Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/00 p. 4-5
  • Gee Ntị n’Okwu Nsọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gee Ntị n’Okwu Nsọ
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Nụrụ, Wee Tụkwasị Ihe Mmụta n’Amamihe Gị’
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Gee Ntị Ka Ị Mụta Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke” nke 1997
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nke 1999
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 9/00 p. 4-5

Gee Ntị n’Okwu Nsọ

1 Ọ bụghị ihe ọ bụla mmadụ kwuru kwesịrị ka e geere ya ntị pụrụ iche. Ma mgbe Chineke na-ekwu okwu, e nwere ihe dị mkpa mere a ga-eji gee ntị. (Deut. 28:1, 2) Obi dị anyị ụtọ na ndị odeakwụkwọ nwere ike mmụọ nsọ dekọrọ “okwu si n’ọnụ Chineke pụta” maka abamuru anyị. (Rom 3:2) Mgbakọ distrikti na-abịanụ ga-enye anyị nnọọ ohere ịnụ okwu ndị a ka a na-agụ ma na-atụle ha. Olee otú ị pụrụ isi gee ntị karịsịa?

2 Bịarute n’Oge Kwa Ụtụtụ: Cheedị banyere obi ụtọ ndị Israel nwere mgbe a gwara ha ka ha zute Jehova n’Ugwu Saịnaị ịnụrụ Iwu ya! (Ọpụ. 19:10, 11, 16-19) Ọ bụrụ na i nwere àgwà yiri nke ahụ n’ebe ịnara ntụziaka Jehova ná mgbakọ distrikti dị, ị ga-eme ndokwa irute n’oge kwa ụbọchị. Anyị apụghị ige ntị n’usoro ihe omume nile ma ọ bụrụ na anyị abata n’azụ oge ma dọpụ uche ndị ọzọ ka anyị na-agbalị ịchọta oche. Usoro ihe omume ahụ ga-amalite n’elekere anya 9:20 nke ụtụtụ na Friday na n’elekere anya 9:00 nke ụtụtụ na Saturday na Sunday.

3 Ọbụna ụfọdụ ndị na-abịa n’oge adịghị anọ n’oche ha maka mmalite nke nnọkọ ahụ. N’ihi gịnị? Ha na-echere ruo mgbe onyeisi oche kpọrọ abụ mmeghe tupu ha akwụsị mkparịta ụka ha na ndị enyi ha na-enwe ma gawa n’oche ha. Anyị kwesịrị ịrịba ama na ọtụtụ minit tupu a bụọ abụ e ji amalite nnọkọ nke ọ bụla, onyeisi oche ga-anọdụ ala n’ikpo okwu ka a na-akpọ abụ olu ụtọ Alaeze nke ga-eduga ná mmalite nnọkọ. Nke a bụ ihe na-egosi anyị na oge eruola maka ịnọrọ oche! Mgbe ahụ, mgbe a kpọrọ abụ mmeghe, anyị ga-adị njikere isonye n’ịbụ abụ otuto nye Jehova.

4 Gee Ntị Dị Ka Ezinụlọ Dị n’Otu: Mgbe a na-agụrụ ndị Israel gbakọtaranụ okwu dị nsọ, ezinụlọ dị iche iche, gụnyere “ụmụntakịrị,” kwesịrị ige ntị ma mụta ihe. (Deut. 31:12) Ná mgbakọ anyị, e kwesịghị ‘ịhapụ ụmụntakịrị n’onwe ha.’ (Ilu 29:15) Ndị nne na nna, meenụ ndokwa ka ezinụlọ unu dum nọkọta ọnụ—gụnyere ndị nọ n’afọ iri na ụma. Ụfọdụ ndị nne na nna na-echere ruo mgbe abụ mmeghe malitere tupu ha akpọrọ ụmụ ha gawa mposi. Otú ọ dị, nke ahụ agaghị akụziri ụmụaka mkpa dị ukwuu nke abụ na ekpere dị n’ofufe anyị. Lee otú ọ ga-esi ka mma ịga mposi ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee tupu nnọkọ nke ọ bụla amalite!

5 Ọ ga-enyere anyị aka ige ntị ma ọ bụrụ na anyị ezuo ike nke ọma kwa abalị ma ghara iri nri ndị na-adịghị agbari ngwa ngwa n’ụbọchị ahụ. Tinye uche n’ihe ọkà okwu na-ekwu. Ekwela ka uche gị na-awagharị awagharị. Sonye site n’ile anya na Bible nke gị mgbe a na-agụ akụkụ akwụkwọ nsọ. Detuo ihe ná nkenke. Ka a na-ekwu okwu nke ọ bụla, tụgharịa uche n’ihe ọkà okwu ahụ kwuworo, tụleekwa otú ị pụrụ isi tinye okwu ahụ n’ọrụ. Ná ngwụsị nke ụbọchị ahụ, kwurịta usoro ihe omume ahụ dị ka ezinụlọ. Olee isi ihe ndị masịrị onye ọ bụla n’ime unu? Olee otú ezinụlọ gị pụrụ isi jiri ihe ọmụma a mee ihe n’ụzọ dị mma?

6 Kwanyere Okwu Chineke Ùgwù: Mgbakọ na-enye anyị ohere mara mma isoro ndị enyi anyị kparịta ụka ma nwee mkpakọrịta na-ewuli elu. Site n’ịbịarute n’oge, anyị ga-enwe ohere ịkparịta ụka tupu usoro ihe omume amalite. Otú ọ dị, ụfọdụ na-akparịta ụka mgbe ihe omume na-aga n’ihu, na-eche n’ụzọ hiere ụzọ na nke a adịchaghị adọpụ uche ma a nọrọ n’ụlọ mgbakọ buru ibu. Ọbụna mgbe e nwere nzukọ n’ebe buru ibu, ọ bụ oge ige ntị, dị nnọọ ka ọ dị mgbe anyị na-enwe nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. E kwesịghị ikwe ka iji fon na-enweghị eriri, ígwè ozi pager, camcorder, na kamera eme ihe, dọpụ uche mgbe usoro ihe omume na-aga n’ihu.

7 Mgbe Mosis na-anata Iwu ahụ n’aka Jehova, “ọ dịghị nri o riri, ọ dịghịkwa mmiri ọ ṅụrụ.” (Ọpụ. 34:28) N’otu aka ahụ, ọ gaghị ekwesị ekwesị iri ihe ma ọ bụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ mgbe nnọkọ mgbakọ na-aga n’ihu. Ọ gwụla ma o metụtara nsogbu ahụ ike siri ike, chere ruo ‘oge e nwere’ maka nke a.—Ekli. 3:1.

8 Ná mgbakọ ụfọdụ, a nọgidewo na-enwe nsogbu nke ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị, ọbụna ụmụaka ịdị na-agagharị n’ụzọ mgbe nnọkọ na-aga n’ihu. A ga-enye ndị atendantị ntụziaka ka ha gwa ndị dị otú ahụ ka ha baghachi n’ụlọ mgbakọ. Ndị ọrụ afọ ofufo na-arụ ọrụ ná ngalaba dị iche iche kwesịrị ịnọdụ ala n’ebe ndị na-ege ntị nọ ozugbo ha rụsịrị ọrụ ha. Ọ gwụla ma e kenyere ndị ọrụ afọ ofufo ọrụ dị mkpa n’oge nnọkọ, ha kwesịrị ịnọ n’oche ha na-ege ntị n’usoro ihe omume. Ha ekwesịghị ịga nọrọ ná ngalaba ndị ahụ, na-akparịta ụka ebe usoro ihe omume na-aga n’ihu.

9 Anyị agaghị achọ ma ọlị ịbụ ndị “ntị ike” mgbe anyị na-ege ntị n’Okwu Chineke. (Hib. 5:11) N’ihi ya, ka anyị kpebie igosipụta nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị site n’ige ntị nke ọma mgbe a na-atụle okwu nsọ ndị sitere n’ọnụ Jehova ná mgbakọ distrikti anyị na-abịanụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya