Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/00 p. 1
  • ‘Anyị Apụghị Ịghara Ikwu Okwu’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Anyị Apụghị Ịghara Ikwu Okwu’
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nọgide Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • ‘Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Jiri Nkwuwa Okwu Kpọsaa Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • “Anyị Ga-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 7/00 p. 1

‘Anyị Apụghị Ịghara Ikwu Okwu’

1 Jisọs Kraịst na-ekiri nnọọ otú ọrụ nkwusa ahụ si na-aga. (Mat. 28:20; Mak 13:10) Ọ bụ ezie na e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ndị nkwusa isii na-arụsi ọrụ ike, bụ́ ndị na-agba àmà n’ala 234, anyị agaghị ewere ya na ịgba àmà anyị agwụla. Ruo mgbe Chineke kwuru na a rụzuwo ọrụ ahụ, “anyị apụghị ịghara ikwu” banyere ihe ndị anyị mụtaworo.—Ọrụ 4:20.

2 Dabere na Mmụọ Chineke: Setan na-ewetara anyị nrụgide dị ukwuu iji mee ka anyị daa mbà. (Mkpu.12:17) Anụ ahụ anyị na-ezughị okè na-akpatakwara anyị ọtụtụ nsogbu. Ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ịdọpụ uche anyị n’ọrụ nkwusa ahụ dị oké mkpa. Otú o sina dị, ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, mmụọ ya ga-enyere anyị aka ịnagide ihe mgbochi ọ bụla.

3 Mgbe a kpagburu ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ ajọ mkpagbu, ụmụnna ahụ kpegaara Chineke ekpere maka enyemaka iji were nkwuwa okwu nile nọgide na-ekwu okwu ya. Jehova zara ekpere ha, na-enye ha mmụọ ya, na-emekwa ka ha nwee ịnụ ọkụ n’obi na mkpebi siri ike a chọrọ iji nọgide na-eme nkwusa. N’ihi ya, ha adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma.—Ọrụ 4:29, 31; 5:42.

4 Atụla Egwu Maka Okwu Na-akụda Mmụọ: Echiche zuru ebe nile ma ọ bụ mgbasa nke ebubo ụgha pụrụ ịkụda anyị mmụọ. Otú ọ dị, cheta okwu Pita na ndị ozi ndị ọzọ ji anyaike gwa òtù Sanhedrin, bụ́ nke e dekọrọ n’Ọrụ 5:29–31. Dị ka onye nkụzi Iwu, bụ́ Gameliel, kwetara, a pụghị ịkwatu ọrụ Chineke. Ọ bụghị ike anyị ka e ji arụzu ya. Chineke na-akwado oké ọrụ a, ọ bụkwa nanị ya pụrụ ịrụzu ya!—Zek. 4:6.

5 Ka anyị na-arịọ Jehova mmụọ ya kwa ụbọchị iji nyere anyị aka ikwusa ozi ọma ahụ n’ịnụ ọkụ n’obi. Ka anyị kwuo, dị ka Jeremaịa kwuru, na ozi Alaeze ahụ dị ka ọkụ na-ere ere n’ọkpụkpụ anyị. (Jer. 20:9) Anyị apụghị ịgbachi nkịtị!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya