Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/03 p. 7
  • Ịmụ Akwụkwọ Fee Chineke Ofufe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịmụ Akwụkwọ Fee Chineke Ofufe
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Rite Uru Site n’Ịmụ Bịaruo Jehova Nso
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Nweta Obi Aṅụrị n’Ịmụ Akwụkwọ Bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ—Ihe Mere O Ji Dị Anyị Mkpa
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Anyị Ga-amalite Ịmụ Akwụkwọ Bịaruo Jehova Nso n’Izu Na-amalite na Jenụwarị 6
    Ozi Alaeze Anyi—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 9/03 p. 7

Ịmụ Akwụkwọ Fee Chineke Ofufe

A kwadebere akwụkwọ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe iji ya na-eduziri ndị ọhụrụ ọmụmụ ihe mgbe a mụsịịrị ha akwụkwọ Ihe Ọmụma. Anyị ịmụ akwụkwọ a n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ga-akwadebe anyị iji ya na-eme ihe n’ozi, ọ ga-enyekwa aka mee ka ịhụnanya na ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ nakwa n’ebe nzukọ ya dị mikwuo emi. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru zuru ezu site n’ịmụ akwụkwọ Fee Chineke Ofufe?

Iduzi Ọmụmụ Ihe Ahụ: Ebe ọ bụ na anyị ga na-amụcha otu isiakwụkwọ kwa izu, ọ ga-adị mkpa ka ndị nlekọta ọmụmụ akwụkwọ jiri oge mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Ha ekwesịghị igbu oge na paragraf ndị nke mbụ nke isiakwụkwọ ahụ, nke a ga-eme ka ha nwekwuo oge maka ihe ndị ka mkpa, bụ́ ndị na-apụtakarị ma a gatụkwuo n’ihu n’isiakwụkwọ ahụ. Ịtụle igbe ntụleghachi n’ụzọ dị mkpirikpi mgbe a tụlesịrị isiakwụkwọ nke ọ bụla ga-enyere ndị bịara nzukọ aka icheta isi ihe ndị a tụlere.

E nwere ajụjụ ndị dị n’ụdị paragraf, bụ́ ndị a ga-atụle ma tụgharịa uche na ha, n’ihe dị ka ọkara nke isiakwụkwọ ndị dị n’akwụkwọ Fee Chineke Ofufe. E nwere otu ihe atụ na peeji nke 48-49. Ọ gaghị adị mkpa ka a gụọ ajụjụ ndị dị otú ahụ mgbe a na-agụ paragraf ndị ha dị n’okpuru ha. Mgbe a na-atụle ha n’ìgwè ọmụmụ akwụkwọ, onye nlekọta kwesịrị ime ka a gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha ma tụlee ha ruo n’ókè oge nyere ohere ya.

Ibu Ụzọ Mee Nkwadebe: Ịkwadebe nke ọma maka ọmụmụ ihe ahụ na-agụnye ihe karịrị ịkanye ihe n’okpuru azịza. Iji ekpere na-atụgharị uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha ga-enyere anyị aka ịkwadebe ọ bụghị nanị azịza kamakwa, nke ka mkpa, obi anyị. (Ezra 7:10) Anyị nile pụrụ ịdị na-agbarịta ibe anyị ume site n’ịdị na-aza ajụjụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị.—Rom 1:11, 12.

Ịmụ akwụkwọ Fee Chineke Ofufe ga-enyere anyị aka ịbịaru Jehova nso, ọ ga-akwadebekwa anyị inyere ndị nwere obi eziokwu aka isonyere anyị n’ife ya ofufe. (Ọma 95:6; Jems 4:8) Ka anyị nile rite uru n’ụzọ zuru ezu site ná ndokwa a magburu onwe ya e mere n’ụzọ ime mmụọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya