Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịbịa Nzukọ
1 “E ji obi ụtọ na-akpọ onye ọ bụla nọ n’ógbè a . . . bụ́ onye chọrọ ịbịa nzukọ anyị òkù ka o mee otú ahụ.” Kemgbe ịma ọkwa a pụtara ná mbipụta Zion’s Watch Tower nke November 1880, Ndịàmà Jehova ejiriwo ịnụ ọkụ n’obi na-akpọ ndị mmadụ òkù izukọta maka ịmụ Bible. (Mkpu. 22:17) Nke a bụ akụkụ dị mkpa nke ezi ofufe.
2 Ọ Dị Oké Mkpa Ịbịa: Ọ na-arụpụta ngọzi mgbe anyị so ọgbakọ na-akpakọrịta. Anyị na-amata Chineke anyị dị ebube, bụ́ Jehova, n’ụzọ ka mma. N’ọgbakọ, anyị na-ezukọta iji bụrụ “ndị mmụta Jehova.” (Aịsa. 54:13) Nzukọ ya na-ewepụta usoro ihe omume na-aga n’ihu n’ihu nke nkụzi Bible bụ́ nke na-adọta anyị nso n’ebe ọ nọ karị ma na-enyere anyị aka bara uru n’itinye “ìzù nile nke Chineke” n’ọrụ. (Ọrụ 20:27; Luk 12:42) Nzukọ na-enye onye nke ọ bụla ọzụzụ n’ihe banyere nkà nke ịkụzi Okwu Chineke. Ihe ncheta ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ na-enyere anyị aka iso ndị ọzọ nakwa Jehova n’onwe ya na-enwe mmekọrịta dị mma. Iso ndị hụrụ Chineke n’anya na-akpakọrịta na-ewusi okwukwe anyị ike.—Rom 1:11, 12.
3 Kpọọ Òkù Kpọmkwem: Malite n’ọmụmụ ihe mbụ, kpọọ onye ọ bụla a na-amụrụ Bible òkù ịbịa nzukọ. Nye ya mpempe akwụkwọ ịkpọ òkù. Kpalie mmasị ya site n’ịkọrọ ya otu isi ihe nke gbara gị ume ị mụtara ná nzukọ gara aga nakwa site n’iso ya kwurịta ihe a gaje ịtụle ná nzukọ ọzọ. Kọwaa otú Ụlọ Nzukọ Alaeze dị, jidekwa n’aka na ọ maara ụzọ ọ ga-esi chọta ya.
4 Ọ bụrụ na onye a na-amụrụ ihe abịaghị ozugbo, nọgide na-akpọ ya òkù. Wepụta minit ole na ole kwa izu iji gosi ya otú nzukọ anyị si arụ ọrụ. Jiri broshuọ bụ́ Na-eme Uche Chineke nakwa vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name, ma ọ bụrụ na o kwe mee, mee ka ọ mata anyị na nzukọ anyị. Kpọrọ ndị nkwusa ndị ọzọ gaa iji mee ka onye ahụ a na-amụrụ ihe mata ha. N’ekpere, kelee Jehova maka nzukọ ya ma hota mkpa ọ dị ka onye ahụ a na-amụrụ ihe soro ya na-akpakọrịta.
5 Alala azụ inyere ndị ọhụrụ nwere mmasị aka iso anyị na-ezukọta. Ka ha na-aghọtakwu onye Jehova bụ, a ga-akwali ha itinye ihe ha na-amụta n’ọrụ nakwa ịghọ akụkụ nke nzukọ Chineke nke dị n’otu.—1 Kọr. 14:25.