Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fy isi 8 p. 90-102
  • Chebe Ezinụlọ Gị Pụọ n’Ihe Ndị Na-eweta Mbibi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chebe Ezinụlọ Gị Pụọ n’Ihe Ndị Na-eweta Mbibi
  • Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ÒNYE GA-AKỤZIRI ỤMỤ GỊ IHE?
  • ECHICHE CHINEKE BANYERE MMEKỌAHỤ
  • ỌRỤ ỤLỌ NKE NNE NA NNA NWERE
  • NDỊ ENYI ỤMỤ GỊ
  • ỤDỊ NTỤRỤNDỤ DỊ AṄAA?
  • EZINỤLỌ GỊ PỤRỤ IMERI ỤWA
  • Bible Ọ̀ Pụrụ Inyere Gị Aka Ịzụ Ụmụ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu?​—Nke 2
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Hụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ndị Nne na Nna—Bụrụnụ Ezi Ihe Nlereanya Nye Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
fy isi 8 p. 90-102

ISI NKE ASATỌ

Chebe Ezinụlọ Gị Pụọ n’Ihe Ndị Na-eweta Mbibi

Foto dị na peeji nke 99 91

1-3. (a) Olee ebe mmetụta ndị na-eweta mbibi bụ́ ndị na-eyi ezinụlọ egwu na-esitegasị? (b) Nguzozi dị aṅaa dị ndị nne na nna mkpa n’ichebe ezinụlọ ha?

ỊNA-ACHỌ iziga nwa gị ụlọ akwụkwọ, oké mmiri na-ezokwa. Olee otú i si ahụ maka ọnọdụ ahụ? Ị̀ na-ekwe ka ọ gbapụ n’èzí n’ejighị ihe ọ bụla e ji eche mmiri? Ka ị̀ na-eyikwasị ya ọtụtụ uwe nchebe nke na ọ na-esiri ya ike imegharị ahụ? Ee, ọ dịghị n’ime ha nke ị ga-eme. Ị ga-enye ya nanị ihe dị mkpa iji hụ na mmiri amaghị ya.

2 N’otu ụzọ ahụ, ndị nne na nna aghaghị ịchọta ụzọ ziri ezi isi chebe ezinụlọ ha pụọ n’ihe ndị na-eweta mbibi na-ezokwasị ha dị ka mmiri site n’ọtụtụ akụkụ—ụlọ ọrụ ihe ntụrụndụ, usoro mgbasa ozi, ndị ọgbọ, na mgbe ụfọdụ ọbụna ụlọ akwụkwọ. Ụfọdụ ndị nne na nna na-eme ihe dị nta ma ọ bụ ghara ime ihe ọ bụla iji chebe ezinụlọ ha. Ndị ọzọ, n’ile ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmetụta nile dị n’èzí anya dị ka nke na-emerụ ahụ, na-egbochi egbochi karị nke na ọ na-adị ụmụaka ka hà na-ekubi ume. À pụrụ inwe nguzozi?

3 Ee, a pụrụ. Ịnọ n’ọnọdụ gabigara ókè adịghị irè, ọ pụkwara ịkpata mbibi. (Eklisiastis 7:16, 17) Ma olee otú nne na nna bụ́ ndị Kraịst si enweta nguzo ziri ezi n’ichebe ezinụlọ ha? Tụlee akụkụ atọ: agụmakwụkwọ, mkpakọrịta, na ntụrụndụ.

ÒNYE GA-AKỤZIRI ỤMỤ GỊ IHE?

4. Olee otú nne na nna bụ́ ndị Kraịst kwesịrị isi lee agụmakwụkwọ anya?

4 Nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-ewere agụmakwụkwọ n’oké ihe. Ha maara na ịga akwụkwọ na-enyere ụmụaka aka ịgụ ihe, ide ihe, na ikwurịta okwu, nakwa idozi nsogbu dị iche iche. O kwesịkwara ịkụziri ha otú e si amụ ihe. Nkà ndị ụmụaka mụtara n’ụlọ akwụkwọ pụrụ inyere ha aka inwe ihe ịga nke ọma n’agbanyeghị ihe ịma aka nile nke ụwa taa. Tinyere nke ahụ, agụmakwụkwọ dị mma pụrụ inyere ha aka ịrụzu ọrụ ka mma.—Ilu 22:29.

5, 6. Olee otú a pụrụ isi kpughepụ ụmụaka nọ n’ụlọ akwụkwọ nye ihe ọmụma a gwagburu agwagbu n’okwu ndị metụtara mmekọahụ?

5 Otú ọ dị, ụlọ akwụkwọ na-emekwa ka ụmụaka na ndị ọzọ bịakọta ọnụ—ndị ọtụtụ n’ime ha nwere echiche ndị a gwagburu agwagbu. Dị ka ihe atụ, tụlee echiche ha banyere mmekọahụ na omume. N’otu ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Nigeria, otu nwa agbọghọ na-enwe mmekọahụ aghara aghara na-enyekarị ụmụ akwụkwọ ibe ya okwu ndụmọdụ banyere mmekọahụ. Ha ji ịnụ ọkụ n’obi ege ya ntị, ọ bụ ezie na echiche ya jupụtara n’ihe nzuzu ọ mụtara n’akwụkwọ ndị na-akpali mmekọahụ. Ụfọdụ ụmụ agbọghọ nwalere okwu ndụmọdụ ya. N’ihi ya, otu nwa agbọghọ tụụrụ ime n’alụghị di ma nwụọ ná nsikwopụ ime o mere onwe ya.

6 Ọ bụ ihe mwute ikwu na ụfọdụ n’ajọ ihe ọmụma mmekọahụ n’ụlọ akwụkwọ na-esite, ọ bụghị n’ọnụ ụmụaka, kama n’ọnụ ndị nkụzi. Ọ na-eju ọtụtụ nne na nna anya mgbe ụlọ akwụkwọ na-akụziri ụmụaka banyere mmekọahụ n’enyeghị ihe ọmụma banyere ụkpụrụ omume na ibu ọrụ. Nne nke otu nwa agbọghọ dị afọ 12 kwuru, sị: “Anyị bi n’ógbè ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu, nke na-agbaso ọdịnala, ma kpọmkwem n’ụlọ akwụkwọ dị elu dị n’ógbè a, ha na-enye ụmụaka condom [ihe a na-eyi n’amụ mgbe a na-enwe mmekọahụ]!” Ya na di ya malitere inwe nchegbu mgbe ha chọpụtara na ụmụ okoro ha na nwa ha nwanyị bụ ọgbọ na-achụ ya maka mmekọahụ. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi chebe ezinụlọ ha site n’ụdị mmetụta ọjọọ dị otú ahụ?

7. Olee ụzọ kasị mma isi guzogide ihe ọmụma na-ezighị ezi banyere mmekọahụ?

7 Ọ̀ kasị mma ikpuchi ụmụaka pụọ n’ịkpọtụ ihe ọ bụla metụtara mmekọahụ aha? Ee e. Ọ ka mma ịkụziri ụmụ gị banyere mmekọahụ n’onwe gị. (Ilu 5:1) N’eziokwu, n’akụkụ dị iche iche nke Europe na Ebe Ugwu America, ọtụtụ ndị nne na nna na-eme ihere n’isiokwu a. N’otu aka ahụ, n’ala ụfọdụ nke Africa, ọ na-esi ike ndị nne na nna isoro ụmụ ha tụlee mmekọahụ. “Ọ bụghị akụkụ ọdịbendị Africa ime otú ahụ,” ka otu nna na Sierra Leone na-ekwu. Ụfọdụ ndị nne na nna na-eche na ịkụziri ụmụaka banyere mmekọahụ bụ inye ha echiche ndị ga-eduje ha n’ime omume ọjọọ! Ma gịnị bụ echiche Chineke?

ECHICHE CHINEKE BANYERE MMEKỌAHỤ

8, 9. Ihe ọmụma ọma dị aṅaa n’okwu mmekọahụ ka a na-achọta na Bible?

8 Bible na-eme ka o doo anya na e nweghị ihe ọ bụla dị ihere n’ịtụle mmekọahụ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị. N’Israel, a gwara ndị Chineke ka ha zukọọ, gụnyere “ụmụntakịrị,” ịṅa ntị ná ngụpụta nke Iwu Mosis. (Deuterọnọmi 31:10-12; Joshua 8:35) Iwu ahụ kpọtụrụ ihe ụfọdụ metụtara mmekọahụ aha hoo haa, gụnyere oge ịnọ ná nsọ, mwụsị ahụ, ịkwa iko, idina ụdị onwe, mmekọahụ ndị ikwu, na idina anụmanụ. (Levitikọs 15:16, 19; 18:6, 22, 23; Deuterọnọmi 22:22) Mgbe a gụsịrị ihe ndị dị otú ahụ ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị nne na nna nwere ọtụtụ ihe ịkọwara ụmụ ha na-ajụ oké ajụjụ.

9 E nwere akụkụ ihe odide ndị dị n’isi nke ise, isii, na asaa nke Ilu ndị na-enye okwu ndụmọdụ ịhụnanya nke nne na nna banyere ihe ize ndụ nke mmekọahụ rụrụ arụ. Amaokwu ndị a na-egosi na omume rụrụ arụ pụrụ ịdị na-ara ụra mgbe ụfọdụ. (Ilu 5:3; 6:24, 25; 7:14-21) Ma ha na-akụzi na ọ dị njọ, na-arụpụtakwa mbibi, ha na-enyekwa nduzi iji nyere ndị na-eto eto aka izere ụzọ nile nke omume rụrụ arụ. (Ilu 5:1-14, 21-23; 6:27-35; 7:22-27) Ọzọkwa, e gosiri ọdịiche n’etiti omume rụrụ arụ na afọ ojuju nke ụtọ mmekọahụ n’ọnọdụ ya kwesịrị ekwesị, n’ime alụmdi na nwunye. (Ilu 5:15-20) Lee aha ọmarịcha ihe atụ maka nkụzi ọ bụ ka ndị nne na nna gbasoo!

10. N’ihi gịnị ka inye ụmụaka ihe ọmụma Chineke banyere mmekọahụ na-ekwesịghị iji duba ha n’ime omume rụrụ arụ?

10 Nkụzi dị otú ahụ ọ̀ na-eduba ụmụaka n’ime omume rụrụ arụ? N’ụzọ megidere ya, Bible na-akụzi: “Ihe ọmụma ka a ga-eji dọpụta ndị ezi omume.” (Ilu 11:9) Ị́ chọghị ịdọpụta ụmụ gị ná mmetụta dị iche iche nke ụwa a? Otu nna kwuru, sị: “Eri mgbe ụmụaka ahụ dị nnọọ nta, anyị agbalịwo ịgwa ha nnọọ eziokwu mgbe a bịara n’ihe banyere mmekọahụ. N’ụzọ dị otú ahụ, mgbe ha nụrụ ka ụmụaka ndị ọzọ na-ekwu banyere mmekọahụ, ọ naghị agụsi ha ike ịma ihe a na-akọ. E nweghị oké ihe omimi dị ya.”

11. Olee otú a pụrụ isi kụziere ụmụaka banyere ihe nzuzo ndị dị ná ndụ n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu?

11 Dị ka a rịbara ama n’isiakwụkwọ ndị bu ụzọ, nkụzi mmekọahụ kwesịrị ịmalite n’oge. Mgbe a na-akụziri ụmụntakịrị ịkpọ aha akụkụ ahụ dị iche iche, amafela akụkụ ahụ ha ndị zoro ezo dị ka a ga-asị na ndị a bụ ihe ihere. Kụziere ha ezigbo aha a na-akpọ ha. Ka oge na-aga, ihe ọmụmụ banyere ịbụ nke onwe onye nanị na ịkpa ókè dị iche iche dị mkpa. N’ụzọ ka mma, ma nne ma nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha na akụkụ ahụ ndị a pụrụ iche, e kwesịghịkwa nnọọ ịdị na-akpa ha aka ma ọ bụ kpughepụ ha nye ndị ọzọ, ọ dịghịkwa mgbe a ga-ekwu banyere ha n’ụzọ dị njọ. Ka ụmụaka na-emewanye okenye, e kwesịrị ime ka ha mara ụzọ nwoke na nwanyị si abịakọ ọnụ iji tụrụ ime nwa. Mgbe ahụ nke ha na-erule oge ịgba ajị, ha kwesịrị ịmaworị nke ọma mgbanwe ndị a ga-atụ anya ha. Dị ka a tụlere n’Isi nke 5, nkụzi dị otú ahụ pụkwara inye aka ichebe ụmụaka pụọ ná mmetọ mmekọahụ.—Ilu 2:10-14.

