Anyị Ga-amụ Akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ
Ị ga-enwe obi ụtọ ịmata na malite n’izu October 6, 1997, anyị ga-atụle akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ọ dịghị onye ga-achọ ka ọmụmụ ihe ìgwè nke ihe nduzi a bara uru dabeere n’Akwụkwọ Nsọ maka ndụ ezinụlọ obi ụtọ kwaa ya. Usoro ọmụmụ ihe ahụ ga-enye ohere maka nnyocha e weturu anya n’ala mee nke paragraf na akụkụ Bible ọ bụla dị n’akwụkwọ ahụ.
A ga-atụlezu isiakwụkwọ nke mbụ n’izu mbụ nke ọmụmụ ihe ahụ, ebe o nwere akụkụ akwụkwọ nsọ ole na ole a na-ehotaghị ehota. N’ihi otu ihe ahụ, a ga-atụle isiakwụkwọ nke 15 n’otu ugboro. Otú ọ dị, a ga-ekewa isiakwụkwọ ndị ọzọ nile abụọ abụọ, na-atụle ihe dị ka ọkara nke otu isiakwụkwọ kwa izu. Otú a, a ga-enwe oge zuru ezu iji gụọ ma tụlee akụkụ akwụkwọ nsọ nile e zoro aka na ha nakwa iji jiri nlezianya nyochaa ụzọ a pụrụ isi tinye akụkụ akwụkwọ nsọ nile e hotara na paragraf nke ọ bụla n’ọrụ.
Otu akụkụ dị mkpa nke ọmụmụ ihe ahụ ga-abụ ntụle nke ihe dị n’igbe izi ihe ná ngwụsị nke isiakwụkwọ ọ bụla. Ya mere, e kwesịrị inye oge zuru ezu iji tụlee ajụjụ na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha n’igbe ahụ.
A na-agba ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ume inye nkwadebe ha maka ọmụmụ ihe ahụ nlebara anya pụrụ iche na ịgba ndị nile e kenyere n’ìgwè ha ume, tinyere ndị ọhụrụ, ka ha kwadebe nke ọma, na-abịachi anya, ma na-ekere òkè.—om-IB 74-76.