Akụkụ nke 2: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
Ịkwadebe Maka Iduzi Ọmụmụ Ihe
1 Ịkụzi ihe n’ụzọ dị irè n’ọmụmụ Bible na-agụnye ihe karịrị nnọọ ikwurịta ihe ọmụmụ ahụ na ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha. Ọ dị mkpa ka anyị wepụta ihe ọmụma ahụ n’ụzọ ga-eru n’obi onye ahụ a na-amụrụ ihe. Nke a chọrọ iburu onye ahụ a na-amụrụ ihe n’uche mee nkwadebe dị mma.—Ilu 15:28.
2 Ụzọ Isi Kwadebe: Malite site n’ikpeku Jehova ekpere banyere onye ahụ na mkpa ndị o nwere. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka iru n’obi onye ahụ ị na-amụrụ ihe. (Kọl. 1:9, 10) Iji buru nnọọ isi ihe a ga-atụle n’uche, wepụta oge iji tụlee isiokwu nke isiakwụkwọ ma ọ bụ ihe ọmụmụ ahụ, isiokwu nta ndị dị na ya, na ihe osise ọ bụla e nwere na ya. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị bụ nzube nke ihe ọmụmụ a?’ Nke a ga-enyere gị aka ilekwasị anya n’ihe ndị bụ́ isi ka ị na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ.
3 Jiri nlezianya tụleghachi ihe ọmụmụ ahụ site n’otu paragraf gaa n’ọzọ. Chọpụta azịza nke ajụjụ ndị e biri ebi, na-aka ihe nanị n’okpuru okwu na nkebi ahịrịokwu ndị bụ́ isi. Tụlee otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha si metụta isi ihe dị na paragraf ahụ, ma kpebie ndị a ga-agụ n’oge ọmụmụ ihe ahụ. Ị pụrụ ịhụta ya dị ka ihe enyemaka idetu ihe ná mkpirikpi n’ohere dị n’akụkụ peeji akwụkwọ ahụ. Onye ahụ ị na-amụrụ ihe kwesịrị ịhụ n’ụzọ doro anya na ihe ọ na-amụ sitere n’Okwu Chineke.—1 Tes. 2:13.
4 Mee Ka Ihe Ọmụmụ ahụ Kwekọọ ná Mkpa Onye A Na-amụrụ Ihe: Mgbe ahụzi, tụlee ihe ọmụmụ ahụ, na-eburu onye ahụ ị na-amụrụ ihe n’uche kpọmkwem. Gbalịa ichepụta ajụjụ ndị ọ ga-ajụ na isi ihe ndị pụrụ isiri ya ike ịghọta ma ọ bụ ịnakwere. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka ọ dị mkpa ka ọ ghọta ma ọ bụ ka ọ rụọ ọrụ na ya iji nwee ọganihu ime mmụọ? Olee otú m pụrụ isi ruo n’obi ya?’ Mgbe ahụ, mee ka ihe ị ga-akụziri ya kwekọọ ná mkpa ya. Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ ịhụ na ọ dị mkpa ka ị kwadebe ihe atụ, nkọwa, ma ọ bụ ajụjụ ụfọdụ iji nyere onye ahụ ị na-amụrụ ihe aka ịghọta ihe isi ihe ma ọ bụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ pụtara. (Neh. 8:8) Ma zere iwebata ihe ọmụma ndị ọzọ na-ekwekọchaghị n’isi ihe a na-amụ. Ime ntụleghachi dị mkpirikpi ná ngwụsị nke ihe ọmụmụ ahụ ga-enyere ya aka icheta ihe ndị bụ́ isi.
5 Lee ọṅụ anyị na-enwe mgbe ndị ọhụrụ na-amị mkpụrụ ezi omume nke na-ewetara Jehova otuto! (Fil. 1:11) Iji nyere ha aka iru ihe mgbaru ọsọ ahụ, kwadebe nke ọma n’oge ọ bụla ị na-eduzi ọmụmụ Bible.