Na-eṅomi Jehova Chineke Anyị, Bụ́ “Onye Obi Ụtọ”
1 N’ezie, Jehova chọrọ ka ụmụ mmadụ na-enwe obi ụtọ. Okwu ya, bụ́ Bible, na-eme ka anyị na-atụ anya ngọzi ndị magburu onwe ha ọ kwadebeere ụmụ mmadụ. (Aịsa. 65:21-25) O kwesịrị ido ndị anyị na-ezi ozi ọma anya na “ozi ọma dị ebube nke Chineke onye obi ụtọ” anyị na-ezi ha na-eme anyị obi ụtọ. (1 Tim. 1:11) Otú anyị si ekwusa ozi Alaeze ahụ kwesịrị igosi na anyị hụrụ eziokwu n’anya, nakwa na anyị nwere ezi mmasị n’ebe ndị anyị na-ekwusara ya nọ.—Rom 1:14-16.
2 N’eziokwu, ọ naghị adịcha mfe mgbe nile inwe ihu ọchị. N’ókèala ụfọdụ, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-ege ntị n’ozi Alaeze ahụ. E nwere ike inwe oge anyị na ihe isi ike na-alụ. Iji nọgide na-enwe ọṅụ, anyị kwesịrị icheta na ọ dị mkpa ka ndị bi n’ókèala anyị nụ ozi ọma Alaeze ahụ anyị na-ekwusa ma ghọta isi ya. (Rom 10:13, 14, 17) Ịdị na-atụgharị nke a n’uche mgbe nile ga-enyere anyị aka ịnọgide jiri obi ụtọ na-eme ka ndị mmadụ mara ndokwa Jehova ji obi ebere ya mee maka nzọpụta.
3 Hụ na Ozi Gị Bụ Ozi Ọma: Anyị kwesịkwara ilezi anya banyere ihe anyị na-ekwu. Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịmalite mkparịta ụka site n’ikwu banyere otu nsogbu e nwere ma ọ bụ otu ihe a kọrọ n’akụkọ ụwa nke ka dị n’obi ndị mmadụ, anyị kwesịrị izere ịdị na-ekwukarị banyere ihe ndị na-agbawa obi. Ọrụ anyị bụ izi ndị mmadụ “ozi ọma nke ezi ihe.” (Aịsa. 52:7; Rom 10:15) Ozi ọma a dabeere ná nkwa Chineke kwere ime ka ọdịnihu anyị ka mma. (2 Pita 3:13) N’iburu nke a n’uche, jiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ ‘kechie ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa.’ (Aịsa. 61:1, 2) Nke a ga-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ịdị na-enwe ihu ọchị mgbe nile ma na-enwe obi ụtọ.
4 Ndị mmadụ ga-achọpụtarịrị na obi dị anyị ụtọ mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma. Ya mere, ka anyị na-eṅomi Jehova Chineke anyị, bụ́ “onye obi ụtọ,” mgbe nile ka anyị na-ezi ndị nọ n’ókèala anyị ozi ọma Alaeze ahụ.