Gịnị Pụrụ Inyere Anyị Aka Iguzosi Ike n’Okwukwe?
1 Kemgbe anyị malitere iso nzukọ Jehova na-akpakọrịta, ọganihu ime mmụọ anyị aghọwo ihe na-enye anyị ọṅụ! Ma, iji nọgide na-abụ ndị ‘gbagidere mkpọrọgwụ, ndị a na-ewuli elu, na ndị guzosiri ike n’okwukwe,’ ịnọgide na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ dị mkpa. (Kọl. 2:6, 7) Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ enwewo ọganihu n’ụzọ ime mmụọ, ụfọdụ abụrụwo ndị e bupụrụ n’ihi ‘eguzosighị ike n’okwukwe.’ (1 Kọr. 16:13) Anyị pụrụ igbochi nke a ime anyị. N’ụzọ dị aṅaa?
2 Ihe Omume Ime Mmụọ A Na-emechi Anya: Na-enwe usoro ihe ime mmụọ dị mma n’ime nzukọ Jehova. A na-egbo mkpa ime mmụọ anyị n’ụba n’ebe a. Nzukọ ọgbakọ na mgbakọ dị iche iche na-akwali anyị itokwu eto n’ụzọ ime mmụọ na ịkwụsi ike, ma ọ bụrụhaala na anyị na-agachi ha anya iji rite uru ndị dị na ha. (Hib. 10:24, 25) Usoro chiri anya nke ịgụ Bible, magazin Ụlọ Nche na Teta!, na akwụkwọ ndị na-atụle nri siri ike nke Okwu Chineke ga-eme ka mkpọrọgwụ ime mmụọ anyị na-abami abami ma sie ike. (Hib. 5:14) Isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ onwe onye na iji ịdị uchu na-arụ ọrụ iji ruo ha ga-ewetakwa abamuru ndị na-adịgide adịgide.—Fil. 3:16.
3 Inweta Enyemaka Site n’Aka Ndị Tozuru Okè: Gbalịa ime ka ndị gị na ha na-akpakọrịta gụnye ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ n’ọgbakọ. Mara ndị okenye, ebe ọ bụ ha bụ ndị bụ́ isi pụrụ iwusi anyị ike. (1 Tesa. 2:11, 12) Nakwere ndụmọdụ ma ọ bụ aro ọ bụla ha pụrụ inye gị. (Efe. 4:11-16) Ndị ohu na-eje ozi nwekwara mmasị inyere ndị ọzọ aka ịbụ ndị guzosiri ike n’okwukwe, ya mere na-elekwasị ụmụnna ndị a anya maka agbamume.
4 Ị̀ chọrọ enyemaka n’ihe banyere ozi? Kọọrọ ndị okenye, ma rịọ maka enyemaka. Ma eleghị anya ha pụrụ ịgụnye gị n’usoro ihe omume ahụ bụ́ Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka. Ị̀ bụ onye e mere baptism ọhụrụ? Ịmụ akwụkwọ Ozi Anyị na itinye ihe ndị dị n’ime ya n’ọrụ ga-eme ka i nwee ọganihu ngwa ngwa iru ntozu okè ime mmụọ. Ị̀ bụ nne ma ọ bụ nna? Nọgide na-ewusi ọnọdụ ime mmụọ nke ụmụ gị ike.—Efe. 6:4.
5 Site n’ịbụ ndị gbanyere mkpọrọgwụ na ndị guzosiri ike n’okwukwe, anyị na Jehova na-enwe mmekọrịta chịrị anya, anyị na-esokwa ụmụnna anyị na-enwe mkpakọrịta ịhụnanya. Nke a na-eme ka anyị nwee ike iguzogide mwakpo Setan ma na-eme ka olileanya anyị maka ọdịnihu ebighị ebi sikwuo ike.—1 Pita 5:9, 10.