Igbe Ajụjụ
◼ Gịnị ka anyị pụrụ ime iji welitekwuo ịdị ìrè nke nzukọ anyị?
Ụfọdụ pụrụ ịdị na-eche na ọ bụ nanị ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ka ọ dịịrị ịhụ maka ịga nke ọma nke nzukọ nile nke ọgbakọ n’ihi na ha na-eduzi ha ma na-eme ihe ka ọtụtụ n’ihe omume. N’ezie, anyị nile pụrụ ịtụnye ụtụ n’otu n’otu maka nzukọ ndị na-atọ ụtọ, baakwa uru. Anyị pụrụ inye aka mee ka nzukọ dịkwuo ìrè site n’ụzọ iri a na-esonụ:
Kwadoo tupu oge eruo. Mgbe anyị kwadoro nke ọma, nzukọ na-adọrọ mmasị anyị. Mgbe anyị nile mere nke a, nzukọ na-ekpokwu ọkụ ma na-ewuli elu karị. Na-abịachi anya. Ọnụ ọgụgụ dị elu bịara na-agba onye ọ bụla bịara ume karị, na-eme ka nghọta maka ịdị mkpa ịbịa nzukọ sie ike. Bịa n’oge. Ọ bụrụ na anyị anọdụ ala tupu ihe omume amalite, anyị pụrụ isonye n’abụ na ekpere mmalite ma si otú a ritezuo uru site ná nzukọ. Kwadebe nke ọma wee bịa. Site n’iweta Bible na mbipụta anyị (ndị) a ga-eji mee ihe ná nzukọ, anyị pụrụ isonye ma ghọta ihe a na-atụle karị. Zere ndọpụ uche. Anyị pụrụ ige ntị nke ọma karị mgbe anyị nọ n’ihu. Ịgba izu na ịgakarị n’ụlọ mposi pụrụ ime ka anyị na ndị ọzọ ghara ige ntị. Bụrụ onye na-ekere òkè. Mgbe ihe ka n’ọtụtụ n’ime anyị na-eweli aka ma na-aza ajụjụ, a na-agba ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ume ma na-ewuli ha elu karị site n’okwu nke okwukwe. Zaa azịza ndị dị mkpirikpi. Nke a na-enye ọtụtụ dị ka o kwere mee ohere ikere òkè. Anyị kwesịrị ịza azịza ndị dị mkpirikpi dị ka ihe a na-amụ si dị. Mezuo ihe omume. Dị ka ndị mmụta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma ọ bụ dị ka ndị na-ekere òkè ná Nzukọ Ije Ozi, kwadoo nke ọma, mụgharịa ya tupu oge eruo, hụ na ị bịara. Jaa ndị keere òkè mma. Gwa ndị ọzọ otú e si nwee ekele maka mgbalị ha. Nke a na-ewuli ha elu ma na-akwali ha ime nke ọma ọbụna karị n’ọdịnihu. Gbarịtanụ ibe unu ume. Ekele obiọma na mkparịta ụka ndị na-ewuli elu tupu na mgbe e nwesịrị nzukọ na-etinye ihe n’ihe ụtọ na uru ndị anyị na-enweta site n’ịbịa nzukọ.