Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/06 p. 5
  • Onye Dị Njikere Inye Aka Mgbe Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Dị Njikere Inye Aka Mgbe Nile
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Ọgbakọ Ndị Kraịst—Ebe E Si Enweta Enyemaka Na-ewusi Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • “Kpọọ Ndị Okenye”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 2/06 p. 5

Onye Dị Njikere Inye Aka Mgbe Nile

1. Olee otú mmadụ pụrụ isi daa mbà n’ụzọ ime mmụọ?

1 Anna bụ nwanna nwanyị di ya na-ekweghị ekwe. Ọ na-arụ ọrụ na-eri ya oge dị ukwuu. Ọ na-esikwara ya ike ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anya, ikere oké n’ozi ubi, na ịmụ Okwu Chineke. Ọ bụ ezie na ọ ka hụrụ Jehova n’anya, ọ kwụsịrị ije ozi. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ndị okenye ọnọdụ ya na-ewute nyeere ya aka ịmaliteghachi ije ozi.

2. Olee otú Ndị Kraịst nile pụrụ isi gosi na ha dị njikere inye aka mgbe nile?

2 Mmadụ ịnabata enyemaka ime mmụọ ndị a na-enye n’ọgbakọ Ndị Kraịst na-egosi na onye ahụ na-adabere n’ebe Jehova n’onwe ya nọ. Ndị okenye ọgbakọ na-eṅomi ụzọ ịhụnanya Jizọs Kraịst si elekọta ndị ya site n’ịchọ ohere ha ga-eji gbaa ndị na-adịghị emecha nke ọma n’ọgbakọ ume ma nye ha ụdị enyemaka ahụ́ ha chọrọ. (1 Tes. 5:14) Ọtụtụ mgbe, ihe ahụ́ ha chọrọ pụrụ ịbụ nanị ka e jiri okwu ọma ndị e si n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-emesighachi mmadụ obi ike nweta, gbaa ha ume. Ndị Kraịst nile kwesịrị ịgbalị inyere ndị datụrụ mbà n’obi aka. Ọ bụghị nanị ndị okenye ka nke ahụ dịịrị. Obi abụọ adịghị ya na onye ọ bụla n’ime anyị achọpụtala na okwu e chere echiche ‘kwuo na mgbe kwesịrị ya’ na-akpa ike dị egwu.—Ilu 25:11; Aịsa. 35:3, 4.

3, 4. Gịnị ka inyere ndị ọzọ aka na-agụnye, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee nke a?

3 Gakwuru Ha: Ọ bụrụ na anyị nwere ezi mmasị n’ebe ndị chọrọ enyemaka nọ, ọ dị anyị mkpa ịgakwuru ha n’onwe anyị, igosi ha mmetụta anyị nwere n’ebe ha nọ, na igosi na anyị ji obi anyị nile na-eme ya. Mgbe Jonatan chọpụtara ọnọdụ ọjọọ Devid nọ na ya, o ‘biliri, jekwuru Devid n’oké ọhịa, mee ka aka ya dị ike.’ (1 Sam. 23:15, 16) Jiri ụzọ dị nwayọọ na-enyere ndị ọzọ aka. Okwu ndị i kwuru, nke ihe kpaliri gị ikwu ya bụ ezi ọmịiko i nwere n’ebe onye ahụ nọ, kasị arụpụta ezigbo ihe. Ọzọkwa, Jizọs ji ihe atụ doro anya kọwaa na iji riteghachi nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị n’uru, ọ na-ewe mgbalị siri ike e ji nlezianya mee. (Luk 15:4) Anyị inwe ọchịchọ siri ike inyere mmadụ aka ga-akpali anyị ịnọgidesi ike na-enyere ya aka, ọbụnadị mgbe ọganihu ya na-apụtaghị ìhè ngwa ngwa.

4 Lee nnọọ ihe na-agba ume ọ bụ mgbe anyị kpọrọ ndị ọzọ òkù, dị ka ndị anyị na ha nọ n’otu Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, isonyere anyị n’ozi ubi! Ka anyị na-enyere onye anyị na ya na-efekọ Jehova ofufe aka ikere òkè n’ozi ubi, anyị pụrụ iji ohere ahụ mee ka aka ya dị ike. Oge dị otú ahụ na-enye obi ụtọ, bụ́ nke anyị na ha ji jekọọrọ Jehova ozi, na-abụrụ ndị chọrọ ịmaliteghachi mewe nke ọma n’ọgbakọ ihe agbamume karịsịa.

5. N’ọnọdụ ụfọdụ, olee ụdị enyemaka ndị okenye pụrụ inye?

5 Ndokwa E Ji Ịhụnanya Mee: Ndị kwụsịrịla ije ozi ma ọ bụ iso ọgbakọ na-akpakọrịta ruo oge ụfọdụ pụrụ ịchọkwu enyemaka iji mee ka okwukwe ha sikwuo ike. Iji akwụkwọ bụ́ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe, Bịaruo Jehova Nso, ma ọ bụ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? duziere ha ọmụmụ Bible pụrụ ịbụ nnọọ ihe ahụ́ ha chọrọ. Ebe ọ bụ na e meela onye ahụ baptizim, ọ dịchaghị mkpa ka ọmụmụ ihe ahụ gaa n’ihu ruo ogologo oge. Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị ịmụrụ anya iji chọpụta onye ọ dị mkpa ka e jiri ndokwa a nyere aka.—Lee Igbe Ajụjụ ndị dị n’Ozi Alaeze Anyị nke November 1998 na November 2000.

6. Olee otú otu nwanna nwanyị si maliteghachi ime nke ọma n’ọgbakọ?

6 Anna, bụ́ onye a kpọrọ aha ya ná mmalite, ji obi ekele nakwere ndokwa ndị okenye mere ka otu nwanna nwanyị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ duziere ya ọmụmụ Bible. Ọ bụ nanị ugboro anọ ka a mụụrụ Anna ihe, ya amaliteghachi ịbịaru Jehova nso. Ọ maliteghachiri ịbịa nzukọ ọgbakọ ma nweghachi ọchịchọ nke ito Jehova Chineke n’ihu ọha. Nwanna nwanyị ahụ nyekwaara ya aka n’ozi ubi site n’ịkpọ ya aga na nke ndị ọzọ ọ na-amụrụ Bible ruo mgbe Anna nwetaghachiri ike ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Enyemaka bụ nanị ihe dị Anna mkpa iji maliteghachi ime nke ọma n’ọgbakọ!

7. Olee uru ndị a na-erite n’inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ?

7 Ime ka ndị nọ ná mkpa gbasie ike na-ewetara mmadụ nile ngọzi. Onye a na-enyere aka na-enweta obi ụtọ nke ịbịaru Jehova nso na ịmaliteghachi kerewe òkè n’ihe ndị a na-eme ná nzukọ Ya. Obi na-adị ndị okenye ụtọ ịhụ ọganihu ime mmụọ dị otú ahụ. (Luk 15:5, 6) Ọgbakọ na-abịa dịrị n’otu, ebe ọ bụ na mmadụ nile na-egosi ezi mmasị n’ebe ibe ha nọ. (Kọl. 3:12-14) Anyị nwere nnọọ ezi ihe mere anyị ga-eji na-eṅomi Jehova, bụ́ onye dị njikere inyere anyị aka mgbe nile!—Efe. 5:1.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya