Gbalịa Ka I Ruo Eruo Ịrụkwu Ọrụ Ndị Ọzọ Metụtara Ozi Anyị
1 Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha na-eje ije n’ụzọ Chineke ma “nọgide na-eme ya n’ụzọ zuru ezu karị.” (1 Tesa. 4:1) Gịnị ka nke a chọrọ anyị n’aka? Otu ihe nke a chọrọ anyị n’aka bụ ịdị na-achọ otú anyị ga-esi ruo eruo ịrụkwu ọrụ ndị ọzọ metụtara ofufe anyị na-efe Chineke, na-ahụ mgbe nile na anyị ‘na-eje ozi anyị n’ụzọ zuru ezu.’—2 Tim. 4:5.
2 Ebumnobi Anyị: Ihe mere anyị ji agbalị ka anyị ruo eruo ịrụkwu ọrụ ndị ọzọ metụtara ozi anyị bụ n’ihi na ọ na-agụ anyị agụụ ijere Onye kere anyị ozi n’ụzọ zuru ezu karị. Anyị chọrọ ito eto n’ụzọ ime mmụọ. Anyị na-achọkwa ụzọ anyị ga-esi na-emekwu nke ọma n’ozi anyị. Ọ bụrụ na anyị ahazie ihe omume anyị nke ọma ma nwee ebumnobi dị mma, ọ ga-enyere anyị aka iru ihe mgbaru ọsọ anyị ndị metụtara ofufe anyị.—Ọma 1:1, 2; Fil. 4:6; Hib. 10:24, 25.
3 Ka anyị wee nwee ike ịrụkwu ọrụ ndị ọzọ metụtara ozi anyị, ọ dị anyị mkpa inwe mmụọ inye ihe na nke ịchụ onwe onye n’àjà. Mmadụ nwere ike inweta mmụọ dị otú ahụ site n’ịtụgharị uche n’ihe nlereanya mara mma nke Jizọs, kpeekwa ekpere mgbe ọ na-eme nke a. (Mat. 20:28) N’oge nile Jizọs jere ozi ya, o nwetara ọṅụ dị ukwuu n’ijere ndị ọzọ ozi. (Ọrụ 20:35) Anyị nwere ike iṅomi Jizọs site n’ilekwasị anya n’ọdịmma nke ndị ọzọ ma dịrị njikere iji ohere ọ bụla dapụtaranụ na-agbalị ka anyị ruo eruo ịrụ ọrụ ndị ọzọ metụtara ozi anyị.—Aịsa. 6:8.
4 Ọrụ Dịịrị Ndị Nne na Nna: E nwere ike ịkụnye ọchịchọ ijere ndị ọzọ ozi na ịmụbakwu ozi anyị n’obi ụmụntakịrị mgbe ha ka dị obere. Ụmụaka na-ahụ otú ndị ezinụlọ ha si eji ozi ha akpọrọ ihe nakwa otú ha si agbalịsi ike ịmụbakwu ozi ha. Ihe kpaliri otu nwanna nwoke ịgbalị ka o ruo eruo ịrụ ọrụ ndị ọzọ metụtara ozi anyị mgbe ọ ka dị obere bụ n’ihi na ọ na-eso nna nne ya arụ ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ. Ka ọ hụrụ otú nna nne ya si agba mbọ n’ọrụ ndị ahụ, hụkwa ọṅụ ọ na-enweta, nke ahụ kpaliri ya ịchọ otú ọ ga-esi jeere ụmụnna ya ozi. Ọ bụ ohu na-eje ozi ugbu a.
5 A Chọrọ Ụmụnna Nwoke: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị iru eru . . . , agụụ ọrụ ọma na-agụ ya.” (1 Tim. 3:1) Okwu ndị a na-agba ụmụnna nwoke ume ịgbalị iru eru maka inwekwu ihe ùgwù ije ozi ná nzukọ Jehova. Ọ bụghị iwu na nwanna nwoke ga-enwe nkà pụrụ iche ma ọ bụ onyinye pụrụ iche tupu ya eruo eruo inwekwu ihe ùgwù ije ozi. Nwanna nwoke nke na-agbalị iru eru inwekwu ihe ùgwù ije ozi ga na-ebute Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ ya ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. (Mat. 6:33; 2 Tim. 4:5) Ọ ga-ahụ na ya na-esetịpụrụ ndị ọzọ ezigbo ihe nlereanya.
6 N’ụwa Nile: Jehova na-eme ka ọrụ ịchịkọta ndị mmadụ na-aga n’ike n’ike. (Aịsa. 60:22) Ọ dị oké mkpa ugbu a ka ndị nile na-eso ihe nlereanya Jizọs na-eje ozi ha n’ụzọ zuru ezu karị. Akụkọ ozi e nwetara n’ụwa nile maka afọ ije ozi 2006 gosiri na e mere narị puku mmadụ abụọ, puku iri anọ na asatọ, na narị atọ na iri abụọ na asaa baptizim. Ihe nke a pụtara bụ na n’ụbọchị ọ bụla, a na-enwe ihe karịrị narị ndị ọhụrụ isii na iri asatọ. Ka anyị nile nọgide na-achọ ụzọ anyị ga-esi na-eje ozi anyị n’ụzọ zuru ezu karị.