Inyere Ezinụlọ Dị Iche Iche Aka Inweta Ọdịnihu Na-adịgide Adịgide
1 “Anyaukwu bara uru,” ka otu onye ọrụ ego gwara otu klas na-agụsị akwụkwọ na kọleji, na-agbakwụnye, sị: “Ị pụrụ inwe anyaukwu ma ka nwee echiche dị mma banyere onwe gị.” Nke ahụ bụ ihe atụ nke otú ụwa si na-akwalite ọdịmma onwe onye dị ka ụzọ mmadụ si ejide ọdịnihu ya n’aka. N’ụzọ dị nnọọ iche, Jisọs kụziri na onye Kraịst aghaghị ‘ịjụ onwe ya . . . n’ihi na uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, ma ọ bụrụ na ọ ga-erite ụwa dum n’uru, e wee napụ ya ndụ ya?’ (Mat. 16:24-26) Iji nweta ọdịnihu na-adịgide adịgide, mmadụ aghaghị itinye ndụ ya nile n’ime uche Chineke—ihe mgbaru ọsọ kasị mkpa nye ezinụlọ dị iche iche taa. (Abụ Ọma 143:10; 1 Tim. 4:8) E wepụtara ozi ahụ n’isiokwu ikpeazụ nke akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Mbipụta ọhụrụ a na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe ndị dị mkpa n’ezie ná ndụ na otú ha pụrụ isi mee ihe n’ụzọ na-abara ezinụlọ ha uru. Ka anyị nọgidere na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ebe nile, gịnị ka anyị pụrụ ikwu nke ga-agba ndị anyị na-ezute ume ịgụ akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ? Nke a bụ aro ụfọdụ:
2 Ma n’ọnụ ụzọ ma n’okporo ámá, ị pụrụ ịnwale iji traktị bụ́ “Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ” malite mkparịta ụka. Ị pụrụ ịjụ, sị:
◼ “N’ihi nchegbu nile nke ịdị ndụ n’oge a na-ewetara anyị, ì chere na o kwere omume inwe ndụ obi ụtọ ezinụlọ n’ezie? [Nye ohere maka nzaghachi.] Traktị a na-emesi anyị obi ike na o kwere omume. Ị̀ ga-achọ ịgụ ya?” Ọ bụrụ na a natara ya, ị pụrụ ịga n’ihu site n’ikwu, sị: “Ebe ọ bụ na i nwere mmasị n’isiokwu a, ị pụkwara inwe mmasị n’akwụkwọ a na-enye ndụmọdụ sara mbara n’ụzọ e si enweta obi ụtọ n’ime ezinụlọ.” Gosi ihe ndị dị n’ime akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ. Rụtụ aka n’isiokwu isiakwụkwọ ole na ole ndị na-adọrọ mmasị. Sapeta peji nke 10, ma gụọ malite n’ahịrịokwu ikpeazụ na paragraf nke 17 ruo ná ngwụsị nke paragraf nke 18. Nyefee akwụkwọ ahụ, kwuokwa ụtụ ya kwesịrị ekwesị. Kọwaa na i nwere ihe ndị ọzọ ikerịta, ma jụọ mgbe ị pụrụ ileta ya ọzọ.
3 Ị pụrụ isochi mkparịta ụka mbụ gị banyere ndụ obi ụtọ ezinụlọ site n’ikwu, sị:
◼ “M ga-achọ ịrụtụ aka n’otu ihe dị n’ime akwụkwọ ahụ ị natara nke m chere na ị ga-enwe mmasị na ya. Isiakwụkwọ nke ikpeazụ na-elekwasị anya n’isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ n’ezie. [Gụpụta paragraf nke 2 na peji nke 183.] Rịba ama na ịrụkọ ọrụ ọnụ n’ime uche Chineke bụ isi ihe na-akpata ya. Anyị na-atụ aro ka ezinụlọ dị iche iche mụkọta Bible ọnụ iji mụta ihe bụ uche Chineke na otú e si etinye ya n’ọrụ n’ime ezinụlọ. Anyị na-enye usoro ọmụmụ Bible n’efu nke na-ewe nanị ọnwa ole na ole iji mụzuo ya. Ọ bụrụ na ị ga-enye m ohere, m ga-egosi gị otú e si eduzi ya.” Jiri broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma laghachi, nke ọ bụla ga-ekwesị ekwesị karị.
4 Mgbe ị na-agwa ụmụ klas gị n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ndị ntorobịa nọ n’ógbè unu okwu, ị pụrụ inweta nzaghachi nye ajụjụ a:
◼ “Ruo ókè hà aṅaa ka ọ dị mkpa ka ndị nne na nna na ụmụ ha nwee ụzọ nkwurịta okwu ghere oghe n’etiti onwe ha? [Nye ohere maka nzaghachi.] Rịba ama ihe akwụkwọ a bụ́ banyere ndụ ezinụlọ na-ekwu n’isiokwu bụ́ ‘Nkwurịta Okwu nke Ghere Oghe na nke Eziokwu.’ [Gụchaa paragraf nke 4 na ahịrịokwu nke mbụ na paragraf nke 5 na peji nke 65 n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ.] Paragraf ndị na-esonụ na-atụ aro ndị dị irè n’ụzọ e si emeziwanye nkwurịta okwu n’ime ezinụlọ. Aha akwụkwọ a bụ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. M ga-ahapụrụ gị nke a n’ụtụ ₦80.” Kọwaa na ị ga-alọghachi ma e mesịa iji mata ihe o nwere ikwu banyere ihe ọ na-agụ.
5 Ị pụrụ ịtụkwasị ihe ná mkparịta ụka mbụ gị na onye ntorobịa nwere banyere nkwurịta okwu nne ma ọ bụ nna na nwa site n’ikwu nke a:
◼ “Enwere m mmasị ná mmasị i gosiri n’ịdị mkpa nke inwe nkwurịta okwu dị mma n’ime ezinụlọ gị. Gịnị ka ị ga-asị na ọ bụ isiokwu kasị mkpa nne na nna na ụmụaka kwesịrị ikwurịta?” Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ sapeta peji nke 68 n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ, gụpụtakwa azịza dị n’akụkụ nke mbụ nke paragraf nke 11. “Inwe ọmụmụ Bible kwa izu bụ ụzọ magburu onwe ya isi nweta ihe ọmụma Chineke.” Chee broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? n’ihu. Kọwaa na ihe ọmụmụ ya 16 na-enye ndepụta bụ isi nke ozi Bible. Gụpụta okwu mmalite dị na peji nke 2, mgbe ahụ tụlekọọ ihe ọmụmụ nke mbụ ọnụ.
6 Ọ bụrụ na i zute onye bụ nne ma ọ bụ nna n’ọrụ ụlọ n’ụlọ, ma ọ bụ ikekwe n’ogige ntụrụndụ ma ọ bụ n’ebe a na-egwuri egwu, ị pụrụ ịkpalite mmasị site n’ikwu, sị:
◼ “Eji m n’aka na ị ga-ekweta na ịzụ ụmụ taa bụ ihe ịma aka n’ezie. Gịnị ka i chere pụrụ ichebe ezinụlọ gị pụọ ná mmetụta ndị na-adịghị mma? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ndị a bụ okwu ndụmọdụ ụfọdụ dị irè m nweworo mmasị na ha.” Kọọ ihe atụ dị na paragraf 1, ma gụpụta paragraf nke 2 na peji nke 90 n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ. Kọwaa otú o si enye nduzi kwesịrị ekwesị nke na-arụ ọrụ n’ezie ichebe ezinụlọ dị iche iche pụọ ná mmetụta ndị na-ebibi ebibi. Kwuo na ị ga-ahapụrụ ya otu n’ụtụ ₦80, wepụtakwa onwe gị ịza ajụjụ ọ bụla biliterenụ.
7 Ná nleta gị nke abụọ na nke nne ma ọ bụ nna natara akwụkwọ “Obi Ụtọ Ezinụlọ,” ị pụrụ iji mkparịta ụka ahụ gaa n’ihu n’ụzọ dị otú a:
◼ “Mgbe mbụ anyị zutere, apụrụ m ịhụ na ị na-echegbu onwe gị n’ezie banyere ụmụ gị, nakwa na ị chọrọ ime ihe nile i nwere ike ime iji chebe ha pụọ ná mmetụta ndị na-ezighị ezi. Ọ pụrụ ịbụ na ị ka agụbeghị ya, ma ọ dị ihe dị mkpa e kwuru n’akwụkwọ ahụ m hapụụrụ gị nke i kwesịrị ịhụ. [Gụpụta paragraf nke 19 na peji nke 59.] Isoro Chineke nwee mmekọrịta na-achọ anyị ịbịa mata ya site n’Okwu ya e dere ede, bụ́ Bible. Ị̀ ga-achọ ka m gosi gị otú anyị si amụ Bible dị ka ezinụlọ?”
8 Ndị ndụmọdụ ụwa apụghị igosi ezinụlọ dị iche iche ụzọ isi nweta obi ụtọ, kama ha ga-emechurịrị ha ihu. Ka anyị kesaa akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ n’ụzọ sara mbara ka Okwu Chineke wee nwee ike inyere ndị mmadụ n’ebe nile aka inweta ọdịnihu na-adịgide adịgide.—1 Tim. 6:19.