Ndịàmà Jehova—Ezi Ndị Na-ezisa Ozi Ọma
1 Jisọs Kraịst nyere ndị nile na-eso ụzọ ya ibu ọrụ nke izisa ozi ọma, na-atụrụ ha iwu kpọmkwem izisa ozi ọma nke Alaeze ahụ. (Mat. 24:14; Ọrụ 10:42) Ndị na-eso ụzọ ya oge mbụ setịpụrụ ụkpụrụ ná nke a ka ha na-ekwu banyere Alaeze ahụ na-esepụghị ọnụ—ọ bụghị nanị n’ebe ndị a nọ na-efe ofufe kama n’ebe ọ bụla ha zutere ụmụ mmadụ n’ọha na n’ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. (Ọrụ 5:42; 20:20) Dị ka Ndịàmà Jehova taa, anyị egosipụtawo onwe anyị ịbụ ezi ndị Kraịst na-ezisa ozi ọma, na-ekwusa ozi Alaeze ahụ n’ala 232 na-eme ihe karịrị otu nde ndị na-eso ụzọ ọhụrụ baptism n’ime nanị afọ atọ gara aga! Olee ihe mere ọrụ izisa ozi ọma anyị jiworo gaa nnọọ nke ọma?
2 Ozi Ọma Na-akpali Anyị Akpali: Ndị na-ezisa ozi ọma bụ ndị nkwusa, ma ọ bụ ndị ozi, nke ozi ọma. N’ihi nke ahụ, anyị nwere ihe ùgwù na-akpali akpali nke ikwupụta Alaeze Jehova—nanị ezi ozi ọma nke a pụrụ izi ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụsi anya. Anyị na-anụ ọkụ n’obi maka ihe ọmụma bu ụzọ anyị nwetaworo nke eluigwe ọhụrụ ga-eji ezi omume chịa ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-emejupụta n’ime Paradaịs na-abịanụ. (2 Pita 3:13, 17) Ọ bụ nanị anyị nakwerewooro olileanya a, ọ na-agụsikwa anyị agụụ ike iso ndị ọzọ kerịta ya.
3 Ezi Ịhụnanya Na-akpali Anyị: Izisa ozi ọma bụ ọrụ na-azọpụta ndụ. (Rom 1:16) Ọ bụ ya mere anyị ji enwe nnukwu ọṅụ n’ịgbasa ozi Alaeze ahụ. Dị ka ezi ndị na-ezisa ozi ọma, anyị hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, nke ahụ na-akwalikwa anyị iso ha kerịta ozi ọma ahụ—ezinụlọ, ndị agbata obi, ndị enyi anyị, na ọtụtụ ndị ọzọ dị ka o kwere omume. Iji mkpụrụ obi dum na-arụ ọrụ a bụ ngosipụta kasị mma anyị pụrụ ime banyere ezi ịhụnanya anyị n’ebe ndị ọzọ nọ.—1 Tesa. 2:8.
4 Mmụọ Chineke Na-akwado Anyị: Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na mgbe anyị rụrụ ọrụ anyị nke ịkụ na ịkwọsa mkpụrụ Alaeze mmiri, na ọ bụ Jehova bụ onye “na-eme ka ọ na-aba ụba.” Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe anyị na-ahụ na-eme ná nzukọ anyị taa. (1 Kọr. 3:5-7) Ọ bụ mmụọ Chineke na-akwado anyị n’ọrụ izisa ozi ọma anyị, na-enyekwa anyị nnukwu ihe ịga nke ọma.—Joel 2:28, 29.
5 N’ihi agbamume ahụ dị na 2 Timoti 4:5 ‘ịrụ ọrụ nke onye na-ezisa ozi ọma,’ na n’ihi ịhụnanya anyị maka mmadụ nile, ka a kpalie anyị isoro ha kerịta ozi ọma Alaeze ahụ na-akpali akpali n’ohere ọ bụla, na-enwe obi ike na Jehova ga-anọgide na-agọzi ọrụ anyị.