ỌRỤ ỤLỌ NKE NNE NA NNA NWERE

12. Echiche dịgasị aṅaa a gwagburu agwagbu ka a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ?

12 Ọ dị ndị nne na nna mkpa ịdị njikere ime ihe megide echiche ndị ọzọ bụ ụgha bụ́ ndị a pụrụ ịkụzi n’ụlọ akwụkwọ—nkà ihe ọmụma ụwa dị ka evolushọn, ịhụ mba n’anya, ma ọ bụ echiche nke na ọ dịghị ihe bụcha eziokwu. (1 Ndị Kọrint 3:19; tụlee Jenesis 1:27; Levitikọs 26:1; Jọn 4:24; 17:17.) Ọtụtụ ndị ọrụ ụlọ akwụkwọ nwere ezi obi na-emesibiga ịdị mkpa nke ịgụkwu akwụkwọ ike ókè. Ọ bụ ezie na okwu nke inwetakwu agụmakwụkwọ bụ nhọrọ onwe onye, ụfọdụ ndị nkụzi na-azọrọ na ọ bụ nanị ya bụ ụzọ isi nwee ọganihu onwe onye.a—Abụ Ọma 146:3-6.

13. Olee otú a pụrụ isi chebe ụmụaka na-aga akwụkwọ pụọ n’echiche ndị na-ezighị ezi?

13 Ọ bụrụ na ndị nne na nna gaje iguzogide nkụzi ndị na-ezighị ezi na ndị a gwagburu agwagbu, ha aghaghị ịma kpọmkwem ozizi ụmụ ha na-enweta. Ya mere ndị nne na nna, chetanụ na unu nwekwara ọrụ ụlọ! Gosi ezigbo mmasị n’akwụkwọ nwa gị na-aga. Soro ha kwurịta okwu mgbe ha latara akwụkwọ. Jụọ ihe ha na-amụ, ihe na-amasịkarị ha, ihe kasị na-abụrụ ha ihe ịma aka. Lenye anya n’ọrụ e kenyere ha ịrụ n’ụlọ, ihe ndị ha na-edetu, na ihe ule ha na-egosi. Gbalịa ịmata ndị nkụzi ha. Mee ka ndị nkụzi mara na i nwere ekele maka ọrụ ha nakwa na ị ga-achọ inye aka n’ụzọ ọ bụla ị pụrụ.

NDỊ ENYI ỤMỤ GỊ

14. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa na ụmụaka na-atụ egwu Chineke họọrọ ezi ndị enyi?

14 “Ebee ka ị mụtara nke ahụ?” Ndị nne na nna ole jụworo ajụjụ ahụ, na-enwe ijuanya banyere ihe nwa ha kwuworo ma ọ bụ mee nke yikwara ihe na-adabaghị adaba ma ọlị? Ọtụtụ ugboro olekwa ka azịza ya na-agụnyekarị enyi ọhụrụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’agbata obi? Ee, ndị enyi na-enwe mmetụta n’ahụ anyị n’ụzọ miri emi, ma ànyị bụ ụmụaka ma ànyị bụ ndị okenye. Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu: Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” (1 Ndị Kọrint 15:33; Ilu 13:20) Ndị ntorobịa karịsịa na-adabakarị ná nrụgide ndị ọgbọ. Ha yiri ka ha adịghị eji onwe ha n’aka, mgbe ụfọdụkwa ọ dị ha ka ọchịchọ imeta ndị ha na ha na-akpa mma na ịdọrọ mmasị ha ọ̀ na-erikpu ha. Mgbe ahụ, lee ka o si dị oké mkpa na ha họọrọ ezi ndị enyi!

15. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi duzie ụmụaka ha n’ịhọrọ ndị enyi?

15 Dị ka nne ma ọ bụ nna ọ bụla maara, ụmụaka agaghị ahọrọ ndị ọma mgbe nile; nduzi ụfọdụ dị ha mkpa. Ọ bụghị ịhọtara ha ndị enyi ha. Kama nke ahụ, ka ha na-eto, kụziere ha nghọta ma nyere ha aka ịhụ àgwà ndị ha kwesịrị iji kpọrọ ihe n’ebe ndị enyi nọ. Àgwà bụ isi bụ ịhụnanya maka Jehova na maka ime ihe dị mma n’anya ya. (Mak 12:28-30) Kụziere ha ịhụ ndị na-akwụwa aka ọtọ, nwere obi ọma, na-emesapụ aka, dị uchu, n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù. N’oge ọmụmụ ihe ezinụlọ, nyere ụmụaka aka ịhụta àgwà ndị dị otú ahụ ná ndị a kọrọ maka ha na Bible, mgbe ahụkwa chọta otu àgwà ndị ahụ n’ime ndị ọzọ nọ n’ime ọgbakọ. Setịpụ ihe nlereanya site n’iji otu ụkpụrụ ahụ eme ihe n’ịhọrọ ndị enyi nke gị.

16. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi chịkwaa nhọrọ ụmụ ha maka ndị enyi?

16 Ị̀ maara ndị bụ ndị enyi ụmụ gị? Gịnị ma i mee ka ụmụ gị kpọrute ha ụlọ ka i wee zute ha? Ị pụkwara ịjụ ụmụ gị ihe ụmụaka ndị ọzọ na-eche banyere ndị enyi a. È ji ngosipụta nke àgwà nguzosi ike n’ezi ihe onwe onye mara ha ka ọ̀ bụ ibi ụdị ndụ abụọ? Ọ bụrụ na nke ikpeazụ bụ eziokwu, nyere ụmụ gị aka ịtụgharị uche n’ihe mere mkparịta dị otú ahụ pụrụ iji merụọ ha ahụ. (Abụ Ọma 26:4, 5, 9-12) Ọ bụrụ na ị hụta mgbanwe ndị na-adịghị mma n’akparamàgwà, uwe, omume, ma ọ bụ okwu ọnụ nwa gị, ọ pụrụ ịdị gị mkpa iso ya kwurịta okwu banyere ndị enyi ya. Nwa gị pụrụ ịdị na-eso enyi nke na-akpa ike ọjọọ n’ahụ ya na-anọkọ.—Tụlee Jenesis 34:1, 2.

17, 18. E wezụga ịdọ aka ná ntị megide ndị ajọ enyi, enyemaka dị aṅaa dị irè ka ndị nne na nna pụrụ inye?

17 Ma o zughị ezu nanị ịkụziri ụmụ gị izere ndị enyi ọjọọ. Nyere ha aka ịchọta ndị ọma. Otu nna na-asị: “Anyị na-agbalị mgbe nile ịchọta ọzọ. Ya mere mgbe ụlọ akwụkwọ chọrọ nwa anyị n’òtù ndị na-agba bọl, mụ na nwunye m soro ya nọdụ ala tụlee ihe mere nke ahụ na-agaghị eji bụrụ echiche ọma—n’ihi ndị mkpakọrịta ọhụrụ nke ahụ ga-agụnye. Ma mgbe ahụ anyị tụrụ aro ịkpọkọta ụmụaka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ma kpọrọ ha nile gaa n’ámá egwuregwu ịga gbaa bọl. Nke ahụ rụkwara ọrụ nke ọma.”

18 Ndị nne na nna maara ihe na-enyere ụmụ ha aka ịchọta ezi ndị enyi, mgbe ahụkwa na-esoro ha enwe ntụrụndụ na-ewuli elu. Ma, nye ọtụtụ ndị nne na nna, okwu a nke ntụrụndụ na-eweta ihe ịma aka ndị nke ya.

ỤDỊ NTỤRỤNDỤ DỊ AṄAA?

19. Olee ihe atụ Bible ndị na-egosi na ọ bụghị mmehie ezinụlọ ime ihe ọchị?

19 Bible ọ̀ na-ekwugide ime ihe ọchị? Ọ dịghị ma ọlị! Bible na-asị na e nwere “mgbe ịchị ọchị . . . na mgbe ite egwú.”b (Eklisiastis 3:4) Ndị Chineke n’Israel oge ochie nụrụ ụtọ egwú na ịgba egwú, ngwuri egwu, na gwam gwam gwam. Jisọs Kraịst gara otu nnukwute agbamakwụkwọ na “nri ukwu” nke Matiu Livaị siere ya. (Luk 5:29; John 2:1, 2) O doro anya na Jisọs abụghị ogbu ọṅụ. Ka a ghara ile ịchị ọchị na ime ihe ọchị anya mgbe ọ bụla n’ezinụlọ gị dị ka mmehie!

Foto dị na peeji nke 99

Ihe ntụrụndụ a họọrọ nke ọma, dị ka mkpapụ ezinụlọ nke a nke ịma ụlọikwuu, pụrụ inyere ụmụaka aka ịmụta ihe na ito n’ụzọ ime mmụọ

20. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị iburu n’uche n’inye ezinụlọ ha ihe ntụrụndụ?

20 Jehova bụ “Chineke obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11, NW) Ya mere ofufe Jehova kwesịrị ịbụ isi iyi nke ihe ụtọ, ọ bụghị ihe na-ebute ụkọ nke ọṅụ ná ndụ. (Tụlee Deuterọnọmi 16:15.) Ụmụaka na-ejupụtakarị ná ndụ na ume nke a pụrụ ịwụpụ n’egwuregwu na ntụrụndụ. Ntụrụndụ a họọrọ nke ọma karịrị ime ihe ọchị. Ọ bụ ụzọ nwatakịrị si amụta ihe ma na-etozu okè. Ọ dịịrị onye isi ezinụlọ igbo mkpa ezinụlọ ya n’ihe nile, gụnyere ntụrụndụ. Otú ọ dị, a chọrọ nguzozi.

