Ịgbasikwu Àmà ahụ Ike Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso
1 Oge owuwe ihe ubi bụ oge ọṅụ. Ọ bụkwa oge ịrụsi ọrụ ike. E nwere nanị ntakịrị oge iji chịkọta ihe ọkụkụ. Ndị ọrụ agaghị anwa anwa gbuo oge n’ọrụ ha.
2 N’ikwu okwu n’ụzọ ihe atụ, Jisọs ji “ọgwụgwụ oge a” tụnyere oge owuwe ihe ubi. (Mat. 13:39) Anyị na-ebi n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a, na-enwe ntakịrị oge fọdụrụnụ maka ịgba àmà “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) Ka ọgwụgwụ na-eruwanye nso, ọ dị anyị mkpa ịmụbawanye òkè anyị na-ekere n’ozi. N’ihi gịnị? Jisọs kọwara, sị: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole.”—Mat. 9:37, 38; Rom 12:11.
3 Tụkwasị Uche n’Ọrụ Gị: Mgbe Jisọs malitere ọrụ nkwusa ya dị ebube, o nwere nanị afọ atọ na ọkara iji rụzuo ihe e kenyere ya ka o mee. O ji echiche nke ịdị ngwa mee nkwusa, na-asị: “Aghaghị m izikwa obodo nile ọzọ ozi ọma alaeze Chineke: n’ihi na e zitere m ime nke a.”—Luk 4:43.
4 Jisọs kụnyere echiche nke ịdị ngwa yiri nke ahụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya. (Mak 13:32-37) Ọ bụ ya mere “kwa ụbọchị, n’ụlọukwu Chineke na n’ụlọ nke aka ha, ha adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs, na Ọ bụ Kraịst.” (Ọrụ 5:42) Ọrụ ndị na-adịchaghị mkpa ebuteghị ụzọ ná ndụ ha. Ọ bụ ezie na ha dị ole na ole, ha nwere ihe ịga nke ọma n’ikwusa ozi ọma “n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.”—Kọl. 1:23.
5 E nwere ihe ka ukwuu mere anyị ga-eji zụlite otu echiche nke ịdị ngwa ahụ ugbu a, ebe “ọgwụgwụ ihe nile dị nso.” (1 Pita 4:7) Jehova esetịpụwo otu ụbọchị na awa maka ọgwụgwụ nke usoro ihe a. (Mat. 24:36) A ga-arụcha ọrụ nkwusa ahụ n’oge fọdụrụnụ. Ọ bụ nke ahụ mere anyị ji na-etinyekwu mgbalị iji ozi ọma ahụ jekwuru ọtụtụ mmadụ ndị ọzọ.
6 Site n’ịmụbawanye òkè anyị n’ọrụ nkwusa ahụ ka ọgwụgwụ na-eru nso, anyị ga-enwe afọ ojuju ịgwa Jehova, dị ka Jisọs mere, sị: ‘Anyị arụzuwo ọrụ ahụ i nyeworo anyị ka anyị rụọ.’—Jọn 17:4.