Iduzi Ndị A Na-amụrụ Ihe Gaa ná Nzukọ Nwe Aha Anyị
1 “Ọ bụ ozi a na-ezi n’ihe karịrị asụsụ 200. Ọ bụ ozi a na-anụ n’ihe karịrị ala 210. Ọ bụ ozi a na-ezi ihu na ihu n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ndị mmadụ. O socha ná mkpọsa ime nkwusa kasị ukwuu ụwa matụworo, ozi na-ejikọta ọtụtụ nde n’ụwa dum. A haziwo Ndịàmà Jehova ịrụzu ọrụ a ruo ihe karịrị otu narị afọ!”
2 Otú a ka e si malite nkọwa nke vidio ahụ bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name. Ọ gara n’ihu ịza ajụjụ ndị dị ka: Olee ndị n’ezie bụ Ndịàmà Jehova? Olee otú e si ahazi? eduzi? eji ego akwado ọrụ ha? Ọ na-akụnye n’obi ndị na-ekiri ya eziokwu bụ na “a zụwo Ndịàmà Jehova n’ụwa nile dị ka otu nzukọ inyere ndị agbata obi ha aka iwulite okwukwe na Bible,” ọ na-agbakwa ha ume iji anya ha hụ nzukọ nwe aha anyị. Mgbe o kirisịrị vidio a, otu nwanyị nke na-amụ ihe tiwapụrụ n’anya mmiri nke ọṅụ na obi ekele ma sị: “Olee otú onye ọ bụla na-agaghị esi hụ na nke a bụ nzukọ nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova?”—Tụlee 1 Ndị Kọrint 14:24, 25.
3 Nwanyị ọzọ amụwo Bible amụtụ akwụsị ruo ogologo oge, ma ọ pụghị ịnakwere eziokwu bụ na Atọ n’Ime Otu bụ ozizi ụgha. Mgbe ahụ e gosiri ya na di ya vidio anyị. Ihe nkiri ahụ masịrị ha nnọọ, ha kirikwara ya ugboro abụọ n’otu anyasị ahụ. N’ọmụmụ ihe ha ọzọ, nwunye ya kwupụtara ọchịchọ ya ịghọ Onyeàmà. Ọ sịrị na ya anọwo na-atụkwasị uche ná nkwenkwe ya n’Atọ n’Ime Otu ma ghara ileba anya ná nzukọ anyị na ndị nọ n’ime ya. Site na vidio ahụ ọ ghọtara na ọ chọtawo ezi nzukọ Chineke. Ọ chọrọ ịmalite ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ ozugbo. Mgbe a kọwasịịrị ya nzọụkwụ ndị dị mkpa iji ghọọ onye nkwusa a na-emebeghị baptism, ọ sịrị: “Ka anyị malite ya amalite.” Ọ kwụsịrị ije chọọchị ya, malite n’ọrụ ozi ubi, ma dị irè n’ịgbagha Atọ n’Ime Otu.
4 Ọ bụrụwo ihe a maara nke ọma na ndị a na-amụrụ Bible na-enwe ọganihu ime mmụọ ka mma ma na-etoru ntozu okè ngwa ngwa mgbe ha matara nzukọ Jehova, na-esonyekwara ya. N’ụzọ dị ịrịba ama, mgbe e mesịrị 3,000 baptism na Pentikọst, “ha nọgidekwara na-emikpu onwe ha n’ozizi ndị ozi na ịkpakọrịta ọnụ.” (Ọrụ 2:42, nkọwa ala ala peji NW) Ọ dị mkpa na anyị nyeere ndị a na-amụrụ ihe aka ime otu ihe ahụ taa. Olee otú anyị pụrụ isi mee ya?
5 Buru Ibu Ọrụ Ahụ: Onye ọ bụla na-eme ndị na-eso ụzọ aghaghị ịmata na ọ bụ ibu ọrụ ya iduzi onye a na-amụrụ Bible gaa ná nzukọ Chineke. (1 Tim. 4:16) E kwesịrị ile nnọkọ ọmụmụ ihe ọ bụla anya dị ka ihe mgbakwasị ụkwụ gaa n’ụbọchị obi ụtọ mgbe onye ọhụrụ ga-egosipụta nrara ya nye Jehova site na baptism ime mmiri. Otu n’ime ajụjụ ndị a ga-ajụ ya n’oge ememe baptism ahụ bụ: “Ị̀ na-aghọta na nraranye na baptism gị na-eme ka a mara gị dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova n’isonyere nzukọ e ji mmụọ nsọ Chineke na-eduzi?” N’ihi ya, ọ dị mkpa na ọ matara na ọ pụghị ijere Chineke ozi n’esonyesighị ọgbakọ ezi ndị Kraịst ike.—Mat. 24:45-47; Jọn 6:68; 2 Kọr. 5:20.
6 Nọgide na-ezi onye ahụ a na-amụrụ ihe banyere ọgbakọ dị n’ógbè unu na nzukọ zuru ụwa ọnụ nke nwe aha bụ́ Ndịàmà Jehova. Mee nke a na nnọkọ ọmụmụ Bible ọ bụla, na-amalite na nke mbụ. Site ná mmalite, kpọọ onye ahụ a na-amụrụ ihe òkù ịga nzukọ, nọgidekwa na-akpọ ya òkù.—Mkpu. 22:17.
7 Jiri Ngwá Ọrụ Ndị E Wepụtara Mee Ihe: Mbipụta anyị ndị kasị mma iji mee ihe n’iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi bụ broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? na akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ha abụọ na-emesi ike mkpa ọ dị isonyere ọgbakọ ahụ. Ngwụsị nke ihe ọmụmụ nke 5 na broshuọ Na-achọ na-ekwu, sị: “Ọ dị gị mkpa ịnọgide na-amụ banyere Jehova ma na-erubere ihe ọ chọrọ isi. Ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova nke dị n’ógbè gị ga-enyere gị aka ime otú ahụ.” Akwụkwọ Ihe Ọmụma na-agba onye a na-amụrụ ihe ume ugboro ugboro iso ndị ọzọ na-akpakọrịta ná nzukọ. Isi nke 5, paragraf nke 22, na-akpọ òkù a: “Ndịàmà Jehova . . . na-akpọ gị òkù iso ha na-ekere òkè n’ife Chineke ‘n’ime mmụọ na eziokwu.’ (Jọn 4:24)” Isi nke 12, paragraf nke 16, na-ekwu, sị: “Ka ị nọgidere n’ọmụmụ ihe a ma na-eme ya àgwà gị ịga nzukọ nile nke Ndịàmà Jehova, a ga-ewusiwanye okwukwe gị ike ọbụna karị.” Isi nke 16, paragraf nke 20, na-asị: “Mee ya omenala gị ịga nzukọ Ndịàmà Jehova.” O kwukwasịrị: “Nke a ga-enyere gị aka ịghọta na itinyezi ihe ọmụma Chineke n’ọrụ ná ndụ gị, ọ ga-ewetakwara gị obi ụtọ. Ịbụ akụkụ nke òtù ụmụnna ndị Kraịst nke zuru ụwa ọnụ ga-enyere gị aka ịnọ Jehova nso.” Isi nke 17 tụlere n’ụzọ zuru ezu otú mmadụ si achọta ezi ịnọ ná ntụkwasị obi n’etiti ndị Chineke. Ka anyị na-amụrụ ndị ọzọ ihe, ọ bụ ibu ọrụ anyị imesi akụkụ ndị a nke ihe ọmụmụ ahụ ike.
8 Broshuọ ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova Na-eme Uche Chineke n’Ịdị n’Otu n’Ụwa Nile bụ ngwá ọrụ mara mma nke e wepụtaworo iji mee ka ndị mmadụ n’otu n’otu mara nanị nzukọ a na-ahụ anya Jehova ji eme ihe taa iji mezuo uche ya. Ihe ọmụma sara mbara dị n’ime ya banyere ozi, nnọkọ, na nzukọ anyị ga-agba onye na-agụ ya ume isonyere anyị n’ife Chineke ofufe. Ozugbo e guzobere ọmụmụ Bible, a na-atụ aro ka anyị tinye otu broshuọ a n’aka onye a na-amụrụ ihe ịgụ n’onwe ya. Ọ dịghị mkpa isoro ya mụọ ya dị ka e mere n’oge gara aga.
9 Ụfọdụ n’ime vidio ndị Society wepụtara bụ ngwá ọrụ magburu onwe ha maka iduzi ndị a na-amụrụ ihe gaa ná nzukọ nwe aha anyị. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ha ga-enwe ike ikiri (1) The New World Society in Action, mmeghachi nke ihe nkiri 1954 ahụ nke gosipụtara mmụọ ịga n’usoro, ịdị irè, na ịhụnanya nke nzukọ Jehova ji na-arụ ọrụ; (2) United by Divine Teaching, nke na-enyocha ịdị n’otu udo nke e gosipụtaworo ná mgbakọ mba nile anyị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, Ndịda America, Africa, na Esia; (3) To the Ends of the Earth, nke kara ememe mgbaafọ 50 nke Watchtower Bible School of Gilead akara ma na-egosi mmetụta nke ndị ozi ala ọzọ nweworo n’ọrụ ime nkwusa zuru ụwa ọnụ; (4) Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault, nke na-akọ akụkọ na-akpali akpali banyere obi ike na mmeri nke Ndịàmà ahụ n’agbanyeghị mkpagbu obi ọjọọ Hitler kpagburu ha; nakwazi, (5) Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name.
10 Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Na-aga n’Ihu Banyere Nzukọ: A ga-akọwara ndị a na-amụrụ ihe na izi ihe onwe onye a na-enye n’ọnọdụ ọmụmụ Bible ebe obibi na nkwurịta okwu klas nke a na-enye ná nzukọ ọgbakọ dị anyị mkpa. (Jọn 6:45) Ọ dị onye ọhụrụ mkpa inwe ọganihu n’otu aka ahụ ná nghọta ya nke ma Akwụkwọ Nsọ ma nzukọ ahụ. Iji mezuo nke ahụ, e nweghị ihe a ga-eji dochie anya ịga nzukọ. (Hib. 10:23-25) Malite ịkpọ onye ahụ òkù ịbịa nzukọ ọgbakọ ozugbo. Ụfọdụ ndị ọhụrụ nwere mmasị na-amalite ịga nzukọ ọbụna tupu ha amalite inwe ọmụmụ Bible ebe obibi chiri anya. N’ezie, anyị chọrọ isetịpụ ihe nlereanya kwesịrị ekwesị n’onwe anyị site n’ịgachi anya.—Luk 6:40; Fil. 3:17.
11 Kerịta ihe ọmụma zuru ezu banyere nzukọ ahụ na ụzọ e si eduzi ha ka onye ahụ a na-amụrụ ihe wee nwee ahụ iru ala mgbe ọ na-aga nzukọ mbụ ya. Ebe ọ bụ na ahụ adịghị erucha ụfọdụ ndị ala mgbe ha na-aga n’ebe ọhụrụ na nke mbụ ya, ọ pụrụ ịbụ ihe bara uru iso onye ahụ a na-amụrụ ihe gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe ọ na-abịa nzukọ mbụ ya. Ahụ ga-eru ya ala karị ma ọ bụrụ na gị na ya nọ ka ọ na-ezute ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. Nke ka nke, bụrụ ezi onye na-eleta onye ọbịa, na-eme ka ahụ ruo ya ala ma tụsara ahụ.—Mat. 7:12; Fil. 2:1-4.
12 Gbaa onye ahụ a na-amụrụ ihe ume ịga ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, mgbakọ sekit, ma ọ bụ mgbakọ distrikti n’ohere mbụ ya. Ikekwe ị pụrụ ịgụnye ya ná ndokwa ime njem gị.
13 Kụnye Ekele Sitere n’Obi: Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị, peji nke 92, na-akọwa, sị: “Ọ bụrụ na obi ekele miri emi i nwere banyere nzukọ Jehova na-apụta ìhè ná mkparịta ụka gị na ndị nwere mmasị, ọ ga-adịrị ha mfe karị ito eto n’inwe obi ekele, ọ ga-akpalikwa ha inwe ọganihu ka ukwuu n’ịbịa mara Jehova.” Na-ekwu okwu na-ewuli elu mgbe nile banyere ọgbakọ unu, ọ bụghị nke na-akụda akụda. (Abụ Ọma 84:10; 133:1, 3b) N’ekpere ị na-ekpe n’ọmụmụ Bible ahụ, kpọtụ uche n’ọgbakọ na mkpa ọ dị onye ahụ a na-amụrụ ihe isonyechi anya na ya.—Efe. 1:15-17.
14 N’ezie anyị chọrọ ka ndị ọhụrụ zụlite ekele sitere n’obi maka mkpakọrịta na-enye ọṅụ na ịnọ ná ntụkwasị obi ime mmụọ nke a na-achọta n’etiti ndị Chineke. (1 Tim. 3:15; 1 Pita 2:17; 5:9) Dị ka Ndịàmà Jehova, ka anyị mee ihe nile anyị pụrụ ime iji duzie ndị a na-amụrụ Okwu Chineke gaa ná nzukọ ahụ nwe aha anyị.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]
Ndị a na-amụrụ ihe na-enwe ọganihu ime mmụọ ọsọ ọsọ karị mgbe ha na-ahụ nzukọ ahụ n’onwe ha
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
Egbula oge n’ịkpọ ndị a na-amụrụ ihe òkù ịbịa nzukọ