“Ọ̀ Dị Mgbe Mmadụ Nile Ga-ahụ Ibe Ha n’Anya?”
1 A gaje ịkpọsa otu ozi mara mma, na-akpali akpali, ma na-ekpo obi ọkụ gburugburu ụwa n’asụsụ 169. Gịnị bụ ozi a? Oleekwa ụzọ a ga-esi zisaa ya?
2 Ozi ahụ bụ banyere ịhụnanya ndị agbata obi. A ga-ahụ ya n’Akụkọ Alaeze nke 35, nke a kpọrọ “Ọ̀ Dị Mgbe Mmadụ Nile Ga-ahụ Ibe Ha n’Anya?” Akụkọ Alaeze a na-atụle ná mkpirikpi ọnọdụ dị ugbu a gburugburu ụwa, na-egosi na ọ bụ enweghị ịhụnanya n’etiti ụmụ mmadụ bụ isi ihe na-akpata oké obi mgbawa na ihe mgbu. Ọ na-akọwa ihe mere ịhụnanya ndị agbata obi jiworo belata n’ụbọchi anyị karịsịa, na ihe nke a pụtara maka ọdịnihu.
3 N’otu mgbe ahụ, Akụkọ Alaeze nke 35 na-egosi na ezigbo ịhụnanya ndị agbata obi dị n’etiti ọtụtụ nde ndị bi n’ụwa taa. Ọ na-eme ka a mara ndị na-ekere òkè ná ntụteghachi nke Iso Ụzọ Kraịst oge gboo—ofufe narị afọ mbụ, nke e ji ịhụnanya maka ndị agbata obi mara dị ka Jisọs Kraịst kụziri.—Luk 10:25-37.
4 Akụkọ Alaeze nke 35 ji nkọwa nke ụzọ ụwa dum nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-esi na-enwe ịhụnanya ndị agbata obi n’isi nso n’okpuru nlekọta nke Alaeze Chineke n’aka Kraịst wee mechie. A na-agba ndị na-agụ ozi a ume inweta broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma mụta ụzọ isi bụrụ akụkụ nke ndokwa ịhụnanya a zuru ụwa ọnụ a kọwara n’ụzọ sara mbara n’Okwu Chineke.
5 Olee Ndị Ga-ezi Ozi A? Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ga na-eso ndị ha maara, ndị agbata obi, na ndị ikwu ha na-ekerịta ozi a nke ịhụnanya ndị agbata obi n’ime ọnwa October na November. A na-agba ndị nile ruru eru ume ikere òkè ná nkesa ihu ọha nke Akụkọ Alaeze nke 35.
6 Ihe mgbaru ọsọ bụ isi nke mkpọsa a bụ ịkpali mmasị ndị mmadụ n’inwe ọmụmụ Bible n’ime broshuọ Na-achọ ma ọ bụ n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Ọzọkwa, mgbalị si n’obi dum n’akụkụ nke ohu ọ bụla nke Jehova ga-akpata ịgba àmà dị ukwuu nye Chineke nke ịhụnanya, bụ́ Jehova, na nye Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst.