Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/99 p. 8
  • Ụzọ Isi Mụbaa Ozi Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Isi Mụbaa Ozi Gị
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Nwere Ike Isi Jekwuoro Jehova Ozi
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ị̀ Chọrọ Imekwu Ihe?
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Otú E Si Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Ị̀ Na-ejezu Ozi Gị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 5/99 p. 8

Ụzọ Isi Mụbaa Ozi Gị

1 Ihe karịrị afọ 40 gara aga, e bipụtara otu isiokwu a kpọrọ “Ị̀ Na-eme Ike Gị Nile?” n’Ụlọ Nche nke January 15, 1955 (Bekee). O ji ịhụnanya kọwapụta otú ọ pụrụ isi kwe ndị Jehova omume itinyekwu mgbalị n’otu n’otu n’ozi ahụ ka ha wee nwee ike ịmụba ọrụ Alaeze ha. Ndụmọdụ ahụ dị mma dịkwa irè taa, ka anyị na-anọgide na-eme ike anyị nile karị.

2 Ozi anyị nile kwesịrị ịbụ nke iwu ahụ kasị ukwu kpaliri nke bụ́: “Ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị, bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum, sitekwa ná mkpụrụ obi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum.” (Mak 12:30) Anyị na-egosipụta ịhụnanya zuru ezu anyị nwere maka Jehova site n’iji ohere ndị anyị nwere mee ihe n’ụzọ zuru ezu iji mee ka ọrụ Alaeze ya na-aga n’ihu. Tụlee ụzọ ndị na-esonụ ị pụrụ isi mụbaa ozi gị.

3 Buru Ibu Ọrụ Gị: Ụmụnna nwoke raara onwe ha nye pụrụ ime mgbalị siri ike iji ruo eruo dị ka ndị ohu na-eje ozi mgbe ahụ nwee ọganihu ruo n’ije ozi dị ka ndị okenye. Isiokwu bụ́ “Ị̀ Na-eme Mgbalị Iji Ruo Eru?” na “Ì Ruru Eru Ije Ozi?,” ndị dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke September 1, 1990, akpaliwo ọtụtụ ụmụnna nwoke iwepụta onwe ha maka ibu ọrụ ọgbakọ. Jụta ndị okenye ọgbakọ gị aro ndị a kapịrị ọnụ n’otú ị pụrụ isi ruo eruo.

4 A na-akpọ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-alụbeghị nwanyị òkù ichesi echiche ike banyere itinye akwụkwọ maka Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. Ị pụrụ ịmatakwu banyere ụlọ akwụkwọ a site n’ịgụ ebe ndị e zoro aka na ha n’okpuru isiokwu bụ́ “Ministerial Training School” (Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi) na Watch Tower Publications Index maka 1986-1995, 1996, na 1997. Ị̀ na-ahụ ka ‘ọnụ ụzọ ahụ dị ukwuu nke ịrụsi ọrụ ike’ na-emeghere gị? (1 Kọr. 16:9a) Ọtụtụ ụmụnna nwoke ndị banyeworo n’ime ya adịghị mgbe ha tụrụ anya ịhụ ihe ùgwù ije ozi nile dị na ya. Taa obi dị ha ụtọ ịdị na-eje ozi na Betel ma ọ bụ n’ubi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị ozi ala ọzọ, ma ọ bụ ndị nlekọta sekit.

5 Mee Mgbalị Iru Eru Maka Ozi Oge Nile: Ndị ntorobịa na-agụsị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, ndị odozi akụ̀, na onye ọ bụla laworo ezumike nká kwesịrị ichesi echiche ike banyere ịsụ ụzọ. Ọbụna ụmụnna bụ́ ndị o ji ego achụ ego na ndị ọrụ oyibo enwewo ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge nile, karịsịa ugbu a e gbubilataworo awa ole a chọrọ ha n’aka. Tụleghachi ihe ntinye dị n’Ozi Alaeze Anyị nke July 1998, mgbe ahụ soro ndị ọsụ ụzọ ọnọdụ ha ná ndụ yiri nke gị kwurịta okwu. Ọ pụrụ ịbụ na a ga-akpali gị ịmụba ozi gị site n’ịsụ ụzọ, dị ka ha na-eme. (1 Kọr. 11:1) Gịnị ka ọ ga-ewe iji mụbaa ozi gị iru awa 70 kwa ọnwa wee si otú a jee ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile?

6 Ugbu a ihe karịrị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị 17,000 na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ na ebe obibi Betel dị iche iche n’ụwa nile. Peji nke 116-118 nke Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị tụlere ihe ndị a chọrọ iji tinye akwụkwọ maka ozi dị otú ahụ. Gịnị ma ị gụọ ya n’onwe gị ma lee ma i nwere ike iru eru maka ihe ùgwù pụrụ iche nke ije ozi Betel?

7 Jee Ozi n’Ebe Mkpa Ka Ukwuu: Ì bi n’ebe a na-arụzukarị ókèala ya ma ọ bụ n’ebe e nwere ọtụtụ ụmụnna nwoke ga-ebu ibu? Ì chewo echiche banyere ịmụba ozi gị site n’ịkwaga ebe mkpa ka ukwuu? Ikekwe nkwapụ ahụ pụrụ ịbụ gaa n’ime obodo dị nso ebe a chọkwuru ndị ọrụ. (Mat. 9:37, 38) E kwesịghị ime nke a n’ọkụ n’ọkụ. O kwesịrị ka e jiri ekpere chebara ya echiche. (Luk 14:28-30) Soro ndị okenye na onye nlekọta sekit kwurịta banyere ọnọdụ gị. Ha ga-eso gị tụgharịa uche ma ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya ịkwapụ ugbu a ka ọ bụ ijikere iji mee otú ahụ n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na ị chọrọ idere Society akwụkwọ maka ịtụrụ gị aro ebe ị pụrụ ịkwaga, akwụkwọ ozi nke Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ gị bịanyere aka na ya aghaghị iso nke gị bịa.

8 Meziwanye Ọdịdị nke Ozi Gị: Ma eleghị anya anyị nile pụrụ ikere òkè n’ụzọ zuru ezu karị n’ozi ahụ site n’imeziwanye ọdịdị nke ozi ubi anyị. Ị̀ na-ekere òkè n’akụkụ nile nke ọrụ ahụ, gụnyere ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ na nke mberede, tinyere ọrụ ije nletaghachi na iduzi ọmụmụ Bible? Ọ bụrụ na ị na-eduzi ọmụmụ ihe, ị̀ pụrụ imeziwanye nkà izi ihe gị? Ọ ga-adị mma ịtụleghachi ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke June 1996 maka aro ndị ị pụrụ iji mee ihe iji kpalie ndị ị na-amụrụ ihe ime nraranye na baptism.

9 Ntụle sara mbara karị banyere ụzọ ndị anyị pụrụ isi mụbaa ma meziwanye ozi anyị dị n’isi nke 9 nke Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị. N’ezie anyị nile kwesịrị ịchọ ime ihe nile anyị nwere ike ime n’ozi Chineke. Gịnị ma i chesie echiche ike banyere ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ gị? Mee dị ka 1 Timoti 4:15 tụrụ aro ya: “Na-ejisi ike n’ihe ndị a; na-anọsi ike n’ime ha; ka ịga n’ihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ nile nọ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya