụ. (Mat. 5:3, NW) Nke ahụ na-achọ anyị ịlaghachi iji gbaa mkpụrụ nke eziokwu ahụ anyị kụrụ mmiri. (1 Kọr. 3:6-8) Otu nwanna nwanyị nọ n’Australia tinyere otu traktị n’aka otu nwanyị yiri ka ò nwechaghị mmasị. Otú ọ dị, nwanna nwanyị ahụ nọgidere na-agbalị ịchọtaghachi ụlọ ya. Mgbe o mesịrị kpọtụrụ ya, nwanna anyị nwanyị chọpụtara na mgbe o letasịrị ya nke mbụ, nwanyị ahụ zụtara otu Bible dị oké ọnụ. Nwanna nwanyị ahụ malitere ịmụrụ ya ihe!
6 Iduzi Ọmụmụ Bible: Nke a pụrụ ịbụ akụkụ nke ozi anyị nke kasị enye ọṅụ ma na-akwụghachi ụgwọ. Lee ngọzi ọ bụ inyere ndị mmadụ aka ịmụta banyere Jehova, ịhụ ka ha mere mgbanwe ná ndụ ha iji mee ihe na-atọ ya ụtọ, mgbe ahụkwa ịhụ mgbe a na-eme ha baptism dị ka ndị Kraịst ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha nye Chineke!—1 Tesa. 2:20; 3 Jọn 4.
7 Ná mbipụta na-esonụ, anyị ga-atụle ụzọ ndị ọzọ e si agọzi anyị maka igosi ekele maka ịhụnanya Jehova.