“Kwusaa Okwu Ya . . . Ngwa Ngwa”
1 Ọ bụrụ na i nweta ihe e dere “Ọ DỊ NGWA,” olee otú i si ele ya anya? Okwu ahụ bụ́ “ọ dị ngwa” pụtara “ihe chọrọ nlebara anya n’egbughị oge.” E nwere ezi ihe mere Pọl onyeozi ji nye ndị Kraịst ntụziaka ‘ikwusa okwu ahụ . . . ngwa ngwa.’ (2 Tim. 4:2, NW) Ị̀ na-emeghachi omume site n’ilebara ọrụ a anya n’egbughị oge?
2 Ọ pụrụ ịbụ na a kọọrọ Pọl na ụfọdụ n’ime ụmụnna ya nwere àgwà nke “ịdị ọbọ” dị ka ndị Kraịst. (Rom 12:11) Nke a mere ka ha rụpụta ihe dị nta ma belata ọṅụ ha gaara enwe site n’inyere ndị ọzọ aka.
3 Ụzọ Jisọs Si Lee Ozi ahụ Anya: Lee obi ụtọ Jisọs nwere n’ije ozi ya! O kwuru, sị: “Ihe oriri m bụ ka M na-eme ihe Onye zitere m na-achọ, ka M rụzuokwa ọrụ Ya.” Ihe nlereanya Jisọs kwaliri ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị ọ gbara ume site n’ịgwa ha na ‘ubi chara acha ka e were ihe dị n’ime ha.’ (Jọn 4:34, 35) Echiche nke ịdị ngwa o gosipụtara n’oge ije ozi ya dum pụtara ìhè mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘na-arịọ Onyenwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipu ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.’ (Mat. 9:38) Jisọs ghọtara na ọrụ ya bụ ime nkwusa, o kpebisikwara ike na ya agaghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie ya ime otú ahụ.
4 Gịnị Banyere Anyị? Taa, e nwere ịdị ngwa ka ukwuu karịa mgbe ọ bụla ọzọ ime ka ọrụ nkwusa ahụ na-aga n’ihu. N’ọtụtụ akụkụ ụwa, ubi achaala maka iwe ihe ubi. Ọbụna n’ala ndị yiri ka a gbazuwo àmà na ha, a na-eme ọtụtụ puku mmadụ baptism kwa afọ. Ka ọgwụgwụ nke usoro ihe a na-abịaru nso n’ike n’ike, e nwere “ihe buru ibu a ga-arụ n’ọrụ Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 15:58, NW) Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ọ dị mkpa ka anyị tinyekwuo mgbalị n’isoro ndị ọzọ na-ekerịta ozi Alaeze ahụ.
5 Ka anyị mikpuo onwe anyị n’ijiri ozi ọma ahụ rute ndị ọzọ, ma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma n’ebe ọ bụla ọzọ a pụrụ ịhụ ndị mmadụ n’ókèala anyị. Site n’ikere òkè n’ime nkwusa ahụ n’ụzọ zuru ezu dị ka o kwere mee, anyị na-egosipụta n’ụzọ doro anya na anyị na-ebute Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ anyị. (Mat. 6:33) Anyị ịnọgidesi ike n’ikwusa okwu ya ngwa ngwa ga-ewetara anyị ọṅụ dị ukwuu.