Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/13 p. 4-6
  • Ahụmahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ahụmahụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Broshọ Bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Ṅomie Jehova Site n’Inwe Ezi Nchegbu Maka Ndị Ọzọ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Jiri Broshuọ Kpọsaa Ozi Ọma Alaeze Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Broshuọ Ọhụrụ A Ga-enyefe!
    Ozi Alaeze Anyi—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2013
km 12/13 p. 4-6

Ahụmahụ

◼ Ọstrelia: O nwere nwoke onye Ọstrelia aha ya bụ Jọn. Ọ gụrụ akwụkwọ nke ọma. Ọ na-aga chọọchị mgbe ọ bụ nwata. Ma, mgbe ọ ghọrọ dimkpa, o kwetaghịzi na Chineke dị. Otu ụbọchị, otu ọsụ ụzọ nyere ya akwụkwọ bụ́ Was Life Created?, o mechakwara nye ya akwụkwọ bụ́ Origin of Life. Nwanna nwoke ahụ nọkwa na-eme ya nọtụ, ya ewegara ya Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! ọhụrụ ọ bụla na-ekwu gbasara ihe e kere eke, onye okike ma ọ bụkwanụ nke ọ bụla na-ekwu gbasara amụma ndị dị na Baịbụl. Mgbe nwanna nwoke ahụ hụrụ na ihe Jọn na-agụta n’akwụkwọ ndị ahụ eruwela ya n’obi, o nyere ya akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? Mgbe ọ gụchara ya, ọ malitere na-eche na ọ ga-abụkwanụ na Chineke dị. Ọ bụ mgbe ahụ ka nwanna ahụ nyeziri ya akwụkwọ Bible Na-akụzi. O gosiri ya peeji nke 20, paragraf nke 8 nakwa peeji nke 23-24, paragraf nke 13-16. Amaokwu Baịbụl ndị dị na paragraf ndị ahụ mere ka o kwuo na ya ga-amaliteghachi ileba anya na Baịbụl ka ọ mara ma ò nwere uru ọ ga-abara ya.

◼ Meksiko: O nwere otu nwoke gwara nwanna anyị na ya ekwetaghị na Baịbụl bụ Okwu Chineke. Nwanna ahụ gwara ya na ya ga-achọ ịgwa ya ihe gosiri na Baịbụl bụ Okwu Chineke. Ihe nwanna ahụ gwara ya ruru ya n’obi. Ihe kacha metụ nwoke ahụ n’ahụ́ bụ ihe ha mụrụ gbasara iwu dị iche iche Chineke nyere anyị. N’ihi ya, o kwuru, sị: “Mgbe mbụ, ọ na-abụ anyị gụọ Baịbụl, ya adị m ka o nweghị ihe dị iche n’ihe ọ na-ekwu na ihe akwụkwọ ọ bụla ọzọ na-ekwu. Ihe ọ bụla anyị gụtara na ya anaghịkwa emetụ m n’obi. Ma ugbu a, m na-echebara ihe ọ bụla anyị gụtara na ya echiche. Obi m na-amakwa m ikpe ma anyị gụọ gbasara ihe Chineke na-achọghị ka anyị mee.”

◼ Amerịka: N’Amerịka, otu nwanna nwoke na nwunye ya nọ ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo. Ha dosara akwụkwọ anyị ndị e biri n’asụsụ dị iche iche na tebụl ka ọ ga-abụ onye na-agafe, ya hụ nke dị ya mma, ya ewere. Mgbe otu nwaanyị onye Taịwan rutere ebe ahụ, ọ chọrọ iwere akwụkwọ ọ bụla ọ ga-agụ ka obi dịtụwa ya ụtọ. Obi anaghị adị ya ụtọ n’oge ahụ n’agbanyeghị na ihe dịrị ya ná mma. Nwaanyị a kwere na Chineke dị, ma o chere na Baịbụl bụ akwụkwọ ndị Bekee. Obi ya gwara ya na Baịbụl nwere ike ime ka obi dịtụwa ya ụtọ. Nwanna ahụ na nwunye ya ji akwụkwọ Baịbụl Na-akụzi na broshọ bụ́ Lasting Peace and Happiness—How to Find Them malite ịmụrụ ya ihe. Mgbe ha mụchara isi nke mbụ n’akwụkwọ Bible Na-akụzi, kama ịmụwa isi nke abụọ, ha gara na broshọ ahụ mụọ ebe kwuru gbasara Baịbụl. Mgbe ha mụchara paragraf isii n’isiokwu ahụ, nwaanyị ahụ kwuru na o nweghị akwụkwọ ndị okpukpe dị ka Baịbụl. Mgbe ha mụrụ ebe nke kwuru banyere amụma Baịbụl ndị mezurula emezu, o kwuru na o nweghị akwụkwọ na-ekwu eziokwu ka Baịbụl.

◼ Japan: O nwere otu nwoke gwara otu nwanna na ya ekweghị na Chineke dị. Ma, ihe a ọ gwara nwanna ahụ emeghị ka ọ ghara ịna-aga na nke ya. Mgbe ọ bụla o nwetara Teta! nwere isiokwu bụ́ “È Kere Ya Eke?” ya agakwuru ya ka ha tụlee ya. Ka oge na-aga, nwoke ahụ gbanwere obi ya, wee na-eche na ọ ga-abụ na Chineke dị. Ugbu a, o kwetala na Chineke dị. Ya na nwanna nwoke ahụ jikwa broshọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! amụ ihe.

◼ Kanada: E nwere ụbọchị otu nwaanyị si n’ụlọ ya na-apụ ka ọ banye n’ụgbọala ya, otu nwanna nwaanyị enye ya Ụlọ Nche na Teta! Mgbe nwanna nwaanyị ahụ gaghachiri na nke ya, ọ gwara ya na ya ekweghị na Chineke dị nakwa na ya achọghị ịnụ ozi ọma. Ihe ahụ o kwuru emeghị ka nwanna nwaanyị ahụ ghara ịchọrọ ya gaa ọzọ. O wegaara ya broshọ bụ́ A Satisfying Life—How to Attain It. Mgbe o rutere na nke ya, ọ gwara ya na ya ma na o kweghị na Chineke dị, ma, ihe o ji chọrọ ya bịawa bụ na otú o si bụrụ naanị ya na-azụ ụmụ ya na-emetụ ya n’obi. Ọ sapetara peeji nke anọ na broshọ ahụ ma gosi ya paragraf nke isii. Paragraf ahụ kwuru ebe anyị ga-enweta ihe ga-enyere anyị aka ibi ezigbo ndụ. Ọ gwara ya ka ọ gụọ isi nke abụọ na broshọ ahụ, bụ́ ebe kwuru otú ndị nne na nna kwesịrị isi na-azụ ụmụ ha. Nwaanyị ahụ ji obi ụtọ nara broshọ ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya