Jikere Ịmụ Amụma Aịsaịa!
1 “Ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ofufe pụrụ inwe obi ike na Jehova . . . agaghị ekwe ka ụwa Setan jiri otu ụbọchị dịfee ihe ikpe ziri ezi chọrọ.” Lee okwu na-agba ume ọ bụ! Olee ebe e si hota ya? Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I. Amụma Aịsaịa ọ̀ na-eme ka anyị nwee ihe mere anyị ga-eji ruo nkwubi okwu dị otú ahụ na-agba ume? Ee! N’akwụkwọ Bible ahụ, e mesiri nnọọ isiokwu nke nzọpụta ike n’ụzọ doro anya. (Aịsa. 25:9) Ọ bụ ya mere ọ ga-eji bụrụ ihe oké agbamume nye anyị ịmụ akụkụ a nke Okwu Chineke n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ànyị ga-aga wee soro mụọ ya kwa izu? Gịnị mere anyị kwesịrị iji gaa?
2 N’Aịsaịa 30:20 (NW), a kpọrọ Jehova ‘Onye Nkụzi Ukwu’ anyị. Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ige ntị nke ọma ka Jehova na-agwa anyị okwu site n’Okwu ya nakwa site n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta. (Mat. 24:45; Aịsa. 48:17, 18) N’ezie nke a bụ eziokwu banyere akwụkwọ Amụma Aịsaịa I. Olee otú ị pụrụ isi rite uru kasị ukwuu site n’ịmụ ya?
3 Jikere Ikere Òkè: Wepụta oge zuru ezu kwa izu iji kwadebe maka ọmụmụ akwụkwọ ahụ. Gụọ paragraf nile dị n’akụkụ e kenyere. Chebara ajụjụ nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị e biri ebi echiche. Kanye akara n’azịza ha n’ime akwụkwọ gị. E biri amaokwu ndị e hotara site n’Aịsaịa n’aka akwụkwọ gbara okpotokpo. Jiri nlezianya gụọ ha. Banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ e zoro aka na ha, gụọ ha iji hụ otú ha si daba n’ihe ọmụmụ ahụ. Tụgharịa uche n’ihe ị na-amụ. Mgbe ahụ soro ìgwè ọmụmụ akwụkwọ gị kerịta ihe ndị ị mụtara site ná nkwadebe gị.
4 Nwanna na-eduzi ọmụmụ akwụkwọ ahụ kwesịrị inyere ndị nile bịaranụ aka iji Bible mee ihe nke ọma na ịghọta abamuru nke ihe ahụ a na-amụ. Ọ bụrụ na a kpọọ gị ịbụ onye mbụ ga-aza ajụjụ, nye azịza dị mfe, nke gara n’ihe a chọrọ kpọmkwem. Ọ bụrụ na onye ọzọ emeworịị nke ahụ, ị pụrụ ịtụkwasị ihe n’isi ihe a na-atụle. Ikekwe ị pụrụ igosi otú otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ isi si na-akwado isiokwu ahụ. Gbalịa ịza ajụjụ n’okwu nke aka gị ma nweta obi ụtọ site n’ikere òkè ná nkwurịta okwu ahụ.
5 Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi nyochakọta ozi dị oké ọnụ ahịa dị n’akwụkwọ Aịsaịa ọnụ. Ọ ga-agba anyị ume ịdị na-ebi ndụ kwa ụbọchị jiri ọṅụ na-atụ anya nzọpụta Jehova!—Aịsa. 30:18.