Isoro Ndị Ọzọ Kerịta Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
1 Ezinụlọ bụ njikọ bụ isi nke ọha mmadụ, e sikwa n’ezinụlọ enweta obodo nta, obodo ukwu, steeti, na mba dị iche iche. Taa, njikọ ezinụlọ nọ ná nrụgide otú ọ na-adịbeghị na mbụ. Mmetụta ndị dị ike nọ n’ọrụ ugbu a na-eyi ịdị adị nke ndụ ezinụlọ egwu. Lee aha ekele anyị nwere na Jehova, Onye Omenkà nke ndokwa ezinụlọ, enyewo anyị ntụziaka ka anyị wee nwee ike inweta obi ụtọ ezinụlọ! Ndị na-eso ụkpụrụ nduzi ya na-achọpụta na nsogbu na-ebelata, na-arụpụtakwa njikọ ezinụlọ na-aga nke ọma. Na September anyị nwere ihe ùgwù nke isoro ndị ọzọ kerịta akwụkwọ ahụ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Buru ụzọ jekwuru ndị mmadụ n’isiokwu banyere ndụ ezinụlọ. Nwee omume enyi, echiche ziri ezi, na ezi izu. Gịnị ka ị pụrụ ikwu?
2 Ị pụrụ ịmalite site n’iwelite otu ajụjụ dị ka:
◼ “Ị̀ rịbawo ama na ọ na-esiri ọtụtụ ezinụlọ ike idi nrụgide nke ndụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Akụkọ na-egosi na ọtụtụ ndị mmadụ na-enweta ihe isi ike n’ụlọ. Gịnị ka i kwere ga-enyere ndị mmadụ aka ịchọta nkwụsi ike na obi ụtọ ka ukwuu? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ebe ọ bụ na Chineke guzobere ndokwa ezinụlọ, ọ́ gaghị abụ ihe ezi uche dị na ya inyocha ụkpụrụ nduzi nke o nyeworo? [Gụọ 2 Timoti 3:16, 17.] E depụtara ụdị ntụziaka ahụ bara uru n’ime akwụkwọ a, bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ.” Mgbe ahụ jụọ onye ahụ ihe o chere na-abụkarị nsogbu ezinụlọ, gosi isiakwụkwọ nke na-atụle nsogbu ahụ, nyefeekwa akwụkwọ ahụ n’ụtụ ₦55.
3 Ná nletaghachi, ị pụrụ ịchụso ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ Bible site n’ikwu, sị:
◼ “Echewo m echiche banyere ihe i kwuru n’isiokwu banyere ndụ ezinụlọ, ewetakwaara m gị ihe m chere ị ga-erite uru na ya. [Gosi broshuọ Na-achọ, sapeta peji nke 16, ma gụọ ajụjụ isii ahụ dị n’elu.] N’ụzọ doro anya, onye nke ọ bụla n’ime ezinụlọ aghaghị ime òkè nke ya ịtụnye ụtụ iji nweta obi ụtọ ezinụlọ. Ọ bụrụ na i nwere nanị minit ole na ole, m ga-egosi otú ị pụrụ isi rite uru kasịnụ site n’ihe ọmụma a.” Mgbe ahụ malite ịmụ ihe ọmụmụ nke 8. Nyefee broshuọ ahụ n’ụtụ ₦15.
4 Ụzọ ọzọ isi malite nkwurịta okwu bụ ikwu banyere otu nsogbu, ikekwe site n’ikwu, sị:
◼ “Ọ bụ ezie na onye ọ bụla chọrọ inwe echiche nke afọ ojuju, o yiri ka ọtụtụ ezinụlọ enwebeghị ihe ịga nke ọma n’ezie na nke a. Gịnị ka i chere ga-enyere ha aka ịchọta ezi obi ụtọ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ogologo oge gara aga, Bible kpughere ụdị nsogbu dị iche iche anyị ga-ahụ n’ime ezinụlọ taa. [Gụọ 2 Timoti 3:1-3.] Otú ọ dị, Bible na-agwakwa ezinụlọ ihe a ga-eme iji dozie nsogbu ndị a na iji nweta obi ụtọ na-adịgide adịgide. E gosiri ụkpụrụ ya n’akwụkwọ a, bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ.” Gosizie igbe ntụleghachi dị ná ngwụsị isiakwụkwọ kwesịrị ekwesị, gụọ ya, ma nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya.
5 Mgbe ị gaghachiri, jiri broshuọ “Na-achọ” ahụ malite ọmụmụ ihe. Ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Njikere ị dị inyocha ụkpụrụ Bible ndị metụtara ndụ ezinụlọ masịrị m. Ahụmahụ egosiwo na a na-enweta ihe kasị mma site n’ịgbaso ndụmọdụ dị irè a na-achọta na Bible. Lee nkọwa dị mfe banyere ihe mere o ji dị otú ahụ.” Gụọ paragraf nke mbụ nke ihe ọmụmụ nke 1 na broshuọ Na-achọ, gụnyere ma eleghị anya Abụ Ọma 1:1-3 ma ọ bụ Aịsaịa 48:17, 18. Ọ bụrụ na ohere ekwe, tụlee ihe fọdụrụnụ n’ihe ọmụmụ ahụ ma nyefee broshuọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya. Kwuo na ị ga-abịaghachi iji mụkọọ ihe ọmụmụ nke na-esonụ ọnụ.
6 Buru Akwụkwọ Zuru Ezu: Otu onye ọsụ ụzọ nyefere otu nwoke so ya na-eme njem n’otu obere ụgbọala broshuọ Na-achọ. Ihe ọ gụrụ n’ihe ọmụmụ nke 10 nke broshuọ ahụ metụrụ nwoke ahụ nnọọ n’ahụ nke na o weghachiri ùkwù ego buru ibu nke o zutere n’ime akpa onye njem ọzọ nọ n’ime obere ụgbọala ahụ. O juru mmadụ nile nọ n’ime obere ụgbọala ahụ anya, ha sịkwara ka e nye ha broshuọ Na-achọ. O nyefere ndị njem nile nọ n’ime obere ụgbọala ahụ ise ọzọ. Nke a na-egosi amamihe nke iburu akwụkwọ zuru ezu mgbe nile.
7 Banyere Akwụkwọ Anyị: Nwee echiche ziri ezi mgbe ị na-ekwu ka a tụọ ụtụ maka akwụkwọ anyị. Ụtụ anyị na-ekwu ka e nye anyị maka mbipụta anyị dị nnọọ ala karịa ihe ọ na-efu iji mepụta ha. Inwe echiche ziri ezi pụtara na anyị agaghị ekpebi na onye nwe ụlọ enweghị ike ịkwụ ụgwọ akwụkwọ ahụ. Anyị ịgbakwu ha ume pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ịrụpụta ihe ọma. Anyị inwe echiche ziri ezi ga-enyere ndị nwere obi eziokwu aka ịtụ ntakịrị ego anyị ji enyefe mbipụta anyị dị iche iche.
8 Ka anyị tinye mgbalị nile anyị nwere ike iji soro ndị ọzọ kerịta isi ihe na-eduje n’obi ụtọ ezinụlọ—na-agbaso ntụziaka ndị e setịpụrụ n’ime Okwu Chineke.—Abụ Ọma 19:7-10.