21. Olee ọnyà ndị e nwere n’ihe ntụrụndụ nke taa?

21 Na “mgbe ikpeazụ” a jupụtara ná nsogbu, ọha mmadụ jupụtara ná ndị “na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya,” dị nnọọ ka e buru n’amụma n’ime Bible. (2 Timoti 3:1-5) Nye ọtụtụ ndị, ntụrụndụ bụ ihe bụ isi ná ndụ. E nwere ọtụtụ ihe ntụrụndụ dịnụ nke na ọ pụrụ ịdị mfe ya ịnọchi ihe ndị ka mkpa. Ọzọ, ihe dị ukwuu n’ihe ntụrụndụ ọgbara ọhụrụ na-egosi mmekọahụ rụrụ arụ, ime ihe ike, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na ihe ndị ọzọ dị oké njọ na-emerụ ahụ. (Ilu 3:31) Gịnị ka a pụrụ ime iji chebe ndị na-eto eto pụọ ná ntụrụndụ na-emerụ ahụ?

22. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi zụọ ụmụ ha ime mkpebi ndị amamihe dị na ha banyere ntụrụndụ?

22 Ọ dị ndị nne na nna mkpa ịkpa ókè na itinye ihe mgbochi. Ma karịa nke ahụ, ọ dị ha mkpa ịkụziri ụmụ ha ụzọ isi kpebie ihe bụ ntụrụndụ na-emerụ ahụ na ịmata ole ga-abụ nke gabigara ókè. Ọzụzụ dị otú ahụ na-ewe oge na mgbalị. Tụlee otu ihe atụ. Nna nke ụmụ ndị ikom abụọ hụtara na nke ka okenye na-egekarị ụlọ ọrụ redio ọhụrụ ntị. Ya mere ka ọ nyaara gwongworo ya na-aga ọrụ otu ụbọchị, nna ahụ gbanyere otu ụlọ ọrụ ahụ. Mgbe mgbe ọ kwụsịrị ma detuo ihe egwú ụfọdụ na-ekwu. E mesịa o sooro ụmụ ya nọrọ ala ma tụlee ihe ọ nụworo. Ọ jụrụ ajụjụ ndị e ji amata echiche, na-amalite site n’ịsị “Gịnị ka unu chere?” ma jiri ndidi ṅaa ntị n’azịza ha. Mgbe ha jisịrị Bible tụgharịa uche n’okwu ahụ, ụmụ okoro ahụ kwetara na ha agaghị ege ụlọ ọrụ ahụ.

23. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi chebe ụmụ ha pụọ n’egwuregwu na-adịghị ewuli elu?

23 Ndị nne na nna maara ihe bụ́ ndị Kraịst na-enyocha egwú, ihe omume TV, tepu vidio, akwụkwọ egwuregwu, egwuregwu vidio, na sinima ndị na-amasị ụmụ ha. Ha na-ele ihe e sere n’elu ya, okwu ndị dị na ya, na ihe e ji tinye ya, ha na-agụkwa ihe ntụle akwụkwọ akụkọ ma na-ekiri akụkụ ụfọdụ. Ọtụtụ na-akụja n’ụfọdụ “ihe ntụrụndụ” e chere ihu n’ebe ụmụaka nọ taa. Ndị chọrọ ichebe ụmụ ha pụọ ná mmetụta ndị na-adịghị ọcha na-esoro ezinụlọ ha nọdụ ala ma tụlee ihe ize ndụ dị iche iche, na-eji Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible, dị ka akwụkwọ Questions Young People Ask—Answers That Work, na isiokwu ndị dị na magazin Ụlọ Nche na Teta!c Mgbe ndị nne na nna setịpụrụ ókè ndị siri ike, na-anọgidesi ike ma na-egosi ezi uche, ha na-arụpụtakarị ihe dị mma.—Matiu 5:37; Ndị Filipaị 4:5.

24, 25. Olee ụdị egwuregwu ụfọdụ na-ewuli elu ndị ezinụlọ pụrụ inwekọ ọnụ?

24 Otú ọ dị, igbochi ụdị ntụrụndụ ndị na-emerụ ahụ bụ nanị akụkụ nke ọgụ ahụ. A ghaghị iji nke ọma guzogide nke ọjọọ ahụ, ma ọ bụghị ya ụmụaka pụrụ ịkpafu gaa n’ụzọ ọjọọ. Ọtụtụ ezinụlọ ndị Kraịst nwere ọtụtụ ncheta ndị na-ekpo ọkụ ma na-enye obi ụtọ nke inwekọ ntụrụndụ ọnụ—na-emekọ mkpapụ, aga mkpagharị, akpapụ maa ụlọikwuu, egwuri egwu, na-eme njem ileta ndị ikwu ma ọ bụ ndị enyi. Ụfọdụ ahụwo na nanị ịgụkọ ihe ọnụ n’olu dara ụda dị ka ntụrụndụ bụ nnukwu isi iyi nke obi ụtọ na nkasi obi. Ọ na-amasị ndị ọzọ ịkọ akụkọ ndị na-atọ ọchị ma ọ bụ na-adọrọ mmasị. Ndị ọzọ ewulitekọwokwa ọṅụ ihe ntụrụndụ a na-eme n’oge a nọ nkịtị, dị ka ihe atụ, ịkwa nkà na ọrụ nkà ọzọ, nakwa ịkpọ ngwá egwu, ite ágbá, ma ọ bụ ịmụ banyere ihe ndị Chineke kere. A na-echebe ụmụaka mụtara ịnụ ụtọ nke ihe ntụrụndụ dịgasị otú a pụọ n’ihe dị ukwuu ná ntụrụndụ na-adịghị ọcha, ha na-amụtakwa na ntụrụndụ karịrị nanị ịnọdụ ala n’emeghị ihe ọ bụla ma bụrụ onye a na-emere ihe ntụrụndụ. Ikere òkè na-ewetakarị ihe ọchị karịa ikiri ekiri.

25 Nnọkọ oriri na ọṅụṅụ pụkwara ịbụ ụdị ntụrụndụ na-enye afọ ojuju. Mgbe e lekọtara ha nke ọma, ha gharakwa ịbụ nke okomoko ma ọ bụ na-eri oge, ha pụrụ imere ụmụ ihe karịrị ihe ọchị. Ha pụrụ inye aka ime ka ihe nkekọ nke ịhụnanya n’ime ọgbakọ mie emi.—Tụlee Luk 14:13, 14; Jud 12.

EZINỤLỌ GỊ PỤRỤ IMERI ỤWA

26. Mgbe a bịara n’ichebe ezinụlọ pụọ ná mmetụta ndị na-adịghị ewuli elu, olee àgwà kasị mkpa?

26 Ajụjụ ọ bụla adịghị ya, ichebe ezinụlọ gị pụọ ná mmetụta ụwa ndị na-eweta mbibi chọrọ ọrụ dị ukwuu siri ike. Ma e nwere otu ihe nke, karịa ihe ọ bụla ọzọ, ga-eme ka o kwe omume inwe ihe ịga nke ọma. Ọ bụ ịhụnanya! Ihe nkekọ chiri anya, nke ịhụnanya ezinụlọ ga-eme ka ụlọ gị bụrụ ebe dị nchebe, ọ ga-akwalitekwa nkwurịta okwu, nke bụ oké ihe nchebe pụọ ná mmetụta ndị dị njọ. Karịa nke ahụ, ịzụlite ụdị ịhụnanya ọzọ dị mkpa ọbụna karị—ịhụnanya maka Jehova. Mgbe ịhụnanya dị otú ahụ jupụtara n’ezinụlọ, o yikarịrị ka ụmụaka hà ga-etolite na-akpọ echiche nke ime ihe ga-ewute Chineke site n’ịdaba ná mmetụta dị iche iche nke ụwa asị. Ndị nne na nna hụrụ Jehova n’anya site n’obi ga-achọkwa iṅomi àgwà ya nke ịhụnanya, ezi uche, na iguzozi eguzozi. (Ndị Efesọs 5:1; Jemes 3:17) Ọ bụrụ na ndị nne na nna emee nke ahụ, ụmụ ha agaghị enwe ihe mere ha ga-eji lee ofufe Jehova anya dị ka nanị usoro ndepụta nke ihe ndị a na-adịghị anakwere ma ọ bụ dị ka ụzọ ndụ nke egwuregwu ma ọ bụ ịchị ọchị na-adịghị ya, bụ́ nke ha ga-achọ isi na ya gbapụ ngwa ngwa o kwere omume. Kama nke ahụ, ha ga-ahụ na ofufe Chineke bụ ụzọ ndụ nke kasị obi ụtọ, kasị nwee nzube a pụrụ ibi.

27. Olee otú ezinụlọ pụrụ isi merie ụwa?

27 Ezinụlọ ndị na-anọgide n’otu n’ije ozi obi ụtọ, nke guzoziri eguzozi nye Chineke, jiri obi ha dum na-agbalịsi ike ịnọgide ‘n’enweghị ntụpọ na ụta’ site n’ihe ndị na-emerụ emerụ nke ụwa a, bụ isi iyi nke ọṅụ nye Jehova. (2 Pita 3:14; Ilu 27:11) Ezinụlọ ndị dị otú ahụ na-agbaso ijeụkwụ Jisọs Kraịst, onye guzogidere mgbalị ọ bụla nke ụwa Setan itetọ ya. Ná nso nke ọgwụgwụ ndụ mmadụ ya, Jisọs nwere ike ikwu, sị: “Mụ onwe m emeriwo ụwa.” (Jọn 16:33) Ka ezinụlọ gị meriekwa ụwa ma nụ ụtọ ndụ ruo mgbe ebighị ebi!

a Maka ntụle nke inwetakwu agụmakwụkwọ, lee broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, peji nke 4-7.

b A pụrụ ịsụgharị okwu Hibru a sụgharịrị “ịchị ọchị” n’ebe a, n’ụdị ndị ọzọ, “igwuri egwu,” “inye ụdị ihe ntụrụndụ ụfọdụ,” “ime ememe,” ma ọ bụ ọbụna “ikpori ndụ.”

c Ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

OLEE OTÚ ỤKPỤRỤ BIBLE NDỊ A PỤRỤ ISI . . . NYE AKA ICHEBE EZINỤLỌ GỊ?

Ihe ọmụma na-eduje n’amamihe, nke pụrụ ichebe mmadụ ndụ.—Eklisiastis 7:12.

“Amamihe nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.”—1 Ndị Kọrint 3:19.

A ghaghị izere mkparịta nile ọjọọ.—1 Ndị Kọrint 15:33.

Ọ bụ ezie na ntụrụndụ nwere ọnọdụ ya, ma e kwesịrị ịchịkwa ya.—Eklisiastis 3:4.

Ọ DỊGHỊ YA KA A NA-AWỌ YA IHE

Nne na nna bụ́ ndị Kraịst bụ́ Paul na nwunye ya, Lu-Ann, na-ahazi nnọkọ oriri n’ụlọ ha site n’oge ruo n’oge. Ha na-ejide n’aka na e leziri nnọkọ ndị ahụ anya nke ọma, ha bụrụkwa n’ókè a ga-achịkwali. Ha nwere ezi ihe mere ha ga-eji kwere na ụmụ ha na-erite uru.

Lu-Ann na-akọ, sị: “Nne otu nwatakịrị ya na nwa m nwoke dị afọ isii, Eric, nọ na klas bịakwutere m ikwu na ya na na-emere Eric ebere n’ihi na ọ na-anọpụ iche ma ghara ịdị na-esonye n’ememe ụbọchị ọmụmụ ndị klas ahụ na-eme. Agwara m ya, sị: ‘Ọ masịrị m nnọọ na ị na-eche nnọọ banyere nwa m n’ụzọ dị otú ahụ. Ọ na-egosi ihe dị ukwuu banyere ụdị onye ị bụ. Ma eleghịkwa anya ọ dịghị ihe m pụrụ ikwu pụrụ ime ka i kweta na ọ dịghị Eric ka ọ dị ihe na-akwa ya.’ O kwetara. Ya mere m sịrị: ‘Mgbe ahụ biko, maka ọdịmma gị, mee ka mmụọ gị jụrụ ma jụọ Eric n’onwe gị otú obi dị ya.’ Mgbe m na-anọghị ya, ọ jụrụ Eric sị, ‘Ọ́ dịghị ewute gị na ọmarịcha oriri ụbọchị ọmụmụ ndị a na-akwa gị?’ O lere ya anya, na-enwe ijuanya, ma sị: ‘Ì chere na ọ bụ minit iri, achịcha ụtọ ole na ole e ji iko mee, na otu abụ ka e ji eme oriri? I kwesịrị ịbịa n’ụlọ anyị ma hụ otú oriri na-adị nnọọ!’” Ịnụ ọkụ aghụghọ na-adịghị ya nke nwa nwoke ahụ mere ka o doo anya—ọ naghị adị ya ka ọ dị ihe a na-awọ ya ma ọ bụ ihe na-akwa ya!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya