Gịnị Ka Ị Ga-agwa Onye Na-ekweghị na Chineke?
1 “Ekweghị m na Chineke,” ka otu prọfesọ si Poland gwara otu onye ozi ala ọzọ nọ n’Africa. Otú ọ dị, nwanna nwanyị ahụ sooro nwanyị ahụ kwurịta okwu ma nye ya akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? Mgbe onye ozi ala ọzọ ahụ gaghachiri n’izu na-eso ya, prọfesọ ahụ gwara ya, sị: “Abụghịzi m onye na-ekweghị na Chineke!” Ọ gụwo akwụkwọ Creation ahụ dum ma rịọ ka e duziere ya ọmụmụ Bible. Gịnị ka ị pụrụ ime iji nwee ike ịgbara ndị na-ekwu na ha ekweghị na Chineke àmà? Nke mbụ, tụlee ihe dị iche iche mere ndị mmadụ ji na-ekwu nke a.
2 Ihe Ndị So Na-akpata Ekwenyeghi Ekwenye: Ọ bụghị ndị nile na-ekweghị na Chineke ka a zụlitere n’ụzọ dị otú ahụ. Ọtụtụ bụ ndị a zụlitere n’otu ụdị okpukpe, ọ dịkwa mgbe ha kwere na Chineke dị. Otú ọ dị, nsogbu ahụ ike siri ike ma ọ bụ nsogbu ezinụlọ ma ọ bụ ikpe na-ezighị ezi ụfọdụ ndị ha hụworo mere ka okwukwe ha daa mbà. Nye ndị ọzọ, ihe ndị a kụziere ha n’ụlọ akwụkwọ ndị dị elu enwewo mmetụta na-adịghị mma n’echiche ha nwere banyere Chineke. Rịba ama ihe atụ ndị na-esonụ banyere ndị na-ekweghị na Chineke bụ́ ndị mesịrị kwenyesie ike na Jehova Chineke ma ghọọ Ndịàmà ya.
3 Otu nwanyị na Paris bu ọrịa ọkpụkpụ nke na-agwụ ike pụta ụwa. Ọ bụ ezie na e mere ya baptism dị ka onye Katọlik, o kwuru na ya ekweghị na Chineke. Mgbe ọ jụrụ ndị nọn ihe mere Chineke ji kwe ka ya buru ahụ ezughị okè ahụ pụta ụwa, azịza ha bụ: “N’ihi na ọ hụrụ gị n’anya.” Ọ jụrụ ikwere echiche ahụ ezi uche na-adịghị na ya. Ọzọkwa, tụlee otu onye na-eto eto na Finland bụ́ onye a chọpụtara na o nwere ọrịa uru ahụ na-enweghị ngwọta, bụrụkwa onye na-anọ n’oche nkwagharị mgbe nile. Nne ya kpọgaara ya otu onye Pentikọstal bụ́ onye kwuru na ya na-agwọ ndị ọrịa. Ma a gwọghị ya n’ụzo ọrụ ebube. N’ihi ya, nwa okorobịa ahụ enwekwaghị mmasị n’ebe Chineke nọ ma ghọọ onye na-ekweghị na ya.
4 A zụlitere otu nwoke nọ na Honduras dị ka onye Katọlik ma ọ mụrụ banyere ụkpụrụ Ọchịchị Ọha na Eze na ekweghị na Chineke. N’ịbụ onye ihe a kụziiri ya na mahadum mere ka o kwere na ihe a kpọrọ mmadụ sitere n’evolushọn, ọ kwụsịrị ikwere na Chineke. N’otu aka ahụ, a zụlitere otu nwanyị nọ na United States dị ka onye Metọdist. Ọ mụrụ banyere akparamàgwà mmadụ na mahadum. Olee otú o si metụta nkwenkwe ya? O kwuru, sị: “N’otu oge okpomọkụ ha mebiri okwukwe dum m nwere n’okpukpe.”
5 Iru n’Obi nke Ndị Nwere Obi Eziokwu: Ọ ga-amasị ọtụtụ ndị na-ekwu na ha ekweghị na Chineke ịma ma è nwere ngwọta maka nsogbu ahụ ike, adịghị n’otu ezinụlọ, ikpe na-ezighị ezi, na ihe ndị ọzọ. Ha nwere mmasị n’ezie n’inweta azịza nye ajụjụ ndị dị ka: ‘N’ihi gịnị ka ihe ọjọọ ji dịrị?’ ‘N’ihi gịnị ka ihe ọjọọ ji adakwasị ndị ezi mmadụ?’ na ‘Gịnị bụ nzube nke ndụ?’
6 A zụlitere otu di na nwunye bi na Switzerland ịbụ ndị na-ekweghị na Chineke. Mgbe mbụ e ji eziokwu ahụ kpọtụrụ ha, ha aṅaghị ntị. Ma ha nwere nnukwu nsogbu ezinụlọ ma na-achọ ịgba alụkwaghịm. Mgbe Onyeàmà ahụ gaghachiri, o ji Bible gosi di na nwunye ahụ ụzọ isi merie nsogbu ha. Ndụmọdụ dị irè dị n’Akwụkwọ Nsọ tụrụ di na nwunye ahụ n’anya, ha kwekwara ka e duziere ha ọmụmụ Bible. E wusikwuru alụmdi na nwunye ha ike, ha nwere ọganihu n’ụzọ ime mmụọ, e mekwara ha baptism.
7 Ihe Ị Pụrụ Ịgwa Onye Na-ekweghị na Chineke: Mgbe mmadụ gwara gị na ya ekweghị na Chineke, gbalịa chọpụta ihe mere o ji kwuo otú ahụ. Ọ̀ bụ n’ihi ihe a kụziiri ya n’ụlọ akwụkwọ, nsogbu ndị o nweworo, ka ọ̀ bụ ihu abụọ e nwere n’okpukpe na ozizi ụgha ndị ọ hụworo? Ị pụrụ ịjụ ya, sị: “Ị̀ nọwo na-eche otù a eri oge?” ma ọ bụ “Gịnị mere i ji mee mkpebi ahụ?” Azịza ya ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-ekwu. Mgbe a chọrọ arụmụka siri ike, akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You? pụrụ ịbụ nnọọ ihe a chọrọ.
8 Ị pụrụ iso onye na-ekweghị na Chineke nwee mkparịta ụka site n’ịjụ, sị:
◼ “Ọ̀ dịtụwo mgbe i chere, sị: ‘Ọ bụrụ na Chineke dị, n’ihi gịnị ka e ji nwee oké ịta ahụhụ na ikpe na-ezighị ezi n’ụwa?’ [Nye ohere maka nzaghachi.] M̀ pụrụ igosi gị ihe Bible na-ekwu banyere isiokwu a?” Gụọ Jeremaịa 10:23. Mgbe ị gụsịrị ya, jụọ ya ihe bụ echiche ya banyere akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ. Mgbe ahụ gosi ya peji nke 16 na nke 17 na broshuọ bụ́ Will There Ever Be a World Without War? Ma ọ bụ, kama nke ahụ, ị pụrụ iji isi nke 10 nke akwụkwọ Creator mee ihe. Gwa ya ka o nweta akwụkwọ ahụ ma gụọ ihe dị n’ime ya.—Iji nwetakwuo aro ndị ọzọ, lee akwụkwọ Reasoning, peji nke 150-151.
9 N’eziokwu, ọ bụghị ndị nile na-ekweghị na Chineke ga-anata eziokwu ahụ. Ma e nwere ọtụtụ ndị dị njikere ịtụle echiche ọzọ. Jiri ezi izuzu, nrụgide na, nke kasị nke, ike nke Okwu Chineke nyere ha aka ịhụ eziokwu ahụ.—Ọrụ 28:23, 24; Hib. 4:12.