Nyefee Ndị Nọ n’Afọ Ndụ Nile Akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ
1 Otu nwatakịrị nwoke dị afọ 11 si California gosipụtara ekele o nwere maka akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. O dere, sị: “Enwere m obi ekele maka ya, ana m agbakwa ezinụlọ ndị ọzọ ume ịgụ akwụkwọ a n’ihi na ọ magburu onwe ya. Ọ . . . na-enyere ezinụlọ m aka inweta udo na obi ụtọ n’ụlọ anyị.” Ahụmahụ onye a na-eto eto nwere kwesịrị ịgba anyị ume inyefe ndị nọ n’afọ ndụ nile akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ. Ndị a bụ aro ole na ole ị pụrụ ịnwale n’ozi gị n’ọnwa February.
2 Mgbe i zutere onye na-eto eto, ị pụrụ ịsị:
◼ “Ọtụtụ ndị na-eto eto na-eche banyere alụmdi na nwunye. Ma mgbe a jụrụ ha ma hà dị njikere maka alụmdi na nwunye ka ọ̀ bụ na ha adịghị, ihe ka ọtụtụ na-asị na ha ejighị n’aka. Ka m soro gị tụlee ihe akwụkwọ a na-ekwu banyere okwu ahụ.” Sapeta peji nke 14 n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ, ma gụpụta paragraf nke 3. Mgbe ahụ kọwapụta isiokwu nta nke ọ bụla dị n’isiakwụkwọ ahụ. Nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya, meekwa ndokwa ịgaghachi.
3 Mgbe i so nne ma ọ bụ nna na-ekwurịta okwu, ị pụrụ ịsị:
◼ “Anyị na ndị nne na nna na-ekwurịta banyere ụkpụrụ nduzi ụfọdụ bara uru bụ́ ndị dị irè n’ezie maka ịzụlite ụmụaka. A chịkọtawo ndị a n’akwụkwọ a bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ.” Sapeta peji nke 55. Gụpụta paragraf nke 10, na Deuterọnọmi 6:6, 7, bụ́ nke dị na paragraf nke 11. Mgbe ahụ kọwapụta ahịrịokwu ndị ahụ e dere n’ụdị dị iche dị na paragraf nke 12 ruo 16. Gaa n’ihu site n’ikwu, sị: “Akwụkwọ a enyeworo ọtụtụ ndị aka inwe ihe ịga nke ọma karị dị ka ndị nne na nna. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịgụ ya, ọ ga-amasị m ịhapụrụ gị nke a n’ụtụ ₦55 (nke azụ ya na-esighị ike, ₦50).”
4 Mgbe ị na-agwa onye kataworo ahụ okwu, ị pụrụ ịsị:
◼ “Mgbe m gụpụtasịrị nkọwa a dị nkenke, biko gwa m ihe i chere.” Sapeta peji nke 169 n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ ma gụpụta ahịrịokwu abụọ mbụ dị na paragraf nke 17. Mgbe ahụ gwa ya ka o kwuo okwu. Na-adabere n’ihe o kwuru, ị pụrụ ịgụpụtakwu ihe ndị ọzọ site n’akwụkwọ ahụ tupu i nyefee ya.
5 Mgbe ị na-agaghachi n’ebe ndị i tinyere akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ, buru n’uche ịgbalị ịmalite ọmụmụ Bible. Ihe Ọmụmụ nke 8 na broshuọ Na-achọ ma ọ bụ isi nke 15 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma pụrụ ịbụ ebe dabara adaba ịmalite. Ka anyị nọ na-eme nke a, ka anyị gbalịsie ike inyere ndị nọ n’afọ ndụ nile aka iwulite ndụ ezinụlọ ndị Kraịst nwere obi ụtọ.