Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/00 p. 1
  • Na-atụ Egwu Jehova Ụbọchị Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-atụ Egwu Jehova Ụbọchị Nile
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Zụlite Obi Gị Ịtụ Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ịmụta Otú E Si Achọta Obi Ụtọ n’Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Tụọ Egwu Jehova, Nyekwa Aha Nsọ Ya Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Uru Ndị Dị n’Ịtụ Ezi Chineke ahụ Egwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 12/00 p. 1

Na-atụ Egwu Jehova Ụbọchị Nile

1 “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ.” (Abụ Ọma 111:10) Ọ na-akpali anyị ịrụ ọrụ ọma ma na-enyere anyị aka isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe anyị. (Ilu 16:6) Egwu a bụ egwu nsọpụrụ miri emi maka Onye Okike anyị, ọ na-akwali anyị ịjụ imejọ ya na inupụrụ ya isi. Ọ bụ ihe dị mkpa ka anyị zụlite ma na-egosipụta ya ụbọchị nile.—Ilu 8:13.

2 Kwa ụbọchị, mmụọ nke ụwa Setan na-ewetara anyị oké nrụgide ime ihe kwekọrọ n’ụzọ ọjọọ ya dị iche iche. (Efe. 6:11, 12) Anụ ahụ anyị na-ezughị okè na-emehie emehie, sitekwa na mgbe a mụrụ anyị, ọ na-achọ ime ihe ọjọọ. (Gal. 5:17) N’ihi ya, iji rubere iwu Jehova isi, nwee obi ụtọ, ma nweta ndụ, anyị aghaghị ịdị na-atụ egwu ya ụbọchị nile.—Deut. 10:12, 13.

3 Ná Ndị Hibru 10:24, 25, a na-adụ anyị ọdụ izukọta ọnụ iji na-agbarịta ibe anyị ume “karịakwa otú a” n’oge ndị a anyị bi n’ime ha. Ịgachi nzukọ anya dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-alanarị mgbe ikpeazụ a. Egwu anyị na-atụ imejọ Chineke na-akwali anyị ịga nzukọ dị iche iche ma na-eji nzube ha akpọrọ ihe nke ukwuu. Ndị na-atụ egwu Chineke na-ewere ikere òkè ná nzukọ ndị Kraịst dị ka ihe ùgwù dị nsọ.

4 Irube isi n’iwu ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ bụ ụzọ ọzọ anyị si egosipụta egwu anyị na-atụ Chineke. (Mat. 28:19, 20; Ọrụ 10:42) Nzube bụ́ isi nke ọrụ nkwusa anyị bụ inyere ndị ọzọ aka ịzụlite egwu Jehova na ime uche ya. Anyị na-emezu nke a site n’ịga nletaghachi, ịgbalịsi ike ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi, mgbe ahụkwa na-ezi ndị ọzọ iwu nile nke Chineke. Anyị na-esi otú ahụ egosipụta egwu anyị na-atụ Jehova nakwa ịhụnanya anyị nwere maka ndị agbata obi anyị.—Mat. 22:37-39.

5 Ndị na-adịghị atụ egwu Chineke adịghị azụlite àgwà iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, ikuku, ma ọ bụ echiche uche ụwa nke na-akpata ọnwu na-enwetakwa ha. (Efe. 2:2) Ka mkpebi anyị siri ike bụrụ ‘iwere egwu Chineke na ụjọ [na-eje ozi dị nsọ] n’ụzọ nke ga-atọ Chineke ụtọ.’ (Hib. 12:28) N’ụzọ dị otú a, anyị ga-enweta ngọzi nke ndị na-atụ egwu Jehova ụbọchị nile na-enweta.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya