Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/00 p. 1
  • Anyị Na-ekwusa Ozi Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Na-ekwusa Ozi Ọma
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Na-eṅomi Jehova Chineke Anyị, Bụ́ “Onye Obi Ụtọ”
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • “Ozi Ọma”
    Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ
  • E Nwere Ozi Ọma Mmadụ Niile Kwesịrị Ịnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 3/00 p. 1

Anyị Na-ekwusa Ozi Ọma

1 Lee ihe ùgwù magburu onwe ya anyị nwere ịbụ ndị na-ezisa “ozi ọma nke ezi ihe!” (Rom 10:15) Anyị nwere ozi na-enye ume ọhụrụ ikesara ndị mmadụ bụ́ ndị nọ n’oké ọgba aghara na obi nkoropụ. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ha aka ịghọta na anyị na-ezisa “ozi ọma nke ezi ihe”? (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.)—Aịsa. 52:7.

2 Kwadebe Ozi Na-ewuli Elu: Mkparịta ụka anyị mgbe a nọ n’ozi ga-enwe mmetụta dị mma ma ọ bụrụ na anyị etinye uche n’ihe ndị dị mma. N’ihi ya, mgbe anyị na-akwadebe ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ, nke anyị ga-eji mee ihe ma na-atụleghachi akwụkwọ anyị ga-enyefe, anyị kwesịrị ime ka akụkụ ndị na-ewuli elu n’ozi ahụ pụta ìhè. Site n’iji obi ike na ịnụ ọkụ n’obi na-akụnye n’ime ndị ọzọ olileanya anyị dabeere na Bible, anyị pụrụ ịtụ anya na ọ ga-arụpụta ihe ndị na-agba ume.—Ilu 25:11.

3 Ọ bụ ezie na anyị na-enwe ọmịiko mgbe ndị mmadụ kwuru otú ọnọdụ ụwa, nke na-ajọwanye njọ siworo metụta ha, anyị kwesịrị ime ka ha mata ezi ihe ngwọta e nwere maka nsogbu ụmụ mmadụ, Alaeze Chineke. Ọbụna mgbe anyị na-ekwu banyere “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀” Jehova na-abịanụ, anyị ga-achọ igosi otú nke a si bụrụ n’ezie ‘ozi ọma nye ndị e wedara n’ala.’ (Aịsa. 61:1, 2) Anyị pụrụ imesi ndị na-ege anyị ntị obi ike na ihe nile Jehova na-eme ga-eweta obi ụtọ kasịnụ ma na-rụpụta ihe kasị mma n’ikpeazụ.

4 Jiri Ezi Ọṅụ Na-ekwusa Eziokwu Ahụ: A na-akpalikwu ndị mmadụ ige ntị mgbe ha hụrụ ihu ọchị na obi ike anyị ji na-ekwu okwu. Ọ bụrụ na anyị egosi nchekwube, ndị na-ege anyị ntị ga-achọpụta na anyị ‘na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya ahụ.’ (Rom 12:12) A pụrụ ịkpalikwu ha ịṅa ntị n’ozi ọma ahụ. N’ezie, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-enwe omume ziri ezi na nke ọṅụ mgbe nile n’akụkụ ọ bụla nke ozi anyị.

5 Dị ka ndị ozi nke ozi ọma ahụ, anyị na-eme ihe karịrị ịgwa ndị mmadụ okwu. Ime nkwusa anyị, na-enye olileanya e ji n’aka nke ndụ ka mma ugbu a nakwa n’ọdịnihu. (1 Tim. 4:8) Ka anyị na-ejekwuru onye ọ bụla, ihe anyị na-ekwu ga-egosi ọnọdụ obi anyị dị mma, anyị ga-enyekwara ndị mmadụ aka ịnakwere ozi ọma ahụ. Site n’ichebara ihe anyị na-ekwu echiche, ka anyị kpalie ndị nwere obi eziokwu ịnabata ozi ọma ahụ na-akpali akpali nke anyị na-ekwusa!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya