A Na-enyeghachi Ikwesị Ntụkwasị Obi Ụgwọ Ọrụ
1 Ná Ndị Hibru 11:6 a gwara anyị na Chineke bụ “Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” Otu ụzọ o si enyeghachi ndị ohu ya raara onwe ha nye ụgwọ ọrụ bụ́ ndị ‘kwesịworo ka a tụkwasị ha obi n’ụmụ ihe ole na ole’ bụ site ‘n’ime ha ndị isi ọtụtụ ihe.’ (Mat. 25:23) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Jehova na-enyeghachikarị ụgwọ ọrụ maka ezi ọrụ site n’inye ndị àmà ya kwesịrị ntụkwasị obi ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ.
2 E nyeghachiri ikwesị ntụkwasị obi nke Pọl onyeozi ụgwọ ọrụ site na ya ịbụ onye e kenyere ozi nke kpọgara ya n’obodo ukwu na n’obodo nta dị iche iche nke Europe na Asia Minor. (1 Tim. 1:12) Ọ bụ ezie na ọ gụnyere mgbalị dị ukwuu n’ijezu ozi ya, Pọl jiri ihe ùgwù o nwetara kpọrọ ihe nke ukwuu. (Rom 11:13; Kọl. 1:25) O gosiri ekele ya sitere n’obi site n’iji ezi obi chọọ ohere maka ime nkwusa. Site n’ọrụ ịnụ ọkụ n’obi ya, o gosiri n’ụzọ doro anya na ọ na-ebi ndụ n’okwukwe. Ihe nlereanya ya na-akwali anyị iji ihe ùgwù ije ozi anyị dị iche iche kpọrọ ihe.
3 Jehova Enyewo Anyị Ozi: Olee otú anyị si egosi otu ụzọ ile ihe anya ahụ banyere ụgwọ ọrụ bụ́ ihe ùgwù nke Pọl gosiri? Anyị na-achọ ụzọ dị iche iche isi mụbaa òkè anyị n’ozi ahụ. Anyị na-eji ohere ọ bụla agba àmà mberede nakwa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ. Anyị na-esochi ndị nile na-anọghị n’ụlọ ma mee nletaghachi na nke ndị nile nwere mmasị. Anyị na-edebekwa àgbà ndị anyị yiri iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi.
4 Banyere ozi anyị, Pọl dụrụ ọdụ, sị: “Tụkwasị uche n’ọrụ gị.” (2 Tim. 4:2) Ihe dị ngwa na-achọ ime ihe ozugbo. Ànyị na-eje ozi anyị n’ụzọ dị ngwa, na-enye ya ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị? Dị ka ihe atụ, anyị agaghị achọ ikwe ka ihe omume ntụrụndụ na nchụso onwe onye ndị ọzọ ná ngwụsị izu weghara oge anyị kwesịrị itinye n’ozi ubi. Ebe o doro anyị anya na ọgwụgwụ nke usoro ihe a na-abịa ọsọ ọsọ, anyị kwenyesikwara ike na ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ bụ ọrụ kasị mkpa anyị pụrụ ịrụ.
5 Ihe na-aka ikwesị ntụkwasị obi anyị nye Chineke akara bụ ịnọgide n’akụkụ ya na anyị iguzosi ike n’ihe nye ya na ịnọ mgbe nile n’ọrụ o kenyere anyị. Ka anyị jezuo ozi anyị, ka Jehova wee nyeghachi anyị ụgwọ ọrụ n’ụba maka ikwesị ntụkwasị obi anyị.