Akụkụ nke 4: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
Ịkụziri Ndị A Na-amụrụ Ihe Ime Nkwadebe
1 Onye a na-amụrụ ihe nke na-agụ ebe a ga-amụrụ ya tupu oge eruo, bụ́ onye na-akanye ihe n’okpuru azịza ma na-eche echiche otú ọ ga-esi zaa ha n’okwu nke aka ya, na-enwekarị ọganihu ime mmụọ ngwa ngwa. N’ihi ya, ozugbo unu malitere inwechi ọmụmụ ihe anya, soro ya kwadebe otu ihe ọmụmụ iji gosi ya otú e si eme ya. Nye ihe ka ọtụtụ ná ndị a na-amụrụ ihe, ọ ga-enye aka isoro ha kwadebechaa otu isiakwụkwọ ma ọ bụ otu ihe ọmụmụ.
2 Ịkanye Ihe n’Okpuru Azịza na Idetu Ihe n’Akụkụ Peeji: Kọwaa otú e si achọta azịza nke ajụjụ ndị e depụtara. Gosi onye ahụ ị na-amụrụ ihe akwụkwọ nke gị bụ́ ebe ị kanyere ihe n’okpuru nanị mkpụrụ okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu ndị bụ́ isi. Ka unu na-atụle ihe ọmụmụ ahụ, ọ pụrụ ịchọ ịgbaso ihe nlereanya gị, na-akanye ihe n’akwụkwọ nke ya nanị n’okpuru ihe ndị dị mkpa iji nyere ya aka icheta azịza ha. (Luk 6:40) Gwazie ya ka ọ zaa ajụjụ ahụ n’okwu nke aka ya. Nke a ga-enyere gị aka ịma ma ọ̀ ghọtara ihe ahụ unu na-amụ nke ọma.
3 Iji nlezianya na-atụle akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-ehotaghị ehota bụ akụkụ dị mkpa ná nkwadebe nke onye a na-amụrụ ihe ga-eme. (Ọrụ 17:11) Nyere ya aka ịhụ na akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ọ bụla e zoro aka na ya na-akwado otu isi ihe dị na paragraf. Gosi ya otú e si edetu ihe n’akụkụ peeji nke akwụkwọ ọ na-amụ. Mesie ya ike na ihe ọ na-amụ hiwere isi na Bible. Gbaa ya ume ka ọ na-ewebata nnọọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha n’azịza ya mgbe unu na-amụ ihe.
4 Ntụle Dị Mkpirikpi ná Mmalite na Ntụleghachi: Tupu onye ahụ a na-amụrụ ihe amalite ịkwadebe ihe ọmụmụ ahụ n’ụzọ zuru ezu, ọ ga-abụ ihe na-enye aka ibu ụzọ tụlee isiokwu ahụ n’ụzọ dị mkpirikpi. Mee ka ọ ghọta na ọ pụrụ ịtụle ihe ọmụmụ ahụ n’ụzọ dị mkpirikpi site n’inyocha isiokwu ya, isiokwu nta na ihe osise ndị dị na ya. Kọwaara ya na tupu ya emechie ná nkwadebe ọ na-eme, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya iwepụta oge tụleghachi isi ihe ndị dị n’ihe ọmụmụ ahụ, ikekwe na-eji igbe ntụleghachi eme ihe ma ọ bụrụ na e nwere ya. Ntụleghachi dị otú ahụ ga-enye aka mee ka ihe ọmụmụ ahụ dịgide n’uche ya.
5 Ịkụziri onye ị na-amụrụ ihe ịkwadebe nke ọma ga-enye aka ime ka azịza ya ná nzukọ ọgbakọ bụrụ ịgba. Ọ ga-enyekwara ya aka ịzụlite àgwà nke ịmụ ihe bụ́ nke ga-abara ya uru ruo ogologo oge mgbe a mụsịwooro ya ihe.