Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/13 p. 1-2
  • Gee Ntị Ka Ị Mụta Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gee Ntị Ka Ị Mụta Ihe
  • Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì Jikerela Maka Oriri Ime Mmụọ?
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • ‘Nụrụ, Wee Tụkwasị Ihe Mmụta n’Amamihe Gị’
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Kpọkọta Ndị Mmadụ
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” nke 1996
    Ozi Alaeze Anyi—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2013
km 8/13 p. 1-2

Gee Ntị Ka Ị Mụta Ihe

1. Gịnị mere anyị ji kwesị ịgba mbọ gee ntị ka anyị mụta ihe ná mgbakọ distrikti afọ a?

1 N’oge na-adịghị anya, mgbakọ distrikti ga-amalite. A rụọla nnukwu ọrụ iji kwadebe ihe omume ga-abara ndị niile na-efe Jehova uru. Ị̀ haziela oge gị ka i nwee ike ịnọ ná mgbakọ ahụ n’ụbọchị atọ ndị ahụ a ga-enwe ya? Ọtụtụ ihe nwere ike ime ka uche anyị ghara ịdị n’ihe a na-ekwu ná mgbakọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị nwee ike ige ntị nke ọma. Ị manụ na a na-emete ihe omume aka ná mgbakọ karịa n’ọmụmụ ihe ọgbakọ. Ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị ghara ige ntị nke ọma bụ ma ike gwụ anyị maka na anyị si ebe dị anya na-abịa mgbakọ. N’agbanyeghị ihe a niile, anyị kwesịrị ịgba mbọ gee ntị nke ọma ma anyị bịa mgbakọ. Olee ihe ga-enyere anyị aka ka anyị gee ntị ma mụta ihe ná mgbakọ?—Diut. 31:12.

2. Olee otú anyị ga-esi kwadebe obi anyị ịnụ ihe a ga-ekwu ná mgbakọ distrikti afọ a?

2 Tupu Ị Gaa Mgbakọ: Ị gaa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ya bụ na www.pr418.com/ig, ị ga-ahụ usoro ihe omume mgbakọ distrikti afọ a, bụ́ ebe e dere isiokwu ihe omume niile a ga-eme ná mgbakọ. Ihe ọzọ ị ga-ahụ bụ otu amaokwu Baịbụl ma ọ bụ amaokwu abụọ bụ́ ebe isiokwu ọ bụla si. Ịgụ usoro ihe omume ahụ na amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-enyere anyị aka ịkwadebe obi anyị ịnụ ihe a ga-ekwu ná mgbakọ ahụ. (Ezra 7:10) Mgbe unu na-enwe Ofufe Ezinụlọ, unu nwere ike ikwu ihe ụfọdụ gbasara ihe anyị ga-anụ ná mgbakọ disrikti afọ a. Ime nke a ga-eme ka ezinụlọ unu na-atụsi anya mgbakọ a ike.

3. Gịnị ga-enyere anyị aka ịge ntị nke ọma ma anyị gaa mgbakọ?

3 Mgbe Ị Bịara Mgbakọ: Ọ ga-aka mma ka anyị gaa mposi ma ọ bụ gaa nyụọ mamịrị tupu ihe omume amalite. Gbanyụọ ekwentị gị ka ọ ghara ime ka uche gị pụọ n’ihe a na-eme. Ọ bụrụ na e nwere ihe mere ị ga-eji ghara ịgbanyụ ya, gbanye ya otú ọ na-agaghị na-adapụta ụda ma a kpọọ gị ma ọ bụ e zitere gị ozi. Ọ bụrụ na i ji ihe dị ka kọmpụta, jide ya otú ọ na-agaghị na-emegharị ndị ọzọ anya. Erila nri mgbe a na-eme ihe omume. Anyị ekwesịghịkwa ịṅụ mmanya n’oge ahụ. (Ekli. 3:1) Na-ele onye na-ekwu okwu anya. Na-asapeta amaokwu Baịbụl ọ bụla a kpọrọ, na-elekwa ya anya mgbe a na-agụ ya. Dee ihe ndị ị ga-achọ icheta n’akwụkwọ.

4. Olee otú ndị nne na nna ga-esi enyere ụmụ ha aka ige ntị ná mgbakọ?

4 Anyị chọkwara ka ụmụ anyị gee ntị ka ha nwee ike ịmụta ihe ná mgbakọ a. Ilu 29:15 kwuru, sị: “Nwata a hapụrụ ka ọ na-eme otú masịrị ya ga na-emenye nne ya ihere.” N’ihi ihe a Baịbụl kwuru, ndị nne na nna na ụmụ ha kwesịrị ịna-anọ otu ebe. Ọ ga-eme ka ha nwee ike ịhụ na ụmụ ha anaghị egwu egwu ma ọ bụ na-edegara ndị enyi ha ozi n’ekwentị ma ọ bụkwanụ na-agagharị mgbe a na-eme ihe omume. Ọ bụrụgodị na ụmụ anyị ka dị obere nke na ha agaghị aghọtacha ihe niile a na-ekwu, anyị kwesịrị ịzụ ha ka ha na-ege ntị ma ghara ịna-eme mkpọtụ.

5. Olee uru ịtụleghachi ihe e kwuru ná mgbakọ bara? Oleekwa otú anyị ga-esi eme ya?

5 Mgbe A Gbasara ná Mgbede: Anọla ebe ị gara ruo ime abalị. Na-alakpu n’oge ka i nwee ike izu ike nke ọma. Ị ga na-echeta ihe e kwuru ma ọ bụrụ na ị na-atụleghachi ihe ị nụrụ ná mgbakọ. N’ihi ya, ọ ga-adị mma ka unu na-ewepụta oge kwa mgbede iji tụleghachi ihe ndị ahụ. Ọ bụrụ na gị na ndị enyi gị agaa ebe a na-ere nri, unu nwere ike ikwu gbasara ihe unu mụtara n’ihe omume ụbọchị ahụ. Ọ bụrụ na unu alọta mgbakọ, unu nwere ike iji mgbede unu ji enwe Ofufe Ezinụlọ kwuo otú unu ga-esi na-eme ihe unu mụtara. Unu nwekwara ike iwepụta oge kwa izu iji na-agụ akwụkwọ ọhụrụ ọ bụla e wepụtara.

6. Ịbịa mgbakọ distrikti afọ a ọ̀ bụ ebe okwu biri? Kọwaa.

6 Ọ bụrụ na e sichaa ọmaricha nri ma erighị ya eri, ò nwere uru ọ bara? Mbanụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa banyere nri ime mmụọ a kwadebere maka mgbakọ distrikti a. Mgbakọ a ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị anọrọ ya ma gee ntị n’ihe omume niile a ga-eme n’ụbọchị atọ ahụ. Ime ihe anyị mụtara ga-abakwara anyị uru.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya