Igbe Ajụjụ
◼ Ònye kwesịrị inweta baajị mgbakọ distrikti?
Baajị mgbakọ pụrụ inye aka n’ebe ọ dị ukwuu n’ime ka a mara ụmụnna anyị nakwa n’ịkpọsa mgbakọ ahụ. Otú ọ dị, e kwesịghị ikesa ha aghara aghara. Ha na-eme ka a mata onye yi ya dị ka onye nọ n’ọnọdụ dị mma n’otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova.
Kaadị ahụ nwere ohere maka aha onye ahụ nakwa aha ọgbakọ ya. N’ihi ya, onye ahụ aghaghị ịnọwo n’ọgbakọ ahụ e dere aha ya na kaadị ahụ ruo ogologo oge ụfọdụ kwesịrị ekwesị. Society na-ezigara ọgbakọ ọ bụla kaadị. Ọ ga-ekwesị ekwesị inye onye nkwusa ọ bụla e mere baptism na nke a na-emebeghị baptism kaadị n’otu n’otu. Ụmụaka na ndị ọzọ na-abịachi nzukọ ọgbakọ anya bụ́kwa ndị na-enwe ọganihu iji kere òkè n’ozi ubi pụkwara ịnata. Ọ gaghị ekwesị ekwesị inye onye a chụrụ n’ọgbakọ baajị mgbakọ.
Mgbe e nwetara kaadị ndị ahụ, ndị okenye kwesịrị ịhụ na e kesara ha n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị a.