Kere Òkè Zuru Ezu n’Owuwe Ihe Ubi Ahụ
1 Ndị amụma Jehova n’oge ochie nakwa Jisọs Kraịst n’onwe ya kwuru okwu banyere ọrụ nchịkọta. (Aịsa. 56:8; Ezik. 34:11; Jọn 10:16) A na-arụzu ọrụ dị otú ahụ ugbu a ka a na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’ụwa nile. (Mat. 24:14) Ihe dị iche n’etiti ndị na-ejere Chineke ozi na ndị na-adịghị ejere ya ozi na-apụtawanye ìhè. (Mal. 3:18) Gịnị ka nke a pụtara nye anyị?
2 Ibu Ọrụ Onwe Onye: Anyị pụrụ ịmụta ihe site n’ihe nlereanya Pọl, bụ́ onye mikpuru onwe ya n’ụzọ zuru ezu n’ibute ụzọ n’ozi ndị Kraịst. O nwere mmetụta nke inwe ibu ọrụ ime nkwusa ka mmadụ nile wee nwee ohere ịnụ ozi ọma ahụ ma bụrụ ndị a zọpụtara. Nke a kpaliri ya ịdọgbu onwe ya n’ọrụ mgbe nile n’ihi ha. (Rom 1:14-17) N’ihi ọnọdụ dị ize ndụ nke na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu taa, ọ̀ bụ na anyị enweghị ọbụna ibu ọrụ ka ukwuu nke ime nkwusa gwa ndị nọ n’ókèala e kenyere anyị?—1 Kọr. 9:16.
3 Oge Ime Ihe Ngwa Ngwa: A pụrụ iji ọrụ nkwusa ahụ tụnyere ọrụ ịchọ na ịzọpụta ndị nọ n’ihe ize ndụ. A ghaghị ịchọta ndị mmadụ ma nyere ha aka ịbụ ndị e chebere tupu oge agafee. Oge e nwere dị ntakịrị. Ndụ nọ n’ihe ize ndụ! Ka a sịkwa ihe mere Jisọs ji gbaa ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha ‘na-arịọ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.’—Mat. 9:38.
4 N’ịmata ịdị ngwa ọ dị taa, ọtụtụ ndị ọrụ Alaeze amụbawo òkè ha na-ekere n’ọrụ a nke ịzọpụta ndụ. Otu onye nọ n’afọ iri na ụma aha ya bụ Hirohisa na ụmụnne ya anọ ndị ọ tọrọ na nne ya bi. Ọ na-enyere ezinụlọ ya aka site n’ibili n’elekere anya atọ nke ụtụtụ ije kesaa akwụkwọ akụkọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Hirohisa chọrọ imekwu ihe n’ozi, ya mere ọ malitere ịsụ ụzọ oge nile. Ò nwere ụzọ ndị ị pụrụ isi kerekwuo òkè zuru ezu n’ọrụ a a na-agaghị arụ ọzọ?
5 “Oge a dị mkpụmkpụ.” (1 Kọr. 7:29) Ya mere, ka anyị mee ihe nile anyị nwere ike ime n’ọrụ kasị mkpa a na-arụ n’ụwa taa—ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ. Jisọs ji ozi a tụnyere ọrụ iwe ihe ubi. (Mat. 9:35-38) Site n’anyị ikere òkè zuru ezu n’owuwe ihe ubi ahụ, ihe ndị pụrụ isi ná ndọgbu n’ọrụ anyị pụta nwere ike ịgụnye inyere mmadụ aka isoro n’oké ìgwè mmadụ ahụ na-efe ofufe bụ́ ndị a kọwara ná Mkpughe 7:9, 